Ihe Ndị E Nwere Ike Ikwu Mgbe A Na-enyefe Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Disemba 1
“Ị̀ ma na ihe na-aka esiri nne ma ọ bụ nna naanị ya na-azụ ụmụ ike karịa di na nwunye gbakọrọ aka na-azụ ụmụ ha? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl gwara anyị ka anyị na-echebara ndị ihe na-esiri ike echiche. [Gụọ Abụ Ọma 41:1.] Isiokwu malitere na peeji nke 22 kọwara otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-echebara nne ma ọ bụ nna naanị ya na-azụ ụmụ echiche.”
Teta! Jenụwarị–Mach
“Ụfọdụ ndị weere na Chineke bụ ikike nkịtị. Ndị ọzọ weere na ọ bụ onye ihe na-emetụ n’obi. Gịnị ka i chere? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe Baịbụl kwuru ebe a. [Gụọ 1 Pita 5:6, 7.] N’isiokwu malitere na peeji nke 19, Baịbụl zara ajụjụ bụ́ Chineke ọ̀ bụ ikike nkịtị?”
Ụlọ Nche Jenụwarị 1
“Ọtụtụ ndị kweere na ihe a kọrọ na Baịbụl banyere ogige Iden bụ akụkọ ifo. Ọ̀ ga-eju gị anya ma ị nụ na Jizọs kwuru ihe gosiri na Adam na Iv bụ ndị dịrị ndụ n’ụwa a? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Matiu 19:4-6.] Magazin a zara ajụjụ ụfọdụ a na-ajụkarị banyere ogige Iden.”
Teta! Jenụwarị–Mach
“Ebe ọ bụ na Baịbụl ekwughị ụbọchị a mụrụ Jizọs, ì chetụla ihe mere ndị mmadụ ji agba Krismas na Disemba 25? [Chere ka ọ zaa.] Ebe a m chọrọ ịgụrụ gị na Baịbụl gosiri na a mụghị Jizọs n’oge oyi. [Gụọ Luk 2:8.] Magazin a kọrọ otú ihe ụfọdụ a na-eme n’oge Krismas si bido.”