Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-agba Àmà n’Okporo Ámá
1. Olee otu n’ime ụzọ anyị ga-esi eme ka Jizọs?
1 Mgbe Jizọs na-ekwusa ozi ọma n’ụwa, o ziri ndị mmadụ ozi ọma ma n’okporo ụzọ ma n’ebe ndị ọzọ. (Luk 9:57-61; Jọn 4:7) Ọ chọrọ ka ọtụtụ ndị mmadụ nụ ozi ahụ dị ezigbo mkpa. Taa, izi ndị mmadụ ozi ọma n’okporo ámá bụ otu n’ime ụzọ ndị e si eme ka ndị mmadụ mara Chineke. (Ilu 1:20) Ọ bụrụ na anyị ana-agakwuru ndị anyị hụrụ n’okporo ámá ma dịrị akọ, anyị ga-enweta ndị anyị ga-ezi ozi ọma.
2. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị na-agba àmà okporo ámá?
2 Gakwuru Ha: Ọ na-aka mma ịgakwuru ndị anyị hụrụ n’okporo ámá kama iguzo otu ebe ma ọ bụkwanụ nọdụ ala na-eche ka ndị na-agafe jiri ụkwụ ha bịakwute anyị. Ị gakwuru mmadụ, mụmụọrọ ya ọnụ ọchị, lewe ya anya n’ihu ma medaa obi ala gwa ya okwu ka enyi gị. Ọ bụrụ na gị na onye nkwusa ọzọ so, ọ ka mma ka unu abụọ ghara ịgakwuru otu onye. Ọ dịkwa mkpa ka ị gbaa mbọ ka gị na onye gosiri mmasị n’ụbọchị ahụ hụ ọzọ. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, gị na mmadụ kparịtachaa ụka, medaa obi ala jụọ ya ebe o bi ka gị na ya nwee ike ịhụ ọzọ. Ụfọdụ ndị nkwusa na-agbakarị àmà n’otu okporo ámá, ka ha nwee ike hụ ndị ha ziburu ozi ọma ma kọwakwuoro ha ihe ndị dị na Baịbụl.
3. Mgbe anyị na-agba àmà n’okporo ámá, olee otú anyị ga-esi egosi na anyị dị akọ?
3 Dịrị Akọ: Kpebie ebe kwesịrị ekwesị ị ga-anọ, marakwa ụdị onye i kwesịrị ịgakwuru. Ọ bụghị onye ọ bụla na-agafe ka ị ga-agakwuru. Na-eleru anya ala. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ dị onye ahụ ngwa ngwa, i nwere ike ịhapụ ya ka ọ gawara onwe ya. Ọ bụrụ n’ihu ebe dị ka ebe mmadụ na-ere ihe, kpachara anya ka ị ghara ịnọchiri onye ahụ ihu ahịa ya ka iwe ghara iwe ya. Ọ na-akachadị mma ịgakwuru onye zụcharala ihe na-apụta kama ịgakwuru ya mgbe ọ na-abanye ịga zụrụ ihe. Agakwurukwala ya otú ga-eme ka ụjọ bịa ya. Leruo anya ala chọpụta onye i kwesịrị inye akwụkwọ anyị. Ọ bụrụ na mmadụ egosichaghị mmasị, i nwere ike nye ya traktị kama inye ya magazin.
4. Gịnị mere ịgba àmà okporo ámá ji aba uru ma na-atọ ụtọ?
4 Ịgba àmà okporo ámá na-enyere anyị aka ime ka ndị mmadụ nụ eziokwu dị na Baịbụl ngwa ngwa. (Ekli. 11:6) Anyị nwedịrị ike ịhụ ndị anyị na-enwetaghị n’ụlọ mgbe anyị gara ozi ọma n’ụlọ ha. Ọ́ gaghị adị mma ma ị gbaa mbọ wepụta oge na-agba àmà okporo ámá? I mee otú ahụ, ị ga-enweta ndị ị ga-ezi ozi ọma, obi ga-adịkwa gị ụtọ.