“Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa . . . ”
Ná Nzukọ Ije Ozi, anyị na-atụle otú anyị nwere ike isi nye ndị mmadụ magazin anyị n’ọnwa ọ bụla. Ihe mere e ji eme ya abụghị ka anyị tụlee ihe magazin ndị ahụ na-ekwu. Kama, ọ bụ ka anyị mara otú anyị nwere ike isi nye ha ndị mmadụ. N’ihi ya, nwanna e nyere ihe omume a kwesịrị ime ihe e kwuru n’Ozi Alaeze Anyị. Ihe ọ ga-ekwu ná mmalite ihe omume a ekwesịghị ịdị ogologo. O kwesịrị ikwu ihe ga-eme ka ihe dị na magazin ndị ahụ masị ụmụnna. Ya kwuchaa, ya ahọrọ otu isiokwu gwa ụmụnna ka ha kwuo otú e nwere ike isi jiri ya nye ndị mmadụ magazin anyị. Nke a ga-eme ka ha mara otú ha ga-esi enye ndị mmadụ magazin ahụ. O kwesịrị ibu ụzọ jụọ ụmụnna ajụjụ ha ga-achọ ịjụ onye ha gara na nke ya. Ha kwuchaa, ya ajụzie ha amaokwu Baịbụl ha ga-achọ ịgụrụ ya. Otu onye ekwesịghị ikwu ihe niile ọ ga-ekwu ma ọ chọọ inye mmadụ magazin. Nke a ga-eme ka ọtụtụ ndị tinye ọnụ. Ụmụnna kwuchaa ebe a ga-agụ na Baịbụl, e mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye ndị mmadụ magazin nke ọ bụla. Anyị kwesịrị ịgụ magazin ndị ahụ tupu anyị abịawa ọmụmụ ihe, anyị kwesịkwara ịgbalị tinye ọnụ mgbe a na-eme ihe omume a. Ọ bụrụ na anyị niile akwadebe ihe omume a, ọ ga-eme ka anyị mụta ihe n’aka ụmụnna anyị, ha amụtakwa n’aka anyị.—Ilu 27:17.