Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Mee
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “O nweghị onye n’ime anyị na-anaghị emehie ihe. Ma, ì chere na Chineke nwere ike ịgbaghara anyị mmehie anyị?” [Chere ka ọ zaa.] Nye ya Ụlọ Nche Mee 1, gosikwa ya isiokwu dị na peeji nke 15. Gị na ya tụlee ajụjụ nke mbụ. Gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Baịbụl e dere n’ebe ahụ. Nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ọzọ ị ga-abịa ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Mee 1
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “O nwere otu ebe m chọrọ ịgụrụ gị na Baịbụl. M ga-achọkwa ịma ihe i chere gbasara amaokwu Baịbụl ahụ. [Gụọ 1 Jọn 4:8. Ị gụchaa, gị ekwuo, sị:] Ọtụtụ ndị kwetara na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ma, ndị ọzọ na-ekwu na obi tara Chineke mmiri n’ihi otú o si gba nkịtị ọdachi ana-eme. Gịnị ka gịnwa chere? [Chere ka ọ zaa. Ya kwuchaa, gị asị:] Ụlọ Nche a kwuru ihe ndị mere na anyị ekwesịghị iche na obi tara Chineke mmiri.”
Teta! Mee–Jun
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị ekwuo, sị: “Ọtụtụ ndị di na nwunye na-agwa ibe ha okwu ọjọọ. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe na-akpata ya bụ omenala, otú e si zụọ mmadụ, na ihe ndị a na-eme na fim. Olee ihe gịnwa chere na-akpata ya? [Chere ka ọ zaa.] Baịbul kwuru otú di na nwunye kwesịrị isi na-emeso ibe ha. [Gụọ Ndị Efesọs 5:33.] Teta! a kwuru otú di na nwunye ụfọdụ si mee ihe a Baịbụl kwuru, ya enyere ha aka ịkwụsị ịna-agwa ibe ha okwu ọjọọ.”