Gịnị Mere Anyị Ji Ekwusa Ozi Ọma?
1. Gịnị mere anyị ji ekwusa ozi ọma?
1 O nweghị ọrụ a ga-eji tụnyere izi ndị mmadụ ozi oma Alaeze Chineke. Mgbe ọ bụla anyị ziri mmadụ ozi ọma, anyị na-egosi na anyị hụrụ ma Chineke ma ndị agbata obi anyị n’anya. Ị manụ na o nweghị iwu ka ịhụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya. (Mak 12:29-31) Ọ bụ ịhụnanya mere anyị na-eji aga ezi ndị mmadụ ozi ọma.—1 Jọn 5:3.
2. Olee otú ozi ọma anyị na-ezi ndị mmadụ si egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya?
2 Anyị Hụrụ Jehova n’Anya: Jehova bụ ezigbo Enyi anyị. Ọ bụ ya mere anyị ji aga agwa ndị mmadụ gbasara ya. Setan na-ekwutọ ya kemgbe ihe dị ka puku afọ isii. (2 Kọr. 4:3, 4) Nke a emeela ka ndị mmadụ na-ekwu na Chineke na-ata ndị mmehie ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. Ndị ọzọ na-ekwukwa na ọ bụ atọ n’ime otu nakwa na ahụhụ anyị na-ata anaghị emetụ ya n’obi. Ọtụtụ ndị ọzọ ekweghịdị na Chineke dị. Ọ bụ ihe ndị a mere anyị ji ezi ndị mmadụ ozi ọma ka ha mara nke bụ́ eziokwu gbasara Nna anyị nke eluigwe. Obi na-adị Chineke ụtọ mgbe ọ bụla anyị na-akọrọ ndị ọzọ gbasara ya. Ma, obi anaghị adị Setan mma.—Ilu 27:11; Hib. 13:15, 16.
3. Olee otú ozi ọma anyị na-ezi ndị mmadụ si egosi na anyị hụrụ ha n’anya?
3 Anyị Hụrụ Ndị Agbata Obi Anyị n’Anya: Mgbe ọ bụla anyị ziri mmadụ ozi ọma, anyị na-egosi na anyị hụrụ onye ahụ n’anya. Anyị kwesịrị izi ndị mmadụ ozi ọma n’ihi na oge a anyị bi na ya dị oké egwu. Ọtụtụ n’ime ndị anyị na-ezi ozi ọma ‘amaghị ma ọlị ihe dị iche n’aka nri ha na aka ekpe ha’ otú ahụ ndị Ninive na-amaghị n’oge ochie. (Jona 4:11) Ozi ọma anyị na-ezi ndị mmadụ na-enyere ha aka ịna-eme ihe dị mma. Ọ na-enyekwara ha aka inwe obi ụtọ. (Aịza. 48:17-19) Ọ na-eme ka ha nwee nchekwube na ihe ga-adị mma. (Rom 15:4) Ọ bụrụ na ha egee ntị n’ozi ọma, meekwa ihe anyị na-akụziri ha, “a ga-azọpụta” ha.—Rom 10:13, 14.
4. Olee ihe Jehova na-agaghị echefu echefu?
4 Ezigbo ụmụaka anaghị echere ruo mgbe ha kara aka tupu ha egosi na ha hụrụ papa ha na mama ha n’anya. Ha na-egosi na ha hụrụ ha n’anya mgbe niile. Ọ bụ otú ahụ ka anyị kwesịrị isi ahụ Chineke n’anya. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya, anyị agaghị echere ruo mgbe anyị zukọrọ ịga ozi ọma tupu anyị ezie ndị mmadụ ozi ọma. Anyị ga na-ekwusa ozi ọma n’akwụsịghị akwụsị. (Ọrụ 5:42) Anyị si otú a hụ Jehova n’anya, ọ gaghị echefu ya.—Hib. 6:10.