Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Joel Onye Amụma
1. Olee otú anyị ga-esi dị umeala n’obi ka Joel mgbe anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma?
1 Ònye bụ Joel onye amụma? Naanị ihe o kwuru gbasara onwe ya bụ na ya bụ “nwa Petuel.” (Joel 1:1) Joel dị obi umeala. Mgbe ọ na-ebu amụma, ihe bụ mkpa ya bụ ime ka ndị mmadụ mara ihe Jehova gwara ha, ọ bụghị gbasara onwe ya. Anyị kwesịrị ịna-eme ka Joel. Anyị ekwesịghị ịna-eme ka ndị mmadụ na-eto anyị maka ozi ọma anyị na-ezi, kama anyị kwesịrị iji ozi ọma anyị na-eto Jehova. Ihe ọ bụla anyị na-agwa ndị mmadụ n’ozi ọma kwesịkwara isi na Baịbụl. (1 Kọr. 9:16; 2 Kọr. 3:5) Ihe ọzọ bụ na ozi ọma anyị na-ekwusa na-eme ka okwukwe anyị sie ike. Olee ihe Joel kwuru n’amụma ya nke nwere ike ime ka anyị nwee olileanya ma jiri ịnụ okụ n’obi na-ekwusa ozi ọma?
2. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme ebe ọ bụ na ụbọchị Jehova adịla nso?
2 “Ụbọchị Jehova Dị Nso” (Joel 1:15): O ruola ọtụtụ puku afọ Joel dere ihe a. Amụma a mezuru n’oge ochie, ọ na-emezukwa n’oge anyị a. Otú ihe si na-aka njọ n’ụwa a na-egosi na ọgwụgwụ ụwa Setan adịla nso. Ihe ọzọ na-egosi na ọ gaghị adị anya Jehova ebibie ụwa Setan bụ otú ndị mmadụ si ajụ ozi ọma anyị ma na-ewere anyị ka ndị iberiibe. (2 Tim. 3:1-5; 2 Pita 3:3, 4) Ebe ọ bụ na ọgwụgwụ ụwa a adịla ezigbo nso, anyị ekwesịghị iji ikwusa ozi ọma na-egwuri egwu.—2 Pita 3:11, 12.
3. Olee ihe mere ozi ọma anyị na-ezi ndị mmadụ ji dị mkpa ugbu a oké mkpagbu ahụ dịrịla nso?
3 “Jehova Ga-abụrụ Ndị Ya Ebe Mgbaba” (Joel 3:16): Ọ bụ mgbe Jehova ga-eji agha Amagedọn bibie ụwa Setan ka Joel buru n’amụma mgbe o kwuru na eluigwe na ụwa ga-eme mkpatụ. Ma, obi siri anyị ike n’ihi na anyị ma na Jehova ga-echebe ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ahụ. (Mkpu. 7:9, 14) Ka anyị na-ekwusa ozi ọma ma na-ahụ otú Jehova si akwado anyị, anyị na-abịa nwee okwukwe na obi ike nke ga-enyere anyị aka n’oge oké mkpagbu ahụ.
4. Gịnị mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ ma nwee nchekwube na Jehova ga-echebe anyị mgbe ọ ga-ebibi ụwa Setan?
4 Ndị ụfọdụ na-ekwu na ihe juru n’amụma Joel bụ naanị otú Jehova ga-esi bibie ndị mmadụ. Ma, ọ bụghị eziokwu, n’ihi na Joel kwukwara na a ga-azọpụta ndị na-erubere Chineke isi. (Joel 2:32) N’ihi ya, ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ma nwee nchekwube na ọkọ agaghị akọ anyị mgbe Jehova ga-ebibi ụwa Setan. Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, anyị na-eme ihe e kwuru na Joel 2:23. Ebe ahụ kwuru, sị: “Ṅụrịanụ ọṅụ n’ime Jehova bụ́ Chineke unu.”