Vidio Anyị Ga Na-egosi Ndị Mmadụ
E nwere vidio ọhụrụ e tinyere na jw.org/ig. Aha ya bụ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? Ile vidio a na-ewe naanị nkeji anọ, ọtụtụ ndị na-elekwa ya. Ihe mere e ji mee vidio a bụ ka o mee ka ndị mmadụ nwee mmasị ka a mụwara ha Baịbụl. Ị gaa n’Isimbido n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, pịa ebe e dere “Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl,” ị ga-ahụ ya. E nwere ihe e sere n’ala ala aka nri n’azụ traktị ndị ahụ e wepụtara ọhụrụ. A na-akpọ ya QR (quick response) code. O nwekwara ike ibuga gị ebe ị ga-ele vidio a. Ka anyị kwuo ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi na-egosi ya ndị mmadụ.
Ị gaa nletaghachi, gwa onye ahụ sị, “Ka m gosi gị obere vidio ga-enyere gị aka ịmata ebe ị ga-ahụ azịza ajụjụ ndị i nwere gbasara Baịbụl?” Ya kweta, were ekwentị gị ma ọ bụ kọmputa ya gosi ya vidio ahụ.
I nye mmadụ otu n’ime traktị ndị ọhụrụ ahụ, gosi ya ihe ahụ dị n’ala ala aka nri n’azụ traktị ahụ, gwakwa ya na ọ ga-ebuga ya n’adres Ịntanet anyị. I nwekwara ike iji ekwentị gị gosi ya onye ahụ ozugbo.
Gwa ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ, ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị ikwu gị nakwa ndị enyi gị gbasara vidio a. Gosi ha ya. I nwekwara ike izigara ha ozi n’iimel, gwa ha ka ha lee ya.
Ọ bụrụ na anyị na-egosi ndị mmadụ vidio a, o nwere ike ime ka anyị malite ịmụrụ ọtụtụ ndị Baịbụl si otú ahụ nyere ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” aka ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi.—Ọrụ 13:48.