Ịkwado Akwado Ga-enyere Anyị Aka Ịna-akụzi Ihe Nke Ọma
Mmadụ abụọ jụrụ Jizọs ajụjụ n’oge dị iche iche gbasara ndụ ebighị ebi. Ihe ọ zara onye nke mbụ abụghị ihe ọ zara onye nke abụọ n’agbanyeghị na ha jụrụ ya otu ihe. (Luk 10:25-28; 18:18-20) Ihe anyị na-amụta n’akụkọ a bụ na ọ bụrụgodị na ihe anyị na mmadụ ga-amụ doro anyị ezigbo anya, anyị kwesịrị ịkwado ya otú ọ ga-enyere onye ahụ aka. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Gịnị nwere ike isiri ya ike nghọta ma ọ bụ siere ya ike ikweta? Olee amaokwu nke m ga-agụrụ ya n’ime amaokwu ndị dị n’ebe anyị ga-amụ? Paragraf ole ka isi ya ga-ebuteli?’ Anyị nwekwara ike ịkwadebe ihe atụ, ajụjụ ndị anyị ga-ajụ onye ahụ, nakwa otú anyị ga-esi kọwaara ya ihe anyị na ya ga-amụ ka o dokwuo ya anya. Ebe ọ bụ Jehova na-eme ka mkpụrụ nke eziokwu a kụrụ n’obi mmadụ too, anyị kwesịrị ịrịọ ya ka o nyere anyị aka mgbe anyị na-akwado ihe anyị na mmadụ ga-amụ. Anyị kwesịkwara itinye onye ahụ n’ekpere.—1 Kọr. 3:6; Jems 1:5.