AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | AỊZAYA 6-10
Mesaya Mezuru Amụma
Nke E Biri Ebi
Ọtụtụ afọ tupu a mụọ jizọs, Aịzaya kwuru na Mesaya ahụ ga-ekwusa ozi ọma “n’ógbè Jọdan, Galili nke ndị mba ọzọ.” Jizọs mezuru amụma ahụ mgbe ọ gazuru Galili dum, na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ ihe.—Aịza. 9:1, 2.
Ọ rụrụ ọrụ ebube mbụ ya—Jọn 2:1-11 (na Kena)
Ọ họpụtara ndịozi ya—Mak 3:13, 14 (n’ebe dị nso na Kapaniọm)
O ziri Ozizi Elu Ugwu ahụ—Mat. 5:1–7:27 (n’ebe dị nso na Kapaniọm)
Ọ kpọliteere otu nwaanyị di ya nwụrụ otu nwa nwoke ọ mụtara—Luk 7:11-17 (na Nen)
Ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị ndị na-eso ụzọ ise mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ—1 Kọr. 15:6 (na Galili)