Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp20 nke 3 p. 11
  • Ngọzi Ndị Na-erubere Chineke Isi Ga-enweta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ngọzi Ndị Na-erubere Chineke Isi Ga-enweta
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • 1. IRUBERE CHINEKE ISI GA-EME KA ANYỊ MARA IHE
  • 2. IRUBERE CHINEKE ISI GA-EME KA ANYỊ NA-ENWE OBI ỤTỌ
  • “Nke a Bụ Ihe Ịhụ Chineke n’Anya Pụtara”
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Ị̀ ‘Na-eji Obi Gị Niile Erube Isi’?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Gịnị Ka Jehova Chọrọ Anyị n’Aka?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Ànọ M n’Ọnọdụ Chineke?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
wp20 nke 3 p. 11
Ebe otu ezinụlọ nọ n’ụlọ ha, obi ana-atọ ha ụtọ. Mama ha na otu nwa ha nwaanyị na-esi nri. Papa ha na nwa ha nwaanyị nke ọzọ nọ na-ele foto na palọ.

Ihe ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ bụ ịna-erubere iwu Chineke isi

Ngọzi Ndị Na-erubere Chineke Isi Ga-enweta

Mozis onye amụma kwuru na Chineke ga-agọzi anyị ma anyị na-erubere iwu ya isi. (Diuterọnọmi 10:13; 11:27) Ihe mere anyị ji na-erubere Chineke isi abụghị ka ọ ghara ịta anyị ahụhụ. Àgwà Chineke ndị magburu onwe ha na-eme ka anyị na-erubere ya isi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, chọọkwa izere ime ihe nwere ike ikpasu ya iwe. “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu.”​—1 Jọn 5:3.

Ma olee otú ịna-erubere Chineke isi ga-esi eme ka ọ gọzie anyị? Ka anyị tụlee ụzọ abụọ.

1. IRUBERE CHINEKE ISI GA-EME KA ANYỊ MARA IHE

“Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, . . . na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso.”​—AỊZAYA 48:17.

Jehova Chineke, Onye kere anyị, maara anyị nke ọma ma na-enye anyị nduzi dị anyị mkpa. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe ndị ọ na-akụziri anyị na-enyere anyị aka ịna-eme ezigbo mkpebi, anyị ga-amụta ihe ndị Chineke chọrọ ka anyị na-eme n’Akwụkwọ Nsọ ma na-eme ha eme.

2. IRUBERE CHINEKE ISI GA-EME KA ANYỊ NA-ENWE OBI ỤTỌ

“Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya.”​—LUK 11:28.

Taa, ọtụtụ nde mmadụ ndị na-eme ihe Okwu Chineke kwuru na-enwe ezigbo obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, tụlee gbasara otu nwoke bi na Spen. Nwoke a na-ewe iwe ọkụ ma na-emesi nwunye ya na ndị ọzọ ike. Otu ụbọchị, ọ gụrụ ihe Mozis onye amụma dere gbasara otú nwa Jekọb aha ya bụ Josef si dịrị nwayọọ n’obi. E rere Josef ka ọ gaa gbawa ohu. A tụkwara ya mkpọrọ na-enweghị ihe o mere. N’agbanyeghị ihe ndị a e mere Josef, ọ nọgidere na-adị nwayọọ n’obi, na-eme udo ma na-agbaghara ndị ọzọ ihe ndị ha mere ya. (Jenesis isi 37 ruo 45) Nwoke ahụ bi na Spen kwuru, sị: “Ichebara ihe Josef mere echiche nyeere m aka ịdị nwayọọ n’obi, ịdị obiọma ma na-ejide onwe m. Nke a emeela ka m na-enwe obi ụtọ ugbu a.”

Akwụkwọ Nsọ kụziiri anyị otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ ihe. Gụọ gbasara ya n’isiokwu na-esonụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya