Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp20 nke 3 p. 14-15
  • Onye Kere Anyị Ga-agọzi Gị Ruo Mgbe Ebighị Ebi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye Kere Anyị Ga-agọzi Gị Ruo Mgbe Ebighị Ebi
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọrụ Ebube Jizọs—Gịnị Ka Ị Pụrụ Ịmụta?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Gịnị Ka Anyị Nwere Ike Ịmụta n’Ọrụ Ebube Ndị Jizọs Rụrụ?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Ọ Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ọrụ Ebube—Ihe Ndị Mere Eme Ka Hà Bụ Akụkọ Ifo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
wp20 nke 3 p. 14-15
Ebe ndị si ebe dị iche iche na-ekpori ndụ na paradaịs e nwere n’ụwa.

“Ala ga-emepụta ihe nke ọma; Chineke bụ́ Chineke anyị ga-agọzi anyị.”​—Abụ Ọma 67:6

Onye Kere Anyị Ga-agọzi Gị Ruo Mgbe Ebighị Ebi

Chineke kwere Ebreham onye amụma nkwa na otu n’ime ụmụ ya ga-agọzi “mba niile nke ụwa.” (Jenesis 22:18) Ònye ka nwa ahụ ga-abụ?

Ihe fọrọ obere ka o ruo puku afọ abụọ gara aga, Chineke nyere Jizọs, bụ́ nwa Ebreham ike o ji rụọ ọrụ ebube dị iche iche. Ọrụ ebube ndị ahụ gosiri na Chineke ga-esi n’aka Jizọs gọzie mba niile ma si otú ahụ mezuo nkwa ahụ o kwere Ebreham.​—Ndị Galeshia 3:14.

Ọrụ ebube ndị ahụ Jizọs rụrụ nyeere ndị mmadụ aka ịmata na ọ bụ ya bụ onye Chineke ga-esi n’aka ya gọzie ụmụ mmadụ. Ha gosikwara otú Chineke ga-esi jiri ya gọzie ụmụ mmadụ ruo mgbe ebighị ebi. Legodị otú ọrụ ebube ndị ahụ Jizọs rụrụ si mee ka anyị mata ụfọdụ àgwà ndị magburu onwe ha o nwere.

Obiọma​—Jizọs gwọrọ ndị ọrịa.

E nwere mgbe otu onye ekpenta rịọrọ Jizọs ka ọ gwọọ ya. Jizọs bitụrụ ya aka ma gwa ya, sị: “Achọrọ m.” Ekpenta ahụ pụrụ n’ahụ́ ya ozugbo.​—Mak 1:​40-42.

Mmesapụ aka​—Jizọs nyere ndị agụụ ji nri.

Jizọs achọghị ka agụụ na-anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ. O nyere ọtụtụ puku mmadụ nri ihe karịrị otu ugboro. Otú o si mee ya bụ na o mere ka achịcha ole na ole na azụ̀ ole na ole dị ọtụtụ. (Matiu 14:​17-21; 15:​32-38) Ha niile richara nri ahụ rijuo afọ. Ha rifọkwara nri buru ibu.

Ọmịiko​—Jizọs kpọlitere ndị nwụrụ anwụ.

Jizọs kpọlitere otu mkpụrụ nwa nwoke nke otu nwaanyị di ya nwụrụ na-eru uju n’ihi na “o nwere ọmịiko.” Nwaanyị a enweghị onye ọzọ ga-elekọta ya.​—Luk 7:​12-15.

NGỌZI NDỊ A GA-ENWE N’ỤWA RUO MGBE EBIGHỊ EBI

Jizọs egosila na Chineke nwere ike ọ ga-eji agọzi ụmụ mmadụ. N’oge na-adịghị anya, mgbe Jizọs ga-alọghachi otú o kwuru, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-eji ya rụọdị ọtụtụ ọrụ ebube n’ụwa niile.

Olee otú ihe ga-adị n’ụwa mgbe Chineke ga-emezu nkwa ahụ o kwere Ebreham? Ndị hụrụ Chineke n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù “ga-enweta ụwa.” Ha ga-enwekwa “obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” (Abụ Ọma 37:11) “Ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”​—Mkpughe 21:4.

Obi ga-atọgbu anyị atọgbu ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi mgbe udo ga-adị n’ụwa. Anyị na-agba gị ume ka ị gaa na www.jw.org mụtakwuo gbasara ngọzi ndị ahụ ọchịchị Chineke ga-eweta n’oge na-adịghị anya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya