AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | OBEDAYA 1–JONA 4
Mụta Ihe n’Ihe Ndị I Mejọrọ
Akụkọ Jona gosiri na Jehova anaghị ajụ anyị kpamkpam ma anyị mejọọ ya. Kama, ọ na-achọ ka anyị si n’ihe anyị mejọrọ mụta ihe ga-eme ka anyị ghara ime ihe ahụ ọzọ.
Olee ihe na-adịghị mma Jona mere mgbe Jehova dunyere ya ozi?
Gịnị ka Jona rịọrọ Jehova, oleekwa ihe Jehova mere?
Olee otú Jona si gosi na ọ mụtara ihe n’ihe o mejọrọ?