OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ịhụnanya Ka E Ji Amata Ezigbo Ndị Kraịst—Soro Eziokwu Ṅụrịa Ọṅụ
IHE MERE O JI DỊ MKPA: Iji ṅomie Jizọs, iwu ji anyị ịgbara eziokwu gbasara nzube Chineke àmà. (Jọn 18:37) Anyị ga na-eso eziokwu ahụ na-aṅụrị ọṅụ, na-ekwu eziokwu, na-echebakwara ihe ọ bụla bụ́ eziokwu echiche, n’agbanyeghị na ụwa anyị bi n’ime ya jupụtara n’ajọ omume na ụgha.—1 Kọr. 13:6; Fil. 4:8.
OTÚ Ị GA-ESI EME YA:
Kpebisie ike na ị gaghị na-ege ma ọ bụ na-agba asịrị.—1 Tesa. 4:11
Aṅụrịla ọṅụ n’ihe ọjọọ mere nwanna gị
Ka ihe ọma na ihe ndị na-agba ume na-eme gị obi ụtọ
LEENỤ VIDIO BỤ́ ‘NWEENỤ ỊHỤNANYA N’ETITI ONWE UNU’—AṄỤRỊLA ỌṄỤ N’IHI AJỌ OMUME, SORO EZIOKWU ṄỤRỊA ỌṄỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:
Olee ihe gosiri na Debbie ‘ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ajọ omume’?
Olee otú Alice si mee ka ya na Debbie kwuwe gbasara ihe bara uru?
Olee ihe ọma ụfọdụ anyị na ndị ọzọ nwere ike ikwurịta banyere ya?
Na-eso eziokwu aṅụrị ọṅụ, ọ bụghị ajọ omume