AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌRỤ NDỊOZI 21-22
“Ka Uche Jehova Mee”
Pọl kwetara na ọ bụ mmụọ nsọ chọrọ ka ọ gaa Jeruselem, ebe agbụ na mkpagbu na-echere ya. (Ọrụ 20:22, 23) Ma, mgbe ụfọdụ Ndị Kraịst bu ezigbo ihe n’obi rịọrọ ya ka ọ ghara ịga, ọ gwara ha, sị: “Gịnị ka unu na-eme site n’ịkwa ákwá na ime ka obi ghara isi m ike?” (Ọrụ 21:13) Anyị achọtụdịghị ịkụda ndị ọzọ mmụọ ka ha ghara iwepụta onwe ha jeere Jehova ozi otú ha chọrọ.