Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb19 Eprel p. 8
  • Gbalịa Nweta Ọzụzụ Si n’Aka Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gbalịa Nweta Ọzụzụ Si n’Aka Jehova
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú E Si Azụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Olee Otú E Si Azụ Ndịàmà Jehova Maka Ozi Ọma Ha Na-ekwusa?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Ị̀ Dị Njikere Itinye Akwụkwọ Ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Tinye Akwụkwọ Ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
mwb19 Eprel p. 8

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Gbalịa Nweta Ọzụzụ Si n’Aka Jehova

IHE MERE O JI DỊ MKPA: Jehova bụ Onye Ozizi Ukwu anyị. Ihe ọ na-akụziri anyị enweghị atụ. Ọ na-akụziri anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ibi ezigbo ndụ ugbu a nakwa n’ọdịnihu. Ọ naghịkwa atụ anya ka anyị kwụọ ya ụgwọ maka ha. (Aịza. 11:​6-9; 30:​20, 21; Mkpu. 22:17) Ihe ndị a Jehova na-akụziri anyị na-emekwa ka anyị ruo eruo ịkụziri ndị ọzọ ihe ndị ga-azọ ha ndụ.​—2 Kọr. 3:5.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Mụta ịna-adị umeala n’obi.​—Ọma 25:​8, 9

  • Nabata ihe ndị Jehova na-akụziri anyị ugbu a, dị ka, ihe ndị a na-akụziri anyị n’ihe omume nwa akwụkwọ a na-eme n’ọmụmụ ihe etiti izu anyị

  • Kpebie ihe ndị ị ga-eme n’ofufe Jehova nakwa otú ị ga-esi emezu ha.​—Fil. 3:13

  • Gbalịa hapụ ihe ụfọdụ ka i nwee ike iru eru ka a zụkwuo gị n’ọgbakọ Jehova.​—Fil. 3:8

LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE JEHOVA KỤZIIRI NDỊ GARA ỤLỌ AKWỤKWỌ NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA ABAARALA HA ỌTỤTỤ URU, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee nsogbu ndị nkwusa ụfọdụ meriri iji nwee ike ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze?

  • Olee ihe a na-akụziri ndị na-aga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze?

  • Olee otú ndị nọ n’ọgbakọ e zigara ndị gara ụlọ akwụkwọ a si nyere ha aka mgbe ha rutere ebe ahụ ọhụrụ?

  • Gịnị ka a chọrọ n’aka ndị chọrọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze? (kr 189)

  • Olee ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ i nwere ike ịchọ ịga ná nzukọ Jehova?

Ebe ndị gara Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze nọ na-eje ozi na Namibia, Nọọwee, Amerịka na Japan

Olee uru ndị ị ga-erite ma ị gbalịa gaa otu n’ime ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ a?

ỌZỤZỤ NDỊ M NWETARALA NÁ NZUKỌ JEHOVA

  • Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ

  • Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ

  • Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze

  • Ụlọ Akwụkwọ Ndị Okenye Ọgbakọ

  • Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze

OLEE ỤLỌ AKWỤKWỌ NDỊ M GA-ACHỌ ỊGA NÁ NZUKỌ JEHOVA?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya