AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ KỌRỊNT 7-10
Ịgbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka So n’Ozi Anyị
Ndị Kraịst nwere ụdị ozi abụọ ha na-eje. Otu bụ “ozi nke ime ka a dị ná mma,” ya bụ, ikwusa ozi ọma na ịkụzi ihe. Nke abụọ bụ ozi anyị na-ejere ụmụnna anyị, ya bụ, ịgbatara ha ọsọ enyemaka. (2 Kọr. 5:18-20; 8:4) N’ihi ya, inyere ụmụnna anyị nọ ná mkpa aka so n’ozi dị nsọ anyị na-ejere Jehova. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ya, anyị
na-egboro ụmụnna anyị mkpa ha.—2 Kọr. 9:12a
na-enyere ụmụnna anyị ndị nọ ná nsogbu aka ịmaliteghachi ịga ọmụmụ ihe, ịmụ ihe, na iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Ihe ndị a bụ ụzọ ha ga-esi asị Jehova: “I meela.”—2 Kọr. 9:12b
na-enye Chineke otuto. (2 Kọr. 9:13) Ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ụmụnna anyị na-agbara ndị mmadụ àmà, ma ndị na-enweghị mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ