OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Malite Ọrụ Ọsụ Ụzọ Oge Niile Iji Too Jehova
Ụmụ Izrel nwere ezigbo ihe mere ha ga-eji too Jehova. Ọ kpọpụtara ha n’ala Ijipt, napụtakwa ha n’aka ndị agha Fero. (Ọpụ. 15:1, 2) Jehova akwụsịbeghị imere ndị ya ihe ọma. Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jehova na-emere anyị?—Ọma 116:12.
Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ nke oge niile. Rịọ Jehova ka o mee ka ọ gụwa gị agụụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ, nakwa ka o nye gị ike ị ga-eji arụ ya. (Fil. 2:13) Ụfọdụ na-eji ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka bido. I nwere ike ịhọrọ inye awa iri atọ ma ọ bụ awa iri ise n’ọnwa Mach na Eprel, nakwa n’oge onye nlekọta sekit na-eleta ọgbakọ unu. Ị rụtụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, o nweziri ike isi otú ahụ gụwa gị agụụ ịbụ ọsụ ụzọ oge niile n’ihi na ọ na-abụ ụra tọwa ụtọ, e kwowe ya ekwowe. E nwedịrị ndị ahụ́ na-esichaghị ike, na ndị na-arụ ọrụ ọtụtụ ụbọchị n’izu, mana ha bụkwa ndị ọsụ ụzọ oge niile. (mwb16.07 8) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova ruru eru ka anyị meere ya ihe ọ bụla anyị nwere ike imere ya iji too ya.—1 Ihe 16:25.
LEENỤ VIDIO BỤ́ ỤMỤNNE NWAANYỊ ATỌ BÍ NA MONGOLIA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee nsogbu ndị ụmụnne atọ ahụ meriri iji bụrụ ndị ọsụ ụzọ oge niile?
Olee ngọzi ndị ha nwetarala?
Olee ohere ndị ọzọ ha nwetara iji jeere Jehova ozi n’ihi na ha bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile?
Olee otú ozi oge niile ha na-eje si baara mama ha uru?