Olee ebe ị nọ n’ụzọ na-eduga na baptizim?
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Kpebie Ijere Jehova Ozi
Ọ bụrụ na ị bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim ma ọ bụ onye a na-amụrụ Baịbụl, ị̀ chọrọ ime baptizim? Gịnị mere i kwesịrị iji mee baptizim? Mmadụ inyefe Jehova onwe ya, e meekwa ya baptizim ga-eme ka onye ahụ na Jehova dịrị ná mma n’ụzọ pụrụ iche. (Ọma 91:1) Ọ ga-emekwa ka a zọpụta anyị. (1 Pita 3:21) Olee ihe ị ga-eme ka i ruo eru ime baptizim?
Gbalịa chọpụta n’onwe gị na ihe a na-akụziri gị bụ eziokwu. E nwee ihe na-agbagwoju gị anya, gbalịa wepụta ezigbo oge mee nchọnchọ banyere ya. (Rom 12:2) Chọpụta ihe ndị i kwesịrị ịgbanwe ná ndụ gị, gbalịakwa mee mgbanwe ndị ahụ ebe ọ bụ na ị chọrọ ime ihe dị Jehova mma. (Ilu 27:11; Efe. 4:23, 24) Na-arịọ ya mgbe niile ka o nyere gị aka. Obi siekwa gị ike na Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya nyere gị aka ma kwadoo gị. (1 Pita 5:10, 11) Mbọ ọ bụla ị gbara ime ihe ndị a agaghị efu ọhịa. Ijere Jehova ozi bụ ihe kacha mma mmadụ nwere ike ime.—Ọma 16:11.
LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE MMADỤ GA NA-EME KA O NWEE IKE RUO ERU IME BAPTIZIM, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee nsogbu ndị ụfọdụ meriri iji nwee ike ime baptizim?
Gịnị ga-enyere gị aka inwe ụdị okwukwe ga-eme ka i nyefee Jehova onwe gị?
Olee ihe nyeere ụfọdụ ndị aka ịgbalị ruo eru ime baptizim?
Olee ngọzi ndị kpebiri ijere Jehova ozi na-enweta?
Gịnị ka mmadụ inyefe Jehova onwe ya na ime baptizim pụtara?