Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb22 Mach p. 9
  • Ole Ndị Bụ Ndị Enyi Gị n’Ịntanet?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ole Ndị Bụ Ndị Enyi Gị n’Ịntanet?
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ Dị Njọ Imeta Ndị Enyi n’Ịntanet?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Gbaara Nsogbu Na-esi n’Ebe A Na-emeta Ndị Enyi n’Ịntanet Ọsọ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
  • Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Gbasara Ịkparịta Ụka n’Ịntanet?—Nkebi nke Abụọ
    Teta!—2012
  • Jiri Ihe Dị n’Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet Na-amụ Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
mwb22 Mach p. 9

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ole Ndị Bụ Ndị Enyi Gị n’Ịntanet?

Mmadụ na ibe ya na-abụ enyi ma ọ bụrụ na ihe ha na-amasị ibe ha, ha ana-akwanyekwara ibe ha ùgwù. Dị ka ihe atụ, mgbe Devid gbuchara Golayat, ya na Jonatan bịara bụrụ ezigbo enyi. (1 Sam. 18:1) Onye nke ọ bụla nwere àgwà ndị masịrị ibe ya mere ka ha bụrụ enyi. N’ihi ya, tupu mmadụ na ibe ya abụrụ ezigbo enyi, ha ga-amarịrị onwe ha nke ọma. Ịmatakwanụ mmadụ nke ọma adịghị mfe. Ma a bịa n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet, mmadụ nwere ike imeta onye ọzọ enyi naanị ma ọ pịa aka otu ebe n’Ịntanet. Ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịhazi ihe ha ga-ekwu nke ọma n’Ịntanet otú ọ ga-amasị ndị ọzọ. Ha na-ekwukwa ihe ndị ga-eme ka a na-ele ha anya ọma. Ihe ndị a na-eme ka ọ dịrị ha mfe izochi ụdị ndị ha bụ n’eziokwu. N’ihi ya, ọ dị mma ka mmadụ kpebie ụdị ndị ọ ga-emeta enyi n’Ịntanet. Onye ị na-amaghị zitere gị ozi ka gị na ya bụrụ enyi, ụjọ atụla gị ịsị ya mba ma ọ bụ ịgba ya nkịtị. A sịkwala na ị chọghị ime ihe ga-ewute ya. Ụfọdụ ndị ekpebiela na ha agaghị na-aga n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet n’ihi nsogbu ndị o nwere ike ịkpata. Ma, i kpebie ịga n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet, olee ihe ndị i kwesịrị iburu n’uche?

LEENỤ VIDIO BỤ́ KPACHARA ANYA N’EBE A NA-EMETA NDỊ ENYI N’ỊNTANET, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Foto si na vidio bụ́ “Kpachara Anya n’Ebe A Na-Emeta Ndị Enyi n’Ịntanet.” Ebe otu nwa agbọghọ hụrụ ka a na-egosi foto ya na tiivi, ya eju ya anya.

    Olee ihe ndị i kwesịrị ichebara echiche tupu gị edenye ihe ma ọ bụ tinye foto n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet?

  • Foto si na vidio bụ́ “Kpachara Anya n’Ebe A Na-emeta Ndị Enyi n’Ịntanet.” Ebe ụmụ nwoke abụọ yiri ndị ọjọọ na-egosi otu nwata nwoke ihe e tinyere n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet, nwata nwoke ahụ emechie anya ya.

    Gịnị mere o ji dị mkpa ịkpachara anya mgbe ị na-ahọrọ ndị gị na ha ga-abụ enyi n’Ịntanet?

  • Foto si na vidio bụ́ “Kpachara Anya n’Ebe A Na-emeta Ndị Enyi n’Ịntanet.” Ebe ụmụ nwoke abụọ yiri ndị ọjọọ na-egosi otu nwata nwoke ihe e tinyere n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet, nwata nwoke ahụ emechie anya ya.

    Gịnị mere o ji dị mma inwe oge i kpebiri ị ga na-anọru n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet?​—Efe. 5:​15, 16

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya