AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Dị Umeala n’Obi, Ihe M Nwere Ejukwa M Afọ?
Onye amụma Chineke ekweghị anara Jeroboam nnukwu onyinye o nyere ya (1 Eze 13:7-10; w08 8/15 8 ¶4)
Onye amụma ahụ mechara daa iwu Jehova nyere ya (1 Eze 13:14-19; w08 8/15 11 ¶15)
Isi o nupụụrụ Chineke kpataara ya nsogbu (1 Eze 13:20-22; w08 8/15 9 ¶10)
Anyị ga-agbara ọtụtụ nsogbu ọsọ ma ọ bụrụ na ihe anyị nwere juru anyị afọ, anyị ana-arịọkwa Jehova ka o duzie anyị mgbe anyị chọrọ ime mkpebi.—1 Tim. 6:8-10.
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee otú m ga-esi egosi na ihe ndị m nwere juru m afọ? Olee otú m ga-esi egosi na m dị umeala n’obi mgbe m na-ekpebi ihe m ga-eme?’—Ilu 3:5; 11:2.