Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb23 Jenụwarị p. 7
  • Jikere Ugbu A Maka Nsogbu Nwere Ike Ime Ka E Buga Gị Ụlọ Ọgwụ na Mberede

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jikere Ugbu A Maka Nsogbu Nwere Ike Ime Ka E Buga Gị Ụlọ Ọgwụ na Mberede
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Na-eyigharị Ya?
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Ị̀ Maara Ihe Ndị I Nwere Ike Ịhọrọ?
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Ihe Ọhụrụ E Wepụtara Iji Nyere Anyị Aka Izere Ọbara
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Ị̀ Maara Ihe Ndị I Nwere Ike Ịhọrọ?
    Ozi Alaeze Anyi—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
mwb23 Jenụwarị p. 7

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jikere Ugbu A Maka Nsogbu Nwere Ike Ime Ka E Buga Gị Ụlọ Ọgwụ na Mberede

Gịnị mere anyị kwesịrị iji jikere? Ọrịa ma ọ bụ ihe mberede nwere ike ime ka e buga anyị ụlọ ọgwụ mgbe anyị na-atụghị anya ya. N’ihi ya, tupu ihe gbata gbata emee, gbalịa nweta ihe niile ga-enyere gị aka ka e nwee ike ịgwọ gị nke ọma ma ụdị ihe ahụ mee. I mee ihe a, ọ ga-egosi na i ji ndụ kpọrọ ihe nakwa na ị na-edebe iwu Jehova nyere banyere ọbara.​—Ọrụ 15:28, 29.

Gịnị ka ị ga-eme iji jikere?

  • Kpee ekpere ma lezie anya nke ọma dejupụta kaadị DPA.a Ndị nkwusa e mere baptizim nwere ike isi n’aka nwanna na-ahụ maka akwụkwọ n’ọgbakọ ha nweta kaadị DPA. Ha nwekwara ike isi n’aka ya nwetara ụmụ ha na-erubeghị afọ iri na asatọ kaadị nke a na-akpọ Identity Card (ic)

  • Ọ bụrụ na ị dị ime, gwa ndị okenye ọgbakọ unu ka ha nye gị akwụkwọ a na-akpọ Information for Expectant Mothers (S-401). Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ime mkpebi ndị dị mma ma i nwee nsogbu mgbe ị dị ime ma ọ bụ mgbe ị na-amụ nwa

  • Ọ bụrụ na otú a ga-esi agwọ gị ga-eme ka e kwute okwu ọbara ma ọ bụkwanụ ọ bụrụ na a ga-enye gị bed n’ụlọ ọgwụ, mee ka ndị okenye ọgbakọ unu mara n’oge. Gwakwa ndị ụlọ ọgwụ na o nwere Onyeàmà Jehova ga-abịa leta gị

Olee otú ndị okenye nwere ike isi nye aka? Ha nwere ike inyere gị aka mgbe ị na-edejupụta kaadị DPA gị. Ma, ndị okenye agaghị ekpebiri gị otú a ga-esi agwọ gị ma ọ bụ gwawa gị ihe hanwa chere n’okwu mmadụ ga-eji aka ya kpebiere onwe ya. (Rom 14:12; Gal. 6:5) Ị gwa ndị okenye unu na a na-ekwu okwu ịmịnye gị ọbara, ha ga-enyere gị aka kpọtụrụ Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ ozugbo

Olee otú Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ ga-esi nyere gị aka? A zụrụ ụmụnna ndị nọ na kọmitii a ka ha na-enyere ndị ụlọ ọgwụ na ndị na-ahụ maka okwu ikpe aka ịghọta ihe ndị anyị kweere banyere ọbara. Ha na onye na-agwọ gị nwere ike ikwurịta ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi gwọọ gị n’amịnyeghị gị ọbara. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ha nwekwara ike inyere gị aka inweta dọkịta ga-ekweta ịgwọ gị n’amịnyeghị gị ọbara.

LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE GA-ENYERE GỊ AKA IKPEBI OTÚ A GA-ESI AGWỌ GỊ ỌRỊA MA Ọ GBASA ỌBARA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ A:

  • Olee ihe ndị ị mụtara na vidio a ga-enyere gị aka ijikere maka nsogbu nwere ike ime ka a chọwa ịmịnye gị ọbara?

a Isi nke 39 n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi ga-enyere gị aka ikpebi otú a ga-esi agwọ gị n’ejighị ọbara.

Ì JIKERELA?

Ọ bụrụ na i nwere nsogbu nwere ike ime ka a mịnye gị ọbara,

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya