OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Jiri Ndụmọdụ Ndị Dị na Baịbụl Nyere Ụmụ Gị Aka Ịna-eme Nke Ọma
Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst chọrọ ka ụmụ ha na-enwe obi ụtọ n’ozi ha na-ejere Jehova. Ndị nne na nna ga-enyere ụmụ ha aka ịna-eme nke ọma ma ha jiri ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl na-azụ ha.—Ilu 22:6.
Mee ka ọ dịrị ụmụ gị mfe ịna-agwa gị okwu.—Jems 1:19
Na-eme ihe dị mma ka ụmụ gị si n’aka gị mụta ya.—Diut. 6:6
Na-emechi ihe gbasara ofufe Chineke anya.—Efe. 6:4
LEENỤ VIDIO BỤ́ WUO ỤLỌ NA-AGAGHỊ ADA ADA—ZỤLITE ỤMỤ GỊ ‘DỊ KA ỤZỌ KWESỊRỊ HA SI DỊ,’ ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee otú ndị nne na nna ga-esi gosi na ha anaghị emefe ihe ókè?
Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi mee ihe e kwuru na Jems 1:19?
Olee ihe ndị mụrụ ụmụ ga-eme ma e nwee nsogbu?