ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 7
Anyị Hụrụ Jehova Nna Anyị n’Anya nke Ukwuu
“Ma anyị onwe anyị nwere ịhụnanya, n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.”—1 JỌN 4:19.
ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị
IHE ISIOKWU A NA-EKWUa
1-2. Gịnị mere Jehova ji mee ka anyị nwee ike iso ná ndị na-efe ya? Oleekwa otú o si mee ya?
JEHOVA kpọrọ anyị ka anyị soro ná ndị na-efe ya. Ọkpụkpọ ahụ ọ kpọrọ anyị magburu onwe ya. Ndị anyị na ha so na-efe Chineke bụ ndị nyefere ya onwe ha ma nwee okwukwe n’àjà Ọkpara ya ji ndụ ya chụọ. Anyị niile dị ka ezinụlọ nwere obi ụtọ. Anyị na-ebi ndụ bara uru ugbu a. Obi dịkwa anyị ụtọ na anyị na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ na Paradaịs ga-adị n’ụwa.
2 Ihe mere Jehova ji mee ka anyị soro ná ndị na-efe ya bụ na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Ma, ime otú ahụ furu ya nnukwu ihe. (Jọn 3:16) O “ji ihe dị oké ọnụ ahịa zụta” anyị. (1 Kọr. 6:20) Jehova ji àjà ahụ Jizọs chụrụ mee ka anyị na ya dị ná mma. Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ike ịkpọ Onye kachanụ ma n’eluigwe ma n’ụwa Nna anyị. Dị ka anyị mụtara n’isiokwu bu nke a ụzọ, o nweghị nna a ga-eji tụnyere Jehova.
3. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ? (Kwuokwa ihe e dere n’igbe bụ́ “Jehova Ọ̀ Ma M?”)
3 Anyị nwere ike ịjụ ajụjụ otu onye so dee Baịbụl jụrụ. Ọ sịrị: “Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ uru niile ọ na-eme ka m rite?” (Ọma 116:12) Azịza ya bụ na anyị agaghị akwụli Jehova ụgwọ ihe o meere anyị. Ma, ịhụnanya ya mere ka anyị hụ ya n’anya. Jọn onyeozi dere, sị: “Anyị onwe anyị nwere ịhụnanya, n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.” (1 Jọn 4:19) Olee otú anyị nwere ike isi gosi Nna anyị nke eluigwe na anyị hụrụ ya n’anya?
NỌRỌ JEHOVA NSO
Anyị na-egosi otú anyị hụruru Nna anyị nke eluigwe n’anya ma ọ bụrụ na anyị ana-ekpe ekpere, na-erubere ya isi, na-enyekwara ndị ọzọ aka ka ha hụ ya n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 ruo na nke 14)
4. Dị ka e kwuru na Jems 4:8, gịnị mere anyị ji kwesị ịgbalịsi ike ka anyị na Jehova dịrị ná mma?
4 Jehova chọrọ ka anyị na ya dịrị ná mma, chọọkwa ka anyị na-agwa ya okwu. (Gụọ Jems 4:8.) Ọ gwara anyị ka anyị ‘nọgidesie ike n’ekpere.’ Ọ na-egekwa ntị n’ekpere anyị mgbe niile. (Rom 12:12) O nweghị mgbe ọ na-agaghị enwe ohere ma ọ bụ mgbe ike na-agaghị adị ya ige anyị ntị. Otú anyị si ege ya ntị bụ ịgụ Okwu ya bụ́ Baịbụl, ya na akwụkwọ ndị na-enyere anyị aka ịghọta ya. Otú ọzọ anyị si eme ya bụ ige ntị n’ọmụmụ ihe. Otú ahụ ụmụaka na nne na nna ha ga-adị ná mma ma ha na-ekwurịta okwu mgbe niile ka anyị na Jehova ga-adịkwa ná mma ma anyị na ya na-ekwurịta okwu mgbe niile.
A ga-akọwa ya na paragraf nke 5
5. Olee otú i nwere ike isi mee ka ekpere gị ka mma?
5 Chee otú ekpere gị na-adị. Jehova chọrọ ka anyị na-agwa ya otú ọ dị anyị n’obi ma anyị kpewe ekpere. (Ọma 62:8) Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ekpere m ọ̀ na-ada ka ihe e bu n’isi a na-agụ ka egwú, ka ọ̀ na-ada ka ihe si mmadụ n’obi?’ O doro anya na ị hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ka gị na ya dịrị n’ezigbo mma. Ihe ga-enyere gị aka bụ ịna-agwa ya okwu mgbe niile. Gwa ya ihe ị na-agaghị achọ ịgwa ndị ọzọ. Gwa ya ihe ndị na-eme gị obi ụtọ na ihe ndị na-echegbu gị. Obi sie gị ike na i nwere ike ịgakwuru ya ka o nyere gị aka.
6. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị na Nna anyị nke eluigwe nwee ike ịdị ná mma?
6 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Nna anyị nke eluigwe na-adị ná mma, anyị kwesịrị ịna-ekele ya maka ihe ndị ọ na-emere anyị. Anyị kwetara ihe otu ọbụ abụ kwuru. Ọ sịrị: “I mewo ọtụtụ ihe, Jehova bụ́ Chineke m, bụ́ ọrụ gị ndị dị ebube nakwa ihe ndị ị na-eche banyere anyị; ọ dịghị onye a ga-eji tụnyere gị. Ọ bụrụ na mụ asị ka m kọwa ha ma ọ bụ kwuwe banyere ha, ha dị ọtụtụ karịa otú m pụrụ ịkọ.” (Ọma 40:5) Ọ bụghị naanị na obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ maka ihe ndị Jehova na-emere anyị, kama okwu anyị na omume anyị kwesịrị igosi na anyị na-ekele ya. Anyị ga-esi otú ahụ gosi na anyị anaghị eme ka ọtụtụ ndị n’ụwa taa. Anyị bi n’ụwa ebe ndị mmadụ na-anaghị ekele Chineke maka ihe ọ na-emere ha. Nke bụ́ eziokwu bụ na otu n’ime ihe na-egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ” bụ na ndị mmadụ anaghị ekele ndị meere ha ihe. (2 Tim. 3:1, 2) Anyị achọtụdịghị ịmụta ụdị àgwà ahụ.
7. Gịnị ka Jehova chọrọ ka anyị mee, n’ihi gịnịkwa?
7 Ndị nne na nna chọrọ ka ụmụ ha dịrị ná mma, kama ịna-ese okwu. Otú ahụkwa ka Jehova chọrọ ka ụmụ ya niile dịrị ná mma. Ọ bụdị ịhụ ibe anyị n’anya ga-eme ka a mata na anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst. (Jọn 13:35) Anyị kwetara ihe otu ọbụ abụ dere. Ọ sịrị: “Lee ka o si dị mma, bụrụkwa ihe na-enye obi ụtọ mgbe ụmụnne bikọtara ọnụ n’ịdị n’otu!” (Ọma 133:1) Ọ bụrụ na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya, anyị na-egosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya. (1 Jọn 4:20) Obi atọgbuola anyị na anyị niile dị ka otu ezinụlọ, bụ́ ebe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ‘na-enwe obiọma n’ebe ibe ha nọ, na-enwekwa ọmịiko.’—Efe. 4:32.
RUBERE JEHOVA ISI MAKA NA Ị HỤRỤ YA N’ANYA
A ga-akọwa ya na paragraf nke 8
8. Dị ka e kwuru na 1 Jọn 5:3, olee ihe kacha mkpa mere anyị ji erubere Jehova isi?
8 Jehova chọrọ ka ụmụaka na-erubere nne na nna ha isi. Ọ chọkwara ka anyị na-erubere ya isi. (Efe. 6:1) Anyị kwesịrị ịna-erubere ya isi n’ihi na ọ bụ ya kere anyị, na-eme ka anyị dịrị ndụ, bụrụkwa Nna kacha nna niile mara ihe. Ma, ihe kacha mkpa mere anyị ji erubere Jehova isi bụ na anyị hụrụ ya n’anya. (Gụọ 1 Jọn 5:3.) N’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji na-erubere Jehova isi, ọ naghị amanye anyị ime otú ahụ. Ọ hapụrụ anyị ka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme. Ọ bụ ya mere obi ji adị ya ụtọ ma anyị kpebie irubere ya isi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya.
9-10. Gịnị mere o ji dị mkpa ịmata àgwà Chineke chọrọ ka anyị na-akpa ma na-erubere ya isi?
9 Ndị nne na nna achọghị ka ihe ọ bụla mee ụmụ ha. Ọ bụ ya mere ha ji agwa ụmụ ha àgwà ha kwesịrị ịna-akpa. Ọ na-abakwara ụmụ ha uru. Ọ bụrụ na ụmụaka ana-erubere nne na nna ha isi, ọ na-egosi na ha tụkwasịrị ha obi ma na-akwanyere ha ùgwù. N’ihi ya, ọ kachadị mkpa ka anyị mara àgwà ndị Nna anyị nke eluigwe chọrọ ka anyị na-akpa ma na-erubere ya isi. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, ọ na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù. Ọ ga-abakwara anyị uru. (Aịza. 48:17, 18) Ma, ndị na-anaghị erubere Jehova isi na-emecha kpatara onwe ha nsogbu.—Gal. 6:7, 8.
10 Ime ihe dị Jehova mma ga-eme ka anyị zere ihe ọ bụla ga-emerụ anyị ahụ́, ihe ga-eme ka obi na-ajọ anyị njọ, nakwa ihe ga-eme ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. Jehova ma ihe ga-akacha baara anyị uru. Otu nwanna nwaanyị bi n’Amerịka aha ya bụ Aurora sịrị: “Ama m na irubere Jehova isi na-eme ka mmadụ na-ebi ndụ kacha mma.” Anyị niile ma na o kwuru eziokwu. Olee uru i riterela n’ihi na ị na-erubere Jehova isi?
11. Olee otú ekpere si enyere anyị aka?
11 Ekpere na-enyere anyị aka ịna-erubere Jehova isi, ọ bụrụgodị na o siiri anyị ezigbo ike. Mgbe ụfọdụ, ezughị okè na-eme ka o siere anyị ike irubere Jehova isi. Ma, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike mgbe niile ka anyị ghara imehie. Otu ọbụ abụ rịọrọ Chineke, sị: “Mee ka m nwee nghọta, ka m wee debe iwu gị, ka m wee jiri obi m dum debe ya.” (Ọma 119:34) Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ oge niile aha ya bụ Denise sịrị: “Ọ bụrụ na o siere m ike ime otu ihe Jehova kwuru ka anyị mee, m na-arịọ ya ka o nye m ike m ga-eji eme ya.” Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova na-aza ụdị ekpere ahụ mgbe niile.—Luk 11:9-13.
NA-ENYERE NDỊ ỌZỌ AKA KA HA HỤ NNA ANYỊ NKE ELUIGWE N’ANYA
12. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 5:1, gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme?
12 Gụọ Ndị Efesọs 5:1. Ebe anyị bụ ‘ụmụ Chineke hụrụ n’anya,’ anyị na-agbalịsi ike ịna-eṅomi ya. Otú anyị si eme ya bụ ịdị obiọma, ịhụ ndị ọzọ n’anya, na ịgbaghara ha. Ọ bụrụ na ndị na-amaghị Chineke ahụ omume ọma anyị, o nwere ike ime ka ha chọọ ịmụtakwu gbasara Chineke. (1 Pita 2:12) Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịgbalị na-emeso ụmụ ha otú Jehova si emeso anyị. Ha mee otú ahụ, ụmụ ha nwere ike ịchọ ka ha na Nna anyị nke eluigwe dịrị ná mma.
A ga-akọwa ya na paragraf nke 13
13. Olee ihe anyị kwesịrị ịna-eche gbasara ya?
13 Ụmụaka na-eji nna ha eme ọnụ. Obi na-adịkwa ha ụtọ ịkọrọ ndị ọzọ gbasara ya. Anyịnwa jikwa Nna anyị bụ́ Jehova eme ọnụ. Anyị chọkwara ka ndị ọzọ mata gbasara ya. Obi dị anyị otú ọ dị Eze Devid mgbe o dere, sị: “M ga-eji Jehova nyaa isi.” (Ọma 34:2) Ọ bụrụkwanụ na anyị bụ ndị ihere? Olee otú anyị ga-esi kata obi? Anyị ga-akata obi ma ọ bụrụ na anyị ana-eche otú obi ga-esi dị Jehova ụtọ ma anyị na-agwa ndị ọzọ gbasara ya nakwa uru ịmụta gbasara ya ga-abara ha. Jehova ga-eme ka anyị kata obi. N’oge ndịozi, o nyeere Ndị Kraịst aka ịkata obi. Ọ ga-enyekwara anyịnwa aka.—1 Tesa. 2:2.
14. Olee ụfọdụ ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst?
14 Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu. N’ihi ya, obi na-adị ya ụtọ ma ọ hụ ka anyị na-egosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya n’agbanyeghị ebe ha si. (Ọrụ 10:34, 35) Otu ụzọ kacha mma anyị nwere ike isi gosi ndị mmadụ na anyị hụrụ ha n’anya bụ ịna-ezi ha ozi ọma. (Mat. 28:19, 20) Olee uru izi ha ozi ọma nwere ike ịba? Ndị gere anyị ntị nwere ike ime ka ndụ ha ka mma ugbu a, nweekwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs.—1 Tim. 4:16.
HỤ NNA ANYỊ NKE ELUIGWE N’ANYA MA NA-ENWE OBI ỤTỌ
15-16. Gịnị na gịnị mere anyị ji kwesị ịna-enwe obi ụtọ?
15 Jehova bụ Nna hụrụ ụmụ ya n’anya. N’ihi ya, ọ chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ. (Aịza. 65:14) E nwere ọtụtụ ihe mere anyị nwere ike iji na-enwe obi ụtọ ugbu a n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara anyị. Dị ka ihe atụ, obi siri anyị ike na Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Anyị ma eziokwu Okwu Chineke bụ́ Baịbụl na-akụzi. (Jere. 15:16) Anyị sokwa n’ezinụlọ pụrụ iche Jehova nwere. Ndị juru na ya bụ ndị hụrụ Jehova n’anya, na-erubere ya isi, ma hụ ibe ha n’anya.—Ọma 106:4, 5.
16 Anyị ga na-enwe obi ụtọ n’ihi na obi siri anyị ike na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. Anyị ma na n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ewepụ ihe ọjọọ niile nakwa na ọ ga-eji Alaeze ya mee ka ụwa niile ghọọ Paradaịs. Anyị nwekwara olileanya magburu onwe ya na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, anyị na ha anọrọkwa. (Jọn 5:28, 29) Oge ahụ ga-amagbu onwe ya. Nke ka nke bụ na obi siri anyị ike na n’oge na-adịghị anya, ndị niile nọ n’eluigwe na n’ụwa ga na-asọpụrụ Nna anyị nke eluigwe, na-eto ya, ma na-efe ya ofufe kwesịịrị ya.
ABỤ NKE 12 Jehova Chineke Dị Ukwuu
a Anyị ma na Nna anyị bụ́ Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, meekwa ka anyị soro ná ndị na-efe ya. Ọ bụ ya mere anyị ji hụ ya n’anya. Olee otú anyị ga-esi gosi ya na anyị hụrụ ya n’anya? N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị anyị nwere ike ime.