Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w22 Mach p. 13
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ò Nwetụla Mgbe Ọ Dị Gị Ka Ị̀ Bụ Onye A Jụrụ Ajụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Jonatan Bụ Dike na Ezigbo Enyi Devid
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • “Irube Isi Dị Mma Karịa Àjà”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Devid na Sọl
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
w22 Mach p. 13

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere 2 Samuel 21:​7-9 ji kwuo na Devid ‘meteere Mefiboshet ebere,’ mechaakwa kwuo na ọ kpọnyere Mefiboshet ndị Gibiọn ka ha gbuo ya?

Ụfọdụ ndị gụrụ akụkọ a ọkụ ọkụ ajụọla ajụjụ a. Ma e nwere mmadụ abụọ aha ha bụ Mefiboshet a kpọrọ aha n’akụkọ a. E nwere ihe anyị ga-amụta n’akụkọ a ma ọ bụrụ na anyị elebakwuoro ya anya.

Sọl bụ́ eze Izrel mụrụ ụmụ nwoke asaa na ụmụ nwaanyị abụọ. Aha ọkpara Sọl bụ Jonatan. E mechara mụọrọ Eze Sọl nwa nwoke aha ya bụ Mefiboshet. Ọ bụ iko ya nwaanyị aha ya bụ Rizpa mụụrụ ya nwa ahụ. Jonatan nwekwara nwa nwoke aha ya bụ Mefiboshet. N’ihi ya, ihe ọ pụtara bụ na Eze Sọl nwere nwa aha ya bụ Mefiboshet, nweekwa nwa nwa aha ya bụ Mefiboshet.

E nwere oge Sọl lụsawara ndị Gibiọn bi n’Izrel agha, chọọkwa igbuchapụ ha niile. Ọ ga-abụkwa na o gburu ụfọdụ n’ime ha. Ihe a o mere jọrọ ezigbo njọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na n’oge Joshụa, ndị Gibiọn na ndị isi Izrel gbara ndụ, meekwa udo.​—Josh. 9:​3-27.

Ọgbụgba ndụ ahụ ka dịkwa n’oge Eze Sọl. Ma, Sọl enweghị ihe o ji ọgbụgba ndụ ahụ kpọrọ. Ọ gbara mbọ ikpochapụ ndị Gibiọn niile. Ihe ahụ o mere mere ka ‘ikpe ọbara ma Sọl na ezinụlọ ya.’ (2 Sam. 21:1) Mgbe Devid mechara bụrụ eze, ndị Gibiọn fọrọ ndụ gwara ya gbasara ihe ọjọọ ahụ Sọl mere ha. Devid jụrụ ha ihe ọ ga-emere ha ka obi ha jụrụ maka ihe ọjọọ ahụ Sọl mere ha nakwa ka Jehova gọzie ala Izrel. Ndị Gibiọn agwaghị ya ka o weta ego. Kama, ha gwara ya ka ọ kpọnye ha mmadụ asaa n’ime ụmụ nwoke Sọl mụrụ bụ́ onye chọrọ “igbuchapụ” ha ka ha gbuo. (Ọnụ Ọgụ. 35:​30, 31) Devid mere ihe a ha kwuru.​—2 Sam. 21:​2-6.

Sọl na Jonatan anwụọla n’agha n’oge ahụ. Ma Mefiboshet nwa Jonatan ka dị ndụ. Ihe mberede o nwere mgbe ọ dị obere mere ka ọ daa ngwọrọ. O soghịkwa nna nna ya bụ́ Sọl chọọ igbuchapụ ndị Gibiọn. Devid na Jonatan gbakwara ndụ na ha ga-anọgide na-ahụ ibe ha n’anya. Ọgbụgba ndụ ahụ ga-abakwara ụmụ ha uru. Mefiboshet nwa Jonatan sokwa ná ndị ọgbụgba ndụ ahụ ga-abara uru. (1 Sam. 18:1; 20:42) Baịbụl kwuru, sị: “Eze Devid meteere Mefiboshet nwa Jonatan nwa Sọl ebere, n’ihi iyi ya na Jonatan nwa Sọl ji aha Jehova ṅụọrọ ibe ha.”​—2 Sam. 21:7.

Ma, Devid mekwara ihe ndị Gibiọn rịọrọ. Ọ kpọnyere ha ụmụ Sọl ndị nwoke abụọ. Aha otu n’ime ha bụ Mefiboshet, kpọnyekwa ha ụmụ ụmụ Sọl ise. (2 Sam. 21:​8, 9) Ihe a Devid mere mere ka ikpe ọbara gharazie ịma ala ahụ.

E nwere ihe anyị ga-amụta n’akụkọ a. Ihe iwu Chineke kwuru doro anya. Iwu ya kwuru, sị: “A gaghịkwa egbu ụmụ n’ihi ihe nna ha mere.” (Diut. 24:16) Jehova agaraghị akwado ihe a e mere ụmụ Sọl ndị nwoke abụọ na ụmụ ụmụ ya ndị nwoke ise ma ọ bụrụ na aka ha dị ọcha. Iwu ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụ naanị mmehie mmadụ mere ga-eme ka e gbuo ya.” Ọ ga-abụ na ụmụ Sọl asaa ahụ so ya kpaa nkata igbuchapụ ndị Gibiọn. Ihe ọ kpataziri bụ na ha ji ndụ ha kwụọ ụgwọ ya.

Akụkọ a na-akụziri anyị na mmadụ agaghị asị na aka ya adịghị n’ihe ọjọọ o mere n’ihi na ọ bụ onye ọzọ gwara ya mee ya. Otu ilu Baịbụl kwuru, sị: “Mee ka ụzọ ị na-aga dị larịị, ụkwụ ga-esikwa gị ike n’ala. Abanyela n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe. Wepụ ụkwụ gị n’ihe ọjọọ.”​—Ilu 4:​24-27; Efe. 5:15.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya