Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp25 nke 1 p. 4-5
  • Otú Agha Si Akpa Anyị Niile Aka Ọjọọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Agha Si Akpa Anyị Niile Aka Ọjọọ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2025
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Mgbe A Ga-akwụsị Ịlụ Agha Ndị A Na-alụ Ugbu A?—Gịnị Ka Baịbụl kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • E Mefuola Ọtụtụ Puku Ijeri Dọla n’Agha—Olee Ihe Agha Na-efu n’Eziokwu?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Otú Agha Ga-esi Akwụsị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2025
  • Agha
    Teta!—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2025
wp25 nke 1 p. 4-5
Foto ndị na-egosi: 1. Ebe onye agha na-aga ije, ụgbọ ndị agha esoro ya n’azụ. 2. Ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka ndị si mba dị iche iche agha na-akpa ike.

Otú Agha Si Akpa Anyị Niile Aka Ọjọọ

“E nwetụbeghị ọtụtụ ebe a na-alụ agha n’ụwa otú e nwere ya ugbu a kemgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ. Ijeri mmadụ abụọ, ya bụ, otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla, bi n’ebe a na-alụ agha.”

Osote Onyeisi Òtù Mba Ụwa Bụ́ Amina J. Mohammed, Jenụwarị 26, 2023.

Agha nwere ike ịmalite na mberede n’ebe ndị e nwere udo ugbu a. O nwedịrị ike ịkpatara ndị bi n’ebe dị anya n’ebe a na-alụ ya ahụhụ maka na n’oge anyị a, ihe na-eme n’otu ebe n’ụwa na-emetụtakwa ndị bi n’ebe ọzọ n’ụwa. Ọ bụrụgodị na agha ebie, nsogbu ndị ọ kpatara na-adịte aka. Lee ụfọdụ n’ime ha:

  • Foto na-egosi ebe aka abụọ ji otu efere ọ na-enweghị ihe dị na ya.

    Ụkọ nri. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ihe Oriri kwuru na “ihe kacha akpata agụụ bụ agha. Mmadụ asaa n’ime mmadụ iri ọ bụla agụụ na-anyụ ịkpakwụ bi n’ebe ndị a na-alụ agha.”

  • Foto na-egosi ebe otu nwaanyị obi jọrọ njọ ji aka ya abụọ kpuchie ihu ya.

    Mmerụ ahụ́ na ọrịa. Ndị mmadụ mata na a na-aga ịlụ agha n’ebe ha bi, obi na-ekoro ha n’elu, ha ana-echegbukwa onwe ha. Ndị nke bi n’ebe a na-alụ agha na-akacha anọ ná nsogbu. Agha nwere ike imerụ ha ahụ́ ma ọ bụ mee ka isi gharazie ịkpakọcha ha ọnụ. Ọtụtụ mgbe, ọ naghị adịrị ha mfe inweta ọgwụ ma ọ bụ ịga n’ebe a ga-agwọ ha.

  • Foto na-egosi ebe otu ezinụlọ bu nnukwute akpa ngwongwo ha juru na ya.

    Ịgba ọsọ ndụ. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ kwuru na ka ọ na-erula ọnwa Septemba afọ 2023, ihe karịrị otu narị nde mmadụ na nde iri na anọ (114,000,000) agbaala ọsọ ndụ n’ụwa niile. Isi ihe kpatara ya bụ agha.

  • Foto na-egosi ebe otu ezinụlọ guzo n’ihu obere ụlọ ha.

    Ihe isi ike. Agha na-emekarị ka ihe siwere ndị mmadụ ike. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka ngwá ahịa rịa elu ọjị. Ndị mmadụ na-ata ahụhụ ma ndị ọchịchị were ego e kwesịrị itinye n’ihe gbasara ahụ́ ike na agụmakwụkwọ na-etinyezi n’agha. Ọ bụrụgodị na agha ebie, ego a na-emefu iji mezie ihe ndị e mebisịrị n’agha na-akarị akarị.

  • Foto na-egosi ebe mmanụ si na paịpụ na-agbapụsị.

    Imebisị ụwa. Ndị mmadụ na-ata ahụhụ ma a kpachara anya na-emebisị ihe ndị dị n’ụwa. E metọọ mmiri, ikuku, na ala, o nwere ike ịkpatara ndị mmadụ ụdị ọrịa dị iche iche ruo ogologo oge. Ọ bụrụgodị na agha ebie, ogbunigwe ndị e liri n’ala ka ga na-akpatara ndị mmadụ nsogbu.

N’eziokwu, agha na-ala ọtụtụ ihe n’iyi, na-efukwa nnukwu ihe.

Amụma Ndị Baịbụl Buru Gbasara Agha

Baịbụl buru amụma na agha so n’ihe ndị a ga-eji ama “ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 24:3) Jizọs Kraịst kwuru, sị:

  • “Unu ga-anụ mkpọtụ agha na akụkọ agha. . . . N’ihi na mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha.”​—Matiu 24:6, 7.

  • “Mgbe unu na-anụkwa mkpọtụ agha na ọgba aghara, unu atụla ụjọ.”​—Luk 21:9.

    Okwu a sụgharịrị “ọgba aghara” nwere ike ịpụta ise okwu ma ọ bụ ịlụ ọgụ n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ịgba ọchịchị mgba okpuru, ma ọ bụ ịlụso ndị ọchịchị ọgụ.

Ị chọọ ịmatakwu banyere ya, gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ihe Na-egosi na Anyị Nọ n’Oge Ikpeazụ?” Ọ dị na jw.org.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya