IHE I NWERE IKE ỊMỤ
Gosi na I Nwere Obi Ike Mgbe A Na-enye Gị Nsogbu
Gụọ Jeremaya 38:1-13 ka ị mụta otú Jeremaya onye amụma na Ibed-melek bụ́ ọnaozi si nwee obi ike.
Matakwuo ihe ndị merenụ. Gịnị mere o ji dị mkpa ka Jeremaya nwee obi ike iji zie ndị mmadụ ozi Jehova ziri ha? (Jere. 27:12-14; 28:15-17; 37:6-10) Gịnị ka ndị ahụ mere mgbe ha nụrụ ozi Jeremaya ziri ha?—Jere. 37:15, 16.
Mekwuo nchọnchọ. Gịnị ka ndị mmadụ chọrọ ka Jeremaya mee? (jr 26-27 ¶20-22) Matakwuo gbasara olulu ndị e nwere n’oge ochie na ihe a na-eji ha eme. (w11 1/1 19 ¶1-4; w08 6/1 15, igbe) Olee otú i chere obi dị Jeremaya mgbe ọ nọ n’olulu ahụ apịtị juru? Olee ihe ndị o nwere ike ịbụ na ha tụrụ Ibed-melek ụjọ?—w12 5/1 31 ¶2-3.
Chee ihe ndị ọ na-akụziri gị. Jụọ onwe gị, sị:
‘Gịnị ka akụkọ a na-akụziri m banyere otú Jehova si echebe ndị na-erubere ya isi?’ (Ọma 97:10; Jere. 39:15-18)
‘Olee oge ndị ọ dị mkpa ka m nwee obi ike?’
‘Olee otú m ga-esi katakwuo obi na-eme ihe dị mma mgbe a na-enye m nsogbu?’ (w11 3/1 30)a
a Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị i nwere ike ịmụ, gụọ “Ihe I Nwere Ike Ịmụ,” nke gbara n’Ụlọ Nche Julaị 2023.