ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 10
ABỤ NKE 31 Soro Chineke Na-eje Ije
Na-eche Echiche Ka Jehova na Jizọs
“Ebe Kraịst tara ahụhụ mgbe ọ bụ mmadụ, jikerekwanụ ịna-eche echiche otú Kraịst si eche.”—1 PITA 4:1.
IHE A GA-AMỤ
Otú Pita onyeozi si mụta iche echiche ka Jizọs nakwa otú anyịnwa ga-esi amụta ya.
1-2. Gịnị ka ịhụ Jehova n’anya pụtara? Oleekwa otú Jizọs si gosi ya?
“JIRI obi gị niile na mkpụrụ obi gị niile na ike gị niile na uche gị niile hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Luk 10:27) Jizọs kwuru na ọ bụ ya bụ iwu kacha mkpa n’Iwu Mosis. Ị ga-ahụ na ịhụ Jehova n’anya gbasara obi anyị, nke bụ́ ihe na-agụ anyị agụụ, echiche anyị, na otú obi na-adị anyị. Ọ gbasara ihe anyị ji obi anyị niile na ike anyị niile na-eme. Ma, ịhụ Jehova n’anya gbasakwara otú anyị si eche echiche. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị agaghị aghọtachali otú Jehova si eche echiche. Ma anyị nwere ike ịghọtakwu otú o si eche echiche ma anyị mụọ “uche Kraịst” n’ihi na Jizọs na-eche echiche nnọọ ka Nna ya.—1 Kọr. 2:16.
2 Jizọs ji obi ya niile hụ Jehova n’anya. Ọ ma ihe Jehova chọrọ ka o mee, kpebisiekwa ike ime ya, ọ bụ eziokwu na ọ pụtara na ọ ga-ata ahụhụ n’ihi ime ihe dị mma. Jizọs lekwasịrị anya n’ime uche Nna ya. N’ihi ya, o kweghị ka ihe ọ bụla megharịa ya anya n’ihe o kpebiri ime.
3. Gịnị ka Pita onyeozi mụtara n’aka Jizọs, gịnịkwa ka ọ gbara Ndị Kraịst ibe ya ume ka ha mee? (1 Pita 4:1)
3 Pita na ndịozi ndị ọzọ nwere ohere magburu onwe ya ha na Jizọs ịnọ nakwa ịmụta otú o si eche echiche. Mgbe Pita dere akwụkwọ ozi mbụ ya, ọ gbara Ndị Kraịst ume ka ha jikere ịna-eche echiche ka Kraịst. (Gụọ 1 Pita 4:1.) Mgbe ọ sịrị “jikerekwanụ,” ihe o kwuru bụ okwu ndị agha. O ji ya na-akọwa otú ndị agha na-esi ejikere maka agha. N’ihi ya, ọ bụrụ na Ndị Kraịst ana-eche echiche ka Jizọs, ha ga-ejikere ejikere ịlụso ezughị okè na ụwa a Ekwensu na-achị ọgụ.—2 Kọr. 10:3-5; Efe. 6:12.
4. Olee otú isiokwu a ga-esi nyere anyị aka ime ihe Pita dụrụ anyị ọdụ ka anyị mee?
4 Anyị ga-eleba anya n’otú Jizọs si eche echiche, chọpụtakwa otú anyị ga-esi eme ka ya. Anyị ga-esi n’aka Jizọs mụta (1) otú anyị ga-esi na-eche echiche ka Jehova, nke ga-enyere anyị niile aka inwe otu obi, (2) otú anyị ga-esi adị umeala n’obi, na (3) otú anyị ga-esi na-ekpe ekpere iji gosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi ka o nyere anyị aka ịna-eche echiche nke ọma.
NA-ECHE ECHICHE KA JEHOVA
5. Gịnị ka Pita mere nke gosiri na o cheghị echiche otú Jehova si eche?
5 Ka anyị kwuo gbasara otu oge Pita na-echeghị echiche ka Jehova. Jizọs gwara ndịozi ya na ọ ga-aga Jeruselem, e nyefee ya n’aka ndị isi okpukpe n’ebe ahụ, taa ya ahụhụ, mechaakwa gbuo ya. (Mat. 16:21) Ọ ga-abụ na o siiri Pita ike ikweta na Jehova ga-ahapụ ka e gbuo Jizọs, onye bụ́ olileanya ndị Izrel nwere nakwa Mezaya e kwere ná nkwa. (Mat. 16:16) N’ihi ya, Pita kpọpụrụ Jizọs n’akụkụ ma sị ya, “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị. Ihe a agaghị eme gị.” (Mat. 16:22) Ebe ọ bụ na Pita echeghị echiche otú Jehova si eche n’oge ahụ, ya na Jizọs enweghị otu obi n’okwu ahụ.
6. Olee otú Jizọs si gosi na ọ na-eche echiche otú Jehova si eche?
6 Jizọs na-eche echiche ka Nna ya nke eluigwe mgbe niile. Jizọs sịrị Pita: “Gaa m n’azụ, Setan! Ị na-achọ imegharị m anya, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama ọ bụ nke mmadụ.” (Mat. 16:23) Jizọs ma na ime uche Chineke ga-eme ka ọ taa ahụhụ ma nwụọ. N’ihi ya, o kweghị ege Pita ntị, ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịbụ na Pita nọ na-achọ inyere ya aka. Pita si n’ihe a mụta na o kwesịrị ịna-eche echiche ka Chineke. Ihe a bụ ihe dị ezigbo mkpa anyị niile kwesịrị ịmụta.
7. Olee otú Pita si mechaa gosi na o chewela echiche otú Jehova si eche? (Kọwaa foto.)
7 Pita mechara gosi na ọ chọrọ ịna-eche echiche otú Jehova si eche. Oge ruru mgbe Jehova chọrọ ka ndị si ná mba ndị ọzọ na-abụghị ndị Izrel ghọọ ndị ya. Ọ gwara Pita ka ọ gaa zie Kọnịliọs, onye na-abụghị onye Juu, ozi ọma. Ọ ga-eso ná ndị mbụ na-abụghị ndị Juu ga-abụ Ndị Kraịst. Ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu anaghị emekọcha ihe. N’ihi ya, o doro anya na Pita kwesịrị ijikere ejikere maka ọrụ a. Mgbe Pita chọpụtara ihe bụ́ uche Chineke n’okwu a, ọ gbanwere otú o si eche echiche. Ọ bụ ya mere o ‘ji jiri obi ya niile’ gaa mgbe Kọnịliọs kpọrọ ya. (Ọrụ 10:28, 29) O ziri Kọnịliọs na ndị ezinụlọ ya ozi ọma, ha emee baptizim.—Ọrụ 10:21-23, 34, 35, 44-48.
Ebe Pita na-abanye n’ụlọ Kọnịliọs (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)
8. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị na-eche echiche ka Jehova? (1 Pita 3:8)
8 Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Pita gbara Ndị Kraịst ibe ya ume ka ha “nwee otu obi.” (Gụọ 1 Pita 3:8.) Ebe anyị bụ ndị na-efe Jehova, anyị na ụmụnna anyị ga-enwe otu obi ma anyị na-eche echiche ka Jehova. Anyị ga-esi na Baịbụl amụta ya. Dị ka ihe atụ, Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. (Mat. 6:33) Onye nọ n’ọgbakọ anyị nwere ike ịchọ ịmalite ịsụ ụzọ ma ọ bụ ijere Jehova ụdị ozi oge niile ọzọ. Anyị ekwesịghị ịgwa ya ka o metere onwe ya ebere. Kama anyị kwesịrị ịja ya mma maka ihe ọma ahụ o kpebiri ime, nyekwara ya aka.
DỊRỊ UMEALA N’OBI
9-10. Olee otú Jizọs si gosi na ọ dị ezigbo umeala n’obi?
9 N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, ọ kụziiri Pita na ndịozi ndị ọzọ ihe dị ezigbo mkpa gbasara ịdị umeala n’obi. Jizọs ebula ụzọ zipụ Pita na Jọn ka ha gaa kwadebe maka nri ikpeazụ ya na ndịozi ya ga-eri tupu ya anwụọ. Ọ ga-abụ na ihe ndị so ná nkwadebe ahụ bụ ijide n’aka na e nwere efere ịkwọ aka na ákwà e ji ehicha ahụ́ ga-adị ebe ahụ ka ndị bịaranụ nwee ike ịsa ụkwụ ha tupu ha eriwe ihe. Mana, ònye ga-adị umeala n’obi saa ụkwụ ndị ọzọ?
10 Jizọs egbughị oge ịrụ ọrụ a. O gosiri na ọ dị ezigbo umeala n’obi. Ọ ga-abụrịrị na ihe a Jizọs mere juru ndịozi ya anya n’ihi na ọrụ ahụ bụ ọrụ ndị ohu na-arụkarị. Jizọs yipụrụ uwe elu ya, were ákwà ahụ e ji ehicha ahụ́ kee n’úkwù ya, kunye mmiri n’efere ịkwọ aka ahụ, malitezie ịsa ụkwụ ndịozi ya. (Jọn 13:4, 5) Ọ ga-abụ na o gburu ya oge ịsa ụkwụ ndịozi ya iri na abụọ, ma nke Judas, onye na-aga ịrara ya nye. N’agbanyeghị ya, Jizọs weturu onwe ya ala rụọ ọrụ ahụ. Mgbe o mechara ya, o weturu obi gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ùnu ma ihe m meere unu? Unu na-akpọ m ‘Onye Ozizi’ na ‘Onyenwe anyị.’ Ihe unu na-akpọ m ziri ezi maka na ọ bụ ihe m bụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na mụnwa, bụ́ Onye Ozizi na Onyenwe unu, sara ụkwụ unu, unu kwesịkwara ịsa ụkwụ ibe unu.”—Jọn 13:12-14.
Ihe na-egosi na anyị dị umeala n’obi n’eziokwu . . . [bụ] ihe anyị na-eche gbasara onwe anyị nakwa ndị ọzọ
11. Olee otú Pita si gosi na ọ mụtala ịdị umeala n’obi? (1 Pita 5:5) (Kọwaakwa foto.)
11 Pita mụtara ihe n’otú Jizọs si dịrị umeala n’obi. Mgbe Jizọs laghachiri eluigwe, Pita rụrụ ọrụ ebube gwọọ otu nwoke dara ngwọrọ kemgbe a mụrụ ya. (Ọrụ 1:8, 9; 3:2, 6-8) Ìgwè mmadụ hụrụ ọrụ ebube a Pita rụrụ ma gbakọta n’ebe ahụ. (Ọrụ 3:11) Gịnị ka Pita ga-eme ugbu a? Onwe ya ọ̀ ga-ebuwe ya isi, ya etuwe ọnụ, ebe ọ bụkwanụ na ndị obodo ha ejighị ịbụ onye a ma ama na ịnọ n’ọkwá ukwu egwu egwu? O meghị otú ahụ. O weturu onwe ya ala nye Jehova na Jizọs otuto kwesịrị ha. Ọ sịrị: “Ọ bụ aha Jizọs ka anyị ji mee ka ụkwụ nwoke a unu na-ahụ, onye unu makwaara, gbasie ike. Ọ bụkwa maka na anyị kweere na aha ya na-akpa ike.” (Ọrụ 3:12-16) Okwu Pita dere n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst gbasara uru ịmụta ịdị umeala n’obi bara nwere ike ichetara anyị oge ahụ Jizọs weere ákwà e ji ehicha ahụ́ kee n’úkwù ya ma saa ụkwụ ndịozi ya.—Gụọ 1 Pita 5:5.
Mgbe Pita rụchara ọrụ ebube, o weturu onwe ya ala nye Jehova na Jizọs otuto. Anyịnwa kwa na-egosi na anyị dị umeala n’obi ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ọma n’atụghị anya ka ndị ọzọ hụ anyị ma ọ bụ ka a kwụọ anyị ụgwọ ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)
12. Olee otú anyị ga-esi na-agba mbọ na-amụta ịdị umeala n’obi ka Pita?
12 Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka Pita ma na-agbalị na-adị umeala n’obi. Cheta na ihe na-egosi na anyị dị umeala n’obi n’eziokwu abụghị naanị ihe anyị na-ekwu. Ihe Pita kwuru a sụgharịrị “ịdị umeala n’obi” gosiri na ịdị umeala n’obi pụtakwara ihe anyị na-eche gbasara onwe anyị nakwa ndị ọzọ. Anyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma n’ihi na anyị hụrụ Jehova na ndị mmadụ n’anya, ọ bụghị n’ihi na anyị chọrọ ka a na-akwanyere anyị ùgwù ma ọ bụ ka e towe anyị. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi ụtọ na-ejere Jehova na ụmụnna anyị ozi otú ọ bụla anyị nwere ike, n’agbanyeghị ma hà na-ahụ ihe anyị na-eme ma ọ bụ na ha anaghị ahụ ya, ọ na-egosi na anyị dị umeala n’obi.—Mat. 6:1-4.
‘NA-ELE IHE ANYA OTÚ DỊ MMA’
13. Kọwaa ihe ‘ile ihe anya otú dị mma’ pụtara.
13 Gịnị ka ‘ile ihe anya otú dị mma’ pụtara? (1 Pita 4:7) Onye Kraịst na-ele ihe anya otú dị mma na-eme ike ya niile ime mkpebi ga-egosi na ọ na-eche echiche ka Jehova. Ọ ma na e nweghị ihe ọ bụla dị mkpa ná ndụ ya karịa adịm ná mma ya na Jehova. Ọ na-ele onwe ya anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ ma na ọ maghị ihe niile. Ọ na-ekpekwa ekpere mgbe niile iji gosi na ọ tụkwasịrị Jehova obi.a
14. Olee otú Pita si gosi n’otu oge na ọ tụkwasịghị Jehova obi?
14 N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, ọ dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Unu niile ga-ahapụ m n’abalị a.” Pita ji obi ike sị: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile ahapụ gị, o nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị.” N’abalị ahụ, Jizọs dụrụ ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ọdụ, sị: “Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile.” (Mat. 26:31, 33, 41) Ọ bụrụ na Pita mere ihe a Jizọs dụrụ ha n’ọdụ, o nwere ike ịbụ na ọ gaara akata obi kwuo na ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs. Kama ime otú ahụ, ọ gọnahụrụ Nna ya ukwu, mechaa kwaa mmakwaara.—Mat. 26:69-75.
15. Gịnị nyeere Jizọs aka ile ihe anya otú dị mma n’abalị ikpeazụ ọ nọrọ n’ụwa?
15 Jizọs tụkwasịrị Jehova obi ya niile. Ọ bụ eziokwu na Jizọs zuru okè, o kpere ekpere ọtụtụ ugboro. O mere ka o nwee obi ike ime ihe Jehova chọrọ ka o mee. (Mat. 26:39, 42, 44; Jọn 18:4, 5) O doro anya na Pita echefughị na Jizọs kpere ekpere ọtụtụ ugboro n’abalị ikpeazụ ahụ.
16. Olee otú Pita si gosi na ọ mụtala ile ihe anya otú dị mma? (1 Pita 4:7)
16 Pita mechara mụta ịna-ekpekwu ekpere iji gosi na ọ tụkwasịrị Jehova obi. Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, o mere ka obi sie Pita na ndịozi ya ndị ọzọ ike na ha ga-enweta mmụọ nsọ ga-enyere ha aka ikwusa ozi ọma. Ma, Jizọs gwara ha ka ha nọrọ na Jeruselem chere ruo mgbe ihe a mere. (Luk 24:49; Ọrụ 1:4, 5) Gịnị ka Pita mere mgbe ahụ ọ nọ na-eche? Pita na Ndị Kraịst ibe ya nọ “na-ekpe ekpere mgbe niile.” (Ọrụ 1:13, 14) Mgbe e mechara, n’akwụkwọ ozi mbụ Pita dere, ọ gbara Ndị Kraịst ibe ya ume ka ha na-ele ihe anya otú dị mma, na-ekpekwa ekpere. (Gụọ 1 Pita 4:7.) Pita mụtara ịtụkwasị Jehova obi, ghọọkwa idé ji ọgbakọ.—Gal. 2:9.
17. Ọ bụrụgodị na anyị chere na ime ihe ụfọdụ anaghị esiri anyị ike, gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme? (Kọwaakwa foto.)
17 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-ele ihe anya otú dị mma, anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere ọtụtụ ugboro. Anyị kwesịrị ịna-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ọ bụrụgodị na anyị chere na ime ihe ụfọdụ anaghị esiri anyị ike. N’ihi ya, e nwee ihe dị ezigbo mkpa anyị chọrọ ikpebi, anyị na-ekpe ekpere rịọ Jehova ka o duzie anyị, obi esiekwa anyị ike na ọ ma ihe ga-akacha baara anyị uru.
Pita mụtara ịtụkwasị Jehova obi ma na-ekpe ekpere. Anyịnwa ga na-elekwa ihe anya otú dị mma ma anyị na-ekpe ekpere, na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka, karịchaa, mgbe e nwere ihe ndị dị ezigbo mkpa anyị chọrọ ikpebi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)b
18. Olee otú anyị ga-esi mụta ịna-echekwu echiche otú Jehova si eche?
18 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova kere anyị otú anyị ga-enwe ike ịna-akpa àgwà ka ya. (Jen. 1:26) N’eziokwu, anyị agaghị emetacha ka Jehova. (Aịza. 55:9) Ma, dị ka Pita, anyị chọrọ ịna-echekwu echiche ka Jehova, ịna-adịkwu umeala n’obi, nakwa ịna-elekwu ihe anya otú dị mma.
ABỤ NKE 30 Nna M, Chineke M na Enyi M
a Ị chọọ ịmatakwu ihe ile ihe anya otú dị mma pụtara, gaa na jw.org ma ọ bụ na JW Library® gụọ “Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara,” isiokwu bụ́ “2 Timoti 1:7—‘Chineke Enyeghị Anyị Mmụọ nke Ụjọ,’” n’ebe e dere “Na-ele ihe anya otú dị mma.”
b NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-ekpe ekpere n’obi ya mgbe ọ na-eche ka a gbaa ya ajụjụ ọnụ n’ebe ọ gara ka e wee ya n’ọrụ.