Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Mach p. 14-19
  • Mụta Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Ekwusa Ozi Ọma Ka Jizọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mụta Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Ekwusa Ozi Ọma Ka Jizọs
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • O LEKWASỊRỊ ANYA N’IME UCHE JEHOVA
  • Ọ GHỌTARA AMỤMA BAỊBỤL MA NA-EME IHE DABARA NA YA
  • Ọ TỤKWASỊRỊ JEHOVA OBI NA Ọ GA NA-AKWADO YA
  • OBI SIRI YA IKE NA E NWERE NDỊ GA-EGE NTỊ
  • Otú Ị Ga-esi Na-enwekwu Ọṅụ n’Ozi Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Ka Ịhụnanya Mee Ka Ị Na-ekwusa Ozi Ọma
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ka Mkpebi Ndị Ị Na-eme Gosi na Ị Tụkwasịrị Jehova Obi
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Mach p. 14-19

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 11

ABỤ NKE 57 Anyị Na-ezi Ụdị Mmadụ Niile Ozi Ọma

Mụta Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Ekwusa Ozi Ọma Ka Jizọs

‘Onyenwe anyị zipụrụ ha abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa n’obodo ọ bụla na ebe ọ bụla ọ ga-aga.’​—LUK 10:1.

IHE A GA-AMỤ

Ihe anọ anyị ga-amụta n’aka Jizọs ga-enyere anyị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.

1. Olee otu ihe mere ndị Jehova ji dị iche ná ndị ọzọ na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst?

OTU ihe mere ndị ohu Jehova ji dị iche ná ndị ọzọ na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst bụ na ha na-eji ịnụ ọkụ n’obia ekwusa ozi ọma. (Taị. 2:14) Ma mgbe ụfọdụ, o nwere ike ọ gaghị na-agụsi gị agụụ ike ikwusa ozi ọma. O nwere ike ịdị gị otú ọ dị otu okenye na-arụsi ọrụ ike. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ọ naghị agụ m agụụ ikwusa ozi ọma.”

2. Olee ihe ndị nwere ike ime mgbe ụfọdụ ka o siere anyị ike ịna-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma?

2 O nwere ike ịna-agụsi anyị agụụ ike ime ihe ndị ọzọ a na-eme n’ofufe Jehova karịa ikwusa ozi ọma. N’ihi gịnị? Ọ bụrụ na anyị esoro rụọ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova, gbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka, ma ọ bụ gbaa ụmụnna anyị ume, anyị nwere ike ịhụ ihe ọma si na ya pụta ozugbo, nke ga-emekwa ka obi tọọ anyị ụtọ. Ọ bụrụ na anyị na ụmụnna anyị ana-arụkọ ọrụ, obi na-atọ anyị ụtọ maka otú anyị na ha si hụ ibe anyị n’anya ma dịrị n’udo. Obi na-adịkwa anyị ụtọ n’ihi na anyị ma na ha ji ihe ndị anyị na-emere ha kpọrọ ihe. Ma, o nwere ike ịbụ na anyị na-ekwusa ozi ọma n’otu ebe kemgbe ọtụtụ afọ n’enwechaghị oké ihe ọ na-arụpụta. O nwekwara ike ịbụ na ndị mmadụ na-ajụ ozi anyị. Anyị makwa na ka ọgwụgwụ ụwa ochie a na-erukwu nso, ndị mmadụ ga na-emegidekwu ozi anyị. (Mat. 10:22) Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-anụ ọkụ n’obi ma ọ bụ ịna-anụkwu ọkụ n’obi n’ikwusa ozi ọma?

3. Olee otú ihe e kwuru na Luk 13:6-9 si gosi na Jizọs ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma?

3 Anyị ga-amụta ihe ụfọdụ gbasara iji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma ma anyị leba anya n’otú Jizọs si mee ya. Mgbe ọ nọ n’ụwa, o kweghị ka ihe ọ bụla mee ka ọ kwụsị ịnụ ọkụ n’obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na ka oge na-aga, ọ nọ na-agbakwu mbọ n’ozi ọma. (Gụọ Luk 13:6-9.) Jizọs mere ka onye na-arụ ọrụ n’ubi vaịn o ji mee ihe atụ, onye ji afọ atọ rụọ ọrụ n’ubi ahụ, mana ọ ghọtaghị mkpụrụ ọ bụla. Jizọs ji ihe dị ka afọ atọ kwusaara ndị Juu ozi ọma. Ma, ọtụtụ n’ime ha ekweghị abụ ndị na-eso ụzọ ya. Otú ahụ ike na-agwụghị onye ahụ na-arụ ọrụ n’ubi vaịn ahụ, ka ike na-agwụghị Jizọs. O nwekwanụghị mgbe ọ bịara jiri nwayọọ n’ozi ya. Kama ime otú ahụ, ọ nọ na-agbakwu mbọ inyere ndị Juu aka ịnabata ozi ya.

4. Olee ihe anọ Jizọs mere anyị ga-eleba anya?

4 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú Jizọs si jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma, karịchaa, n’ọnwa isii ikpeazụ o jere ozi ya. (Luk 10:1) Anyị mụọ ihe ndị ọ kụziri ma meekwa ihe o mere, ọ ga-enyere anyị aka ịna-anụ ọkụ n’obi taa. Ka anyị lee ụzọ ihe anọ anyị ga-amụta n’aka Jizọs: (1) Ihe kacha ya mkpa bụ ime ihe Jehova chọrọ ka o mee, (2) ọ ghọtara amụma Baịbụl ma bie ndụ dabara na ya, (3) ọ tụkwasịrị Jehova obi ka o nyere ya aka, na (4) obi siri ya ike na ụfọdụ ndị ga-ege ya ntị.

O LEKWASỊRỊ ANYA N’IME UCHE JEHOVA

5. Olee otú Jizọs si gosi na o lekwasịrị anya n’ihe Chineke chọrọ ka o mee?

5 Jizọs ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa “ozi ọma Alaeze Chineke” n’ihi na ọ ma na ọ bụ ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ. (Luk 4:43) Jizọs mere ka ikwusa ozi ọma bụrụ ihe kacha ya mkpa ná ndụ. N’oge o jechawarala ozi ya n’ụwa, o sidị “n’otu obodo ukwu banye n’ọzọ, sikwa n’otu obodo nta banye n’ọzọ, na-ezi ndị mmadụ ihe.” (Luk 13:22) Ọ zụkwuru ndị na-eso ụzọ ya ga-eso ya na-ekwusa ozi ọma.​—Luk 10:1.

6. Olee otú ikwusa ozi ọma si gbasa ọrụ ndị ọzọ anyị na-arụ? (Kọwaakwa foto.)

6 Taa kwa, ikwusa ozi ọma bụ ọrụ kacha mkpa Jehova na Jizọs chọrọ ka a rụọ. (Mat. 24:14; 28:19, 20) E nwere otú ozi ọma anyị na-ekwusa si gbasa ọrụ ndị ọzọ anyị na-arụ n’ozi Jehova. Dị ka ihe atụ, anyị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ka ndị anyị na-ekwusara ozi ọma bịa ebe ahụ fee Jehova. Anyị na-arụkwa ọrụ na Betel nakwa n’ebe ndị ọzọ iji kwado ọrụ ikwusa ozi ọma. Ihe mere anyị ji agbatara ụmụnna anyị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka abụghị naanị iji nye ha ihe ndị na-akpa ha, kama ọ bụkwa iji nyere ha aka ka ha maliteghachi ihe ndị ha na-eme n’ozi Jehova, nke ikwusa ozi ọma so na ha. Ọ bụrụ na anyị aghọta na ikwusa ozi ọma dị ezigbo mkpa, na-echetakwa na ọ bụ ya bụ ọrụ kacha mkpa Jehova chọrọ ka anyị rụọ, ọ ga-eme ka anyị na-ejechi ozi ọma anya. Otu okenye bi na Họngarị aha ya bụ János sịrị, “M na-echetara onwe m na e nweghị ihe ọzọ anyị na-eme n’ofufe Jehova na-anọchi anya ikwusa ozi ọma. Ọ bụ ya kacha mkpa.”

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nwanna so na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova. 2. Ebe nwanna ọzọ si n’ụlọ ya na-arụ ọrụ Betel. 3. Mgbe e mechara, ụmụnna abụọ ahụ na-arụ n’ozi ọma.

Taa, ikwusa ozi ọma bụ ọrụ kacha mkpa Jehova na Jizọs chọrọ ka anyị na-arụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)


7. Gịnị mere Jehova ji chọọ ka anyị ghara ịkwụsị ikwusa ozi ọma? (1 Timoti 2:3, 4)

7 Anyị ga na-anụkwu ọkụ n’obi n’ozi ọma ma ọ bụrụ na ihe gbasara ndị mmadụ ana-emetụ anyị n’obi otú o si emetụ Jehova. Ọ chọrọ ka mmadụ niile nụ ozi ọma ma mụta nke bụ́ eziokwu. (Gụọ 1 Timoti 2:3, 4.) Ọ bụ ya mere o ji na-azụ anyị ka anyị na-arụkwu ọrụ a na-azọ ndụ nke ọma. Dị ka ihe atụ, broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs tụrụ ụfọdụ aro ga-enyere anyị aka ịmalite mkparịta ụka otú ga-eme ka ndị mmadụ mụwa Baịbụl ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ọ bụrụgodị na ndị mmadụ egeghị anyị ntị ugbu a, ha nwere ike inwe ohere ige anyị ntị tupu oké mkpagbu agwụ. Ihe anyị gwara ha ugbu a nwere ike ime ka ha gbanwee n’ọdịnihu. Mana, naanị ihe nwere ike ime ka o mee bụ ma ọ bụrụ na anyị akwụsịghị ikwusa ozi ọma.

Ọ GHỌTARA AMỤMA BAỊBỤL MA NA-EME IHE DABARA NA YA

8. Olee otú ịma amụma ndị e buru na Baịbụl si nyere Jizọs aka iji oge ya mee ihe kacha mkpa?

8 Jizọs ghọtara otú amụma ndị e buru na Baịbụl ga-esi emezu. Ọ ma na ọ ga-eje ozi ya naanị afọ atọ na ọkara. (Dan. 9:26, 27) Ọ makwa amụma Baịbụl buru gbasara mgbe ọ ga-anwụ na otú ọ ga-esi anwụ. (Luk 18:31-34) Ebe ọ bụ na Jizọs ma amụma ndị a, o ji oge ya mee ihe kacha mkpa. Ihe a mere ka o jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ka o nwee ike rụchaa ọrụ e nyere ya.

9. Olee otú ịghọta amụma Baịbụl si enyere anyị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma?

9 Ịghọta amụma ndị e buru na Baịbụl ga-eme ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Anyị ma na ụwa ochie a ga-agwụ n’oge na-adịghị anya. Anyị makwa na ihe ndị na-eme n’ụwa nakwa àgwà ndị mmadụ na-akpa taa bụ ihe Baịbụl kwuru ga-eme n’oge ikpeazụ. Anyị ghọtara otú aka ọchịchị Briten na Amerịka nakwa ọchịchị Rọshịa na ndị na-akwado ha na-enurịta ibe ha si emezu amụma Baịbụl buru gbasara eze ugwu na eze ndịda “n’oge ikpeazụ” a. (Dan. 11:40) Anyị ghọtakwara na ọ bụ ọchịchị Briten na Amerịka nọchiri anya ụkwụ ihe ahụ a kpụrụ akpụ e kwuru okwu ya na Daniel 2:43-45. Amụma Baịbụl buru mekwara ka obi sie anyị ike na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ. Amụma ndị a niile na-egosi anyị na anyị bi n’oge ikpeazụ. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji oge anyị na-eme ike anyị niile n’ikwusa ozi ọma.

10. Olee ụzọ ndị ọzọ amụma ndị e buru na Baịbụl si agba anyị ume ịna-ekwusa ozi ọma?

10 Amụma Baịbụl mekwara ka anyị nwee ozi anyị chọsiri ike izi ndị ọzọ. Otu nwanna nwaanyị bi na Dọminikan Ripọblik aha ya bụ Carrie sịrị: “Nkwa ndị magburu onwe ha Jehova kwere na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu na-eme ka m na-agwa ndị ọzọ gbasara eziokwu Baịbụl.” Ọ sịkwara: “M hụ ihe ndị ha na ndị mmadụ na-alụ taa, m na-aghọta na ha kwesịrị ịmata ihe ọma ndị Jehova kwekwara hanwa ná nkwa.” Amụma Baịbụl na-agbakwa anyị ume ka ike ikwusa ozi ọma ghara ịgwụ anyị n’ihi na anyị ma na Jehova na-akwado ọrụ a. Nwanna Nwaanyị Leila bi na Họngarị sịrị: “Aịzaya 11:6-9 na-eme ka m na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma, ma ndị yiri ndị na-agaghị anabata ya. Ama m na onye ọ bụla ga-agbanweli n’enyemaka Jehova.” Otu nwanna si Zambia aha ya bụ Christopher sịkwara: “Dị ka e kwuru na Mak 13:10, ozi ọma na-agbasa n’ụwa niile. N’ihi ya, obi dị m ezigbo ụtọ na m so na-emezu amụma a.” Olee amụma ndị Baịbụl buru na-enyere gị aka ịna-ekwusa ozi ọma?

Ọ TỤKWASỊRỊ JEHOVA OBI NA Ọ GA NA-AKWADO YA

11. Gịnị mere o ji dị mkpa ka Jizọs tụkwasị Jehova obi ka o nyere ya aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma? (Luk 12:49, 53)

11 Jizọs tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-enyere ya aka ka o jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụ eziokwu na Jizọs dị akọ, ọ ma na ozi ọma Alaeze Chineke ga-akpasu ụfọdụ ndị iwe nakwa na ọtụtụ ndị ga-eji obi ha niile na-agba ihe ọ na-akụzi ụkwụ. (Gụọ Luk 12:49, 53.) Ozi ọma Jizọs kwusara mere ka ndị isi okpukpe gbalịa ọtụtụ ugboro igbu ya. (Jọn 8:59; 10:31, 39) Mana, Jizọs akwụsịghị ikwusa ozi ọma n’ihi na ọ ma na ọ bụ ihe Jehova chọrọ ka o mee. Ọ sịrị: “Anọghị m naanị m, kama Nna m nke zitere m nọnyeere m. . . . Ọ hapụghị m ka m nọrọ naanị m n’ihi na m na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.”​—Jọn 8:16, 29.

12. Olee otú Jizọs si kwadebe ndị na-eso ụzọ ya ikwusa ozi ọma mgbe a na-akpagbu ha?

12 Jizọs chetaara ndị na-eso ụzọ ya na ha kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi ka o nyere ha aka. O mere ka obi sie ha ike ọtụtụ ugboro na Jehova ga-enyere ha aka, ma mgbe a na-akpagbu ha. (Mat. 10:18-20; Luk 12:11, 12) N’ihi ya, ọ gwara ha ka ha dịrị akọ. (Mat. 10:16; Luk 10:3) Ọ gwara ha ka ha ghara ịmanye ndị na-achọghị ige ozi ọma ka ha gee ha ntị. (Luk 10:10, 11) Ọ gwakwara ha ka ha gbaga ebe ọzọ ma a kpagbuwe ha. (Mat. 10:23) Ọ bụ eziokwu na Jizọs na-anụ ọkụ n’obi, tụkwasịkwa Jehova obi, ọ gbalịrị na-agbara nsogbu ọsọ mgbe ọ ga-emeli ya.​—Jọn 11:53, 54.

13. Gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike na Jehova ga-enyere gị aka?

13 Enyemaka Jehova dị anyị mkpa ka anyị nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma ma a na-emegide anyị taa. (Mkpu. 12:17) Gịnị mere obi kwesịrị iji esi gị ike na Jehova ga-anọnyere gị? Ka anyị leba anya n’ekpere Jizọs kpere, nke e dere na Jọn isi 17. Jizọs rịọrọ Jehova ka o chebe ndịozi ya. Jehova zakwara ekpere ahụ. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kọrọ otú Jehova si nyere ndịozi Jizọs aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na a na-akpagbu ha. Jizọs rịọkwara Jehova n’ekpere ka o chebe ndị ga-anabata ozi ahụ ndịozi ya kwusara. Gịnwa sokwa na ha. Jehova akwụsịbeghị ịza ekpere Jizọs ahụ. Ọ ga-enyere gị aka otú ahụ o nyeere ndịozi Jizọs.​—Jọn 17:11, 15, 20.

14. Olee otú anyị si mara na anyị ga-ejili ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma? (Kọwaakwa foto.)

14 Ọ bụrụgodị na o sikwuoro anyị ike iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ka ọgwụgwụ na-eru nso, Jehova ga-enyere anyị aka. (Luk 21:12-15) Ka anyị mee ka Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya. Ka anyị na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma, mana ka anyị ghara ịga ka anyị na ha rụwa ụka. N’obodo ndị a machiri ụmụnna anyị ikwusa ozi ọma, ha ka na-ekwusadị ozi ọma n’ihi na ha tụkwasịrị Jehova obi, ọ bụghị onwe ha. Jehova nyere ndị ohu ya ike n’oge ndịozi. Ọ na-enyekwa anyị ike taa ka anyị “kwusaa ozi ọma ahụ ruo n’isi.” (2 Tim. 4:17) Obi kwesịrị isi gị ike na ọ bụrụ na ị tụkwasị Jehova obi, ị ga-enwe ike iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.

Ọ bụrụgodị na a machie ọrụ anyị iwu, ụmụnna anyị na-eji akọ chọpụta otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)b


OBI SIRI YA IKE NA E NWERE NDỊ GA-EGE NTỊ

15. Gịnị gosiri na obi siri Jizọs ike na e nwere ndị ga-ege ntị?

15 Obi siri Jizọs ike na e nwere ndị ga-ege ntị n’ozi ọma. Ihe a nyeere ya aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ná ngwụcha afọ 30 Oge Ndị Kraịst, Jizọs hụrụ na ọtụtụ ndị dị njikere ịnabata ozi ya. O ji ha tụnyere ihe a kụrụ n’ubi chara acha maka owuwe ihe ubi. (Jọn 4:35) Mgbe ihe dị ka otu afọ gachara, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ihe a ga-ewe n’ubi hiri nne.” (Mat. 9:37, 38) Mgbe e mechara, o kwukwara, sị: “Ihe a ga-ewe n’ubi hiri nne . . . Na-arịọnụ onye nwe ubi ahụ ka o zite ndị ọrụ n’ubi ya.” (Luk 10:2) Obi siri Jizọs ike mgbe niile na e nwere ndị ga-ege ntị n’ozi ọma ahụ ma ghọọ ndị na-eso ụzọ ya. Obi tọkwara ya ụtọ mgbe ha mere otú ahụ.​—Luk 10:21.

16. Olee otú ihe atụ ndị Jizọs mere si mee ka ndị na-eso ụzọ ya jiri ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe? (Luk 13:18-21) (Kọwaakwa foto.)

16 Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Ọ gwara ha na ozi ọma ha na-ekwusa na-arụpụta ihe ndị magburu onwe ha. Di ka ihe atụ, ka anyị lee ihe atụ abụọ o meere ha. (Gụọ Luk 13:18-21.) N’otu ihe atụ Jizọs mere, o ji ozi ọma Alaeze Chineke tụnyere mkpụrụ osisi mọstad nke na-adị ezigbo ntakịrị ma mechaa too, ghọọ nnukwu osisi. Ihe a pụtara na ọtụtụ ndị ga-anabata ozi ọma. E nweghịkwa ihe ọ bụla ga-egbochi ya. N’ihe atụ ọzọ o mere, o ji Alaeze Chineke tụnyere ihe iko achịcha. O ji ya kụziere ha na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ọtụtụ ebe n’ụwa niile, mee ka ndị mmadụ na-agbanwe, ọ bụ eziokwu na e nwere ike ndị ọzọ agaghị ahụ mgbanwe ahụ ozugbo. N’ihi ya, Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ịghọta na ozi ọma ha na-ekwusa ga-enyere ọtụtụ ndị aka.

Ebe ụmụnna nwaanyị abụọ kwụ n’akụkụ ihe nkwagharị e ji ekwusa ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo. Ọtụtụ ndị na-agafe akwụsịghị.

Dị ka Jizọs, obi siri anyị ike na ụfọdụ ndị ga-ege ntị n’ozi ọma anyị ma ghọọ ndị na-eso ụzọ ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)


17. Olee ihe ndị mere obi ji kwesị isi anyị ike na ọtụtụ ndị ka ga-anụ ozi anyị ma chegharịa?

17 Ọ bụrụ na anyị echee gbasara otú ozi ọma a na-ezi n’ụwa niile si enyere ọtụtụ ndị aka, ọ na-agba anyị ume ka anyị ghara ịkwụsị ikwusa ya. N’afọ ọ bụla, ọtụtụ nde ndị nwere mmasị na-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị na ha ana-amụkwa Baịbụl. Ọtụtụ puku mmadụ na-eme baptizim ma sorokwa anyị na-ekwusa ozi ọma. Anyị amaghị mmadụ ole ga-emecha chegharịa. Mana, anyị ma na Jehova na-achịkọta oké ìgwè mmadụ ndị ga-agafere oké mkpagbu na-abịanụ. (Mkpu. 7:9, 14) Obi siri Jehova, bụ́ Onye nwe ubi ahụ, ike na ọtụtụ ndị ka ga-anụ ozi ahụ ma chegharịa. N’ihi ya, ike ikwusa ozi ọma ekwesịghị ịgwụ anyị.

18. Gịnị ka anyị chọrọ ka ndị mmadụ chọpụta gbasara anyị?

18 Ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma kemgbe ụwa. Mgbe ndị mmadụ hụrụ otú ọnụ si kaa ndịozi Jizọs, ‘ha chetara na ha na Jizọs na-anọbu.’ (Ọrụ 4:13) Ka ndị mmadụ na-ahụ ka anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, anyị chọrọ ka ha chọpụta na anyị na-eme ka Jizọs.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-ANỤ ỌKỤ N’OBI KA JIZỌS . . .

  • ma anyị were ozi ọma otú o si were ya?

  • ma anyị tụkwasị Jehova obi?

  • ma obi sie anyị ike na ndị mmadụ ga-anabata ozi ọma?

ABỤ NKE 58 Anyị Na-achọ Ndị Udo

a NKỌWAKWU: N’isiokwu a, “ịnụ ọkụ n’obi” pụtara otú o si enu Ndị Kraịst enu n’obi na otú o si agụsi ha agụụ ike ife Jehova.

b NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna ji akọ na-ezi otu nwoke ozi ọma n’ebe a na-ere mmanụ ụgbọala.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya