ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 17
ABỤ NKE 99 Anyị Bụ Ìgwè Ụmụnna
E Nweghị Mgbe Anyị Nọ Naanị Anyị
‘M ga-enyere gị aka.’—AỊZA. 41:10.
IHE A GA-AMỤ
Ụzọ anọ Jehova si elekọta anyị.
1-2. (a) Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na anyị anọghị naanị anyị ma nsogbu bịara anyị? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?
Ọ BỤRỤ na ezigbo nsogbu abịara anyị, o nwere ike ịdị anyị ka ànyị nọ n’ime oké ọhịa naanị anyị n’amaghị otú anyị ga-esi pụta. Ma, anyị anọghị naanị anyị. Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya na-ahụ nsogbu anyị nọ na ya. O kwekwara nkwa na ọ ga-enyere anyị aka imeri ya. Jehova ji obiọma na-ekwe ndị ji obi ha na-efe ya nkwa, sị: ‘M ga-enyere unu aka.’—Aịza. 41:10.
2 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ anọ Jehova si enyere anyị aka. (1) Ọ na-eduzi anyị, (2) na-enye anyị ihe ndị na-akpa anyị, (3) na-echebe anyị, (4) na-akasikwa anyị obi. Jehova na-eme ka obi sie anyị ike na n’agbanyeghị nsogbu bịaara anyị, o mekataghị chefuo anyị. Ọ gaghị agbakụta anyị azụ. N’ihi ya, o nweghị mgbe anyị nọ naanị anyị.
JEHOVA NA-EDU ANYỊ
3-4. Olee otú Jehova si edu anyị? (Abụ Ọma 48:14)
3 Gụọ Abụ Ọma 48:14. Jehova anaghị atụ anya ka anyị na-edu onwe anyị. Olee otú o si eduzi ndị ji obi ha niile na-efe ya taa? Otu ụzọ o si eme ya bụ n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. (Ọma 119:105) Jehova si na Baịbụl na-enyere anyị aka ime mkpebi na ịmụta àgwà ndị ga-eme ka anyị na-enwekwu obi ụtọ ugbu a nakwa inwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.a Dị ka ihe atụ, ọ na-akụziri anyị ka anyị ghara ịna-ebu iwe n’obi, ka anyị na-ekwu eziokwu n’ihe niile anyị na-eme, nakwa ka anyị si n’obi anyị na-ahụ ndị ọzọ n’anya. (Ọma 37:8; Hib. 13:18; 1 Pita 1:22) Ọ bụrụ na anyị ana-akpa àgwà ọma ndị a, anyị ga-abụkwu ezigbo ndị nne na nna, ezigbo di ma ọ bụ nwunye, nakwa ezigbo ndị enyi.
4 Na Baịbụl, Jehova gwakwara anyị gbasara ndị ụdị nsogbu na-abịara anyị bịaara, nakwa ndị obi dị otú ọ dị anyị. (1 Kọr. 10:13; Jems 5:17) Ọ bụrụ na anyị agụọ akụkọ gbasara ndị a, na-emekwa ihe anyị mụtara n’aka ha, e nwere ọ dịkarịa ala ụzọ abụọ ọ ga-esi baara anyị uru. Nke mbụ, anyị ga-achọpụta na ọ bụghị naanị anyị ka ụdị nsogbu ahụ na-abịara, na e nweela ndị ọzọ ọ bịaara, Jehova enyere ha aka idi ya. (1 Pita 5:9) Nke abụọ, anyị ga-amụtakwu otú anyị ga-esi die nsogbu ahụ ma ka na-enwe ọṅụ.—Rom 15:4.
5. Olee ndị Jehova ji na-edu anyị ná nzukọ ya?
5 Jehova hazikwara ka ụmụnna anyị na-edu anyị.b Dị ka ihe atụ, ndị nlekọta sekit na-aga n’ọgbakọ dị iche iche na-agba anyị ume. Okwu ndị ha na-ekwu na-eme ka okwukwe anyị sie ike, na-enyekwara anyị aka ịna-adị n’otu. (Ọrụ 15:40–16:5) Ndị okenye na-agbasikwa mbọ ike inyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ka ya na Jehova na-adị ná mma. (1 Pita 5:2, 3) Ndị nne na nna na-edu ụmụ ha ka ha na Jehova na-adị ná mma, na-enyekwara ha aka ịna-eche echiche nke ọma nakwa ịna-amụta àgwà ndị dị mma. (Ilu 22:6) Ụmụnna nwaanyị ma nke a na-akọ na-enyekwara ụmụnna nwaanyị ka na-eto eto aka. Otú ha si eme ya bụ ịna-akpa àgwà dị mma, ịna-enye ha ndụmọdụ ga-abara ha uru, nakwa ịna-agba ha ume.—Taị. 2:3-5.
6. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka otú Jehova si edu anyị baara anyị uru?
6 Jehova enyela anyị ihe niile ga na-eduzi anyị ka anyị nwee ike ịna-eme mkpebi dị mma, na-enwekwa obi ụtọ ná ndụ. Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị a Jehova nyere anyị? Ilu 3:5, 6 sịrị: “Jiri obi gị niile tụkwasị Jehova obi, atụkwasịla amamihe gị obi.” Anyị mee otú ahụ, ‘ọ ga-eme ka ihe gaziere anyị,’ ya bụ, ọ ga-enyere anyị aka izere ọtụtụ nsogbu, anyị ana-enwekwukwa obi ụtọ. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova ma anyị nke ọma, hụkwa anyị n’anya nke na ọ na-enye onye ọ bụla n’ime anyị ndụmọdụ dị ya mkpa.—Ọma 32:8.
JEHOVA NA-EGBORO ANYỊ MKPA ANYỊ
7. Olee ụzọ ndị Jehova si egboro anyị mkpa anyị? (Ndị Filipaị 4:19)
7 Gụọ Ndị Filipaị 4:19. Ọ bụghị naanị na Jehova na-edu anyị ka anyị na ya na-adị ná mma, ọ na-agọzikwa mbọ anyị na-agba inweta nri, uwe, na ebe anyị ga-ebi. (Mat. 6:33; 2 Tesa. 3:12) Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị njọ ịna-eche gbasara ihe ndị dị anyị mkpa, ma Jehova gbara anyị ume ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị gbasara ha. (Mat. 6:25) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Nna anyị emekataghị hapụ ndị ji obi ha na-efe ya n’oge ihe siiri ha ike. (Mat. 6:8; Hib. 13:5) Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-egboro anyị mkpa anyị otú o kwere anyị ná nkwa.
8. Gịnị ka Jehova meere Devid?
8 Chee gbasara otú Jehova si nyere Devid aka. N’afọ ndị ihe siiri Devid ike ọ na-agba ọsọ n’ihi Eze Sọl, Jehova nyere ya na ndị so ya ihe ndị ga-eme ka ha na-adị ndụ. Mgbe Devid na-eche gbasara otú Jehova si lekọta ya n’oge ahụ, ọ sịrị: “E nwere mgbe m bụ nwata. Ma ugbu a, abụzi m agadi. Ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ezi omume ọ bụla, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.” (Ọma 37:25) Ọ ga-abụ na dị ka Devid, ị hụla otú Jehova si na-egboro gị ma ọ bụ ụmụnna gị mkpa n’oge ihe siri ike.
9. Olee otú Jehova si egboro ndị ya mkpa ha taa n’oge e nwere ọdachi? (Kọwaakwa foto.)
9 Jehova na-egbokwara ndị ya mkpa ha n’oge e nwere ọdachi. Dị ka ihe atụ, mgbe ụnwụ nri dara n’oge ndịozi, Ndị Kraịst si n’ebe dị iche iche ziteere ụmụnna ha ihe ndị dị ha mkpa. (Ọrụ 11:27-30; Rom 15:25, 26) Ndị Kraịst taa na-enyekwara ụmụnna ha nọ ná nsogbu aka. E nwee ọdachi, Jehova na-eme ka ndị ya nye ụmụnna ndị bi n’ebe ihe ahụ mere ihe ndị dị ha mkpa, dị ka nri, mmiri, uwe, na ọgwụ. O nwekwara ndị na-enye aka arụzi ụlọ ndị mmadụ nakwa Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị Jehova anaghịkwa egbu oge ịkasi ndị ụlọ ha mebisịrị ma ọ bụ ndị mmadụ nwụnahụrụ obi ma jiri Baịbụl gbaa ha ume.c
Olee otú Jehova si akasi anyị obi n’oge e nwere ọdachi? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)e
10-11. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Borys?
10 Jehova na-enyekwa ndị na-anaghị efe ya ugbu a ihe ndị dị ha mkpa. Anyị na-eme ka Jehova ma na-achọ ụzọ ndị anyị si emere ndị na-anaghị efe ya ihe ọma. (Gal. 6:10) Ọtụtụ mgbe, anyị mee ya, ọ na-eme ka ha chọọ ịmụtakwu gbasara Jehova. Ka anyị kwuo gbasara otu onyeisi ụlọ akwụkwọ aha ya bụ Borys bi na Yukren. Borys abụghị Onyeàmà Jehova. Ma, ọ na-eji obiọma emeso ụmụ akwụkwọ ya bụ́ ndị Jehova ihe, na-akwanyekwara ihe ha kweere ùgwù. Mgbe Borys kpebiri ịkwapụ ebe o bibu a na-alụ agha ma kwaga ebe a na-anaghị alụ agha n’obodo ahụ, ụmụnna anyị nyeere ya aka. Mgbe e mechara, Borys gara Ncheta Ọnwụ Jizọs. Mgbe ọ na-eche gbasara ihe niile ụmụnna meere ya, ọ sịrị: “Ndịàmà Jehova meere m ọtụtụ ihe ọma, lekọtakwa m. M na-ekele ha.”
11 Anyị niile nwekwara ike ịna-eme ka Nna anyị nke eluigwe bụ́ onye obi ebere. Otú anyị ga-esi na-eme ya bụ ịna-egosi ndị ihe na-esiri ike na anyị hụrụ ha n’anya ma hà bụ ụmụnna anyị ma ọ bụ na ha abụghị. (Luk 6:31, 36) Anyị na-enwe olileanya na ịhụnanya anyị gosiri ha ga-eme ka ha chọọ ịmụta gbasara Jehova ma malite ife ya. (1 Pita 2:12) Ma hà malitere ife ya ma ọ bụ na ha amaliteghị ife ya, anyị ga-enwe ezigbo obi ụtọ n’ihi na “a na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe.”—Ọrụ 20:35.
JEHOVA NA-ECHEBE ANYỊ
12. Olee ụdị nchebe Jehova kwere nkwa ichebe ndị ya? (Abụ Ọma 91:1, 2, 14)
12 Gụọ Abụ Ọma 91:1, 2, 14. Taa, Jehova kwere nkwa na ọ ga-echebe ndị ya ka ihe ọ bụla ghara ịkpa adịm ná mma ha na ya aka. O mekataghị kwe ka Ekwensu mee ka ndị ya kwụsị ife ya otú ọ chọrọ. (Jọn 17:15) O ruokwa n’oge oké mkpagbu, obi ga-esi anyị ezigbo ike na Jehova ga-enyere anyị aka ka okwukwe anyị sie ike, napụtakwa anyị otú o kwere ná nkwa.—Mkpu. 7:9, 14.
13. Olee ụzọ ndị Jehova si na-echebe anyị n’otu n’otu?
13 Olee otú Jehova si echebe anyị n’otu n’otu? Jehova na-eji Okwu ya enyere anyị aka ịmata ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Hib. 5:14) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị anyị mụtara na Baịbụl, anyị na Jehova ga-adị ná mma, anyị ana-emekwa mkpebi ndị dị mma ga-enyere anyị aka ịna-enwekwu obi ụtọ, ahụ́ ana-agbasikwu anyị ike. (Ọma 91:4) Jehova sikwa n’ọgbakọ ya na-enyere anyị aka ka anyị na-erubere ya isi. (Aịza. 32:1, 2) Ụmụnna nọ n’ọgbakọ hụrụ Jehova n’anya, na-erubere ya isi. Anyị na ha ịna-anọkọ n’ọmụmụ ihe, n’ozi ọma, nakwa ma anyị na-atụrụ ndụ na-agba anyị ume, na-enyekwara anyị aka izere ihe ọjọọ.—Ilu 13:20.
14. (a) Gịnị mere Chineke ji ekwe ka ọnwụnwa bịara anyị? (b) Olee ihe Abụ Ọma 9:10 mere ka obi sie anyị ike na ya? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)
14 N’oge gara aga, Jehova chebere ndị ya mgbe ụfọdụ ka ihe ọ bụla ghara ime ha. Ma, o meghị otú ahụ mgbe niile. Mgbe ụfọdụ, ‘ọdachi na-abịara anyị n’oge a na-atụghị anya ya.’ (Ekli. 9:11) Jehova kwere ka a kpagbuo ụfọdụ ndị ohu ya ma gbuo ha iji gosi na Ekwensu bụ onye ụgha. (Job 2:4-6; Mat. 23:34) Jehova nwekwara ike ikwe ka ụdị ihe ahụ mee taa. Ọ bụ eziokwu na e nwere ike Jehova agaghị ewepụ ọnwụnwa na-abịara anyị, ma obi kwesịrị isi anyị ike na o mekataghị hapụ ndị hụrụ ya n’anya.d—Ọma 9:10.
JEHOVA NA-AKASI ANYỊ OBI
15. Olee otú ekpere, Okwu Chineke, na ụmụnna anyị si akasi anyị obi? (2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4)
15 Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4. Mgbe ụfọdụ, anyị na-eru uju, na-echegbu onwe anyị ma ọ bụkwanụ obi ana-ajọ anyị njọ. O nwere ike ịbụ na o nwere ihe mere ka obi na-ajọ gị njọ ugbu a, ya adị gị ka ị̀ nọ naanị gị. È nwere onye na-aghọta otú ọ dị gị? Jehova na-aghọta. Ihe na-ewute anyị na-ewute ya. “Ọ na-akasikwa anyị obi n’ọnwụnwa niile na-abịara anyị.” Olee otú o si eme ya? Anyị kpee ekpere rịọ ya ka o nyere anyị aka, ọ na-enye anyị “udo Chineke na-enye, nke karịrị nghọta mmadụ.” (Fil. 4:6, 7) Anyị gụọkwa Baịbụl, ọ na-akasi anyị obi. Na Baịbụl, Jehova na-agwa anyị na ọ hụrụ anyị n’anya, na-akụziri anyị otú anyị ga-esi mara ihe, na-emekwa ka anyị nwee olileanya. A na-akasikwa anyị obi n’ọmụmụ ihe. N’ebe ahụ, anyị na-esi na Baịbụl amụta ihe ndị ga-agba anyị ume, anyị na ụmụnna anyị ndị hụrụ anyị n’anya na-anọrịkwa.
16. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nathan na Priscilla nwunye ya?
16 Iji gosi otú Jehova si jiri Baịbụl na-akasi anyị obi, na-agbakwa anyị ume, ka anyị leba anya n’akụkọ Nwanna Nathan na Priscilla nwunye ya, ndị bi n’Amerịka. Afọ ole na ole gara aga, ha kpebiri ịkwaga n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Nwanna Nathan sịrị: “Anyị tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-agọzi mbọ anyị na-agba.” Ma mgbe ha kwagara ebe ahụ, ọrịa na ihe isi ike kpara ha aka ọjọọ. Ha mechara laghachi ebe ha si, ihe aka na-esikwara ha ike. Nwanna Nathan sịrị: “M nọ na-eche ihe mere na Jehova agọzibeghị anyị otú anyị chere na ọ ga-eme. M mechadịrị chewe ma è nwere ihe ọjọọ m mere.” Ma ka oge na-aga, ha mechara chọpụta na Jehova ahapụghị ha n’oge ihe siiri ha ike. Nwanna Nathan sịrị: “N’oge ndị ahụ ihe siri ezigbo ike, Baịbụl bịara dị ka ezigbo enyi na-agba anyị ume ma na-edu anyị. Ilekwasị anya n’otú Jehova si nyere anyị aka idi nsogbu ahụ kama ilekwasị anya ná nsogbu ahụ mere ka obi sie anyị ike na Jehova ga na-enyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị n’ọdịnihu.”
17. Olee otú Jehova si kasie Nwanna Nwaanyị Helga obi? (Kọwaakwa foto.)
17 Ụmụnna anyị nwekwara ike ịkasi anyị obi. Olee otú ha si eme ya? Ka anyị kwuo gbasara Nwanna Nwaanyị Helga bi na Họngarị. Ruo ọtụtụ afọ, ọtụtụ nsogbu bịaara ya, ya ana-echegbu onwe ya, cheekwa na o nweghị uru ọ bara. Ma, mgbe o chetara afọ ndị ahụ, ọ chọpụtara na Jehova ji ụmụnna nọ n’ọgbakọ kasie ya obi. Ọ sịrị: “Jehova na-enyere m aka mgbe niile ma ọ chọpụta na ọrụ m, ilekọta nwa m ahụ́ na-adịghị, na nsogbu ndị ọzọ emeela ka ike gwụ m. Kwa ụbọchị, kemgbe afọ iri atọ, ọ na-akasi m obi otú o kwere m ná nkwa. Ọtụtụ mgbe, ọ na-eji okwu ọma ndị ọzọ na-agwa m agba m ume. M na-enwetakarị ozi ma ọ bụ kaadị e dere ihe, ma ọ bụ a jaa m mma n’oge ndị ọ kacha dịrị m mkpa.”
Olee otú Jehova nwere ike isi jiri gị kasie ndị ọzọ obi? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)
18. Olee otú anyị nwere ike isi na-akasi ndị ọzọ obi?
18 Anyị nwere ike ịna-akasi ndị ọzọ obi ka Jehova. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Anyị nwere ike iwetu obi gee ha ntị, gwa ha okwu ga-akasi ha obi, meekwa ihe ndị ọzọ ga-abara ha uru. (Ilu 3:27) Anyị na-agbalị ịkasi ndị na-ata ahụhụ obi, ma ndị na-efewebeghị Jehova. Ọ bụrụ na ndị agbata obi anyị na-eru uju, na-arịa ọrịa, ma ọ bụ na-echegbu onwe ha, anyị na-aga eleta ha, gee ha ntị, gụọkwara ha amaokwu Baịbụl ndị ga-agba ha ume. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka Jehova, bụ́ “Chineke nke na-akasi ndị mmadụ obi n’ụdị ọnọdụ niile ha nọ,” anyị nwere ike inyere nwanna aka idi nsogbu ndị bịaara ya, nyekwara ndị na-anaghị efe Jehova ugbu a aka ka ha chọọ ịmụta gbasara ya.—Mat. 5:16.
JEHOVA GA-ENYERE ANYỊ AKA MGBE NIILE
19. Gịnị ka Jehova na-emere anyị? Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka ya?
19 Ihe gbasara ndị niile hụrụ Jehova n’anya na-emetụ ya n’obi nke ukwuu. Ọ naghị ahapụ anyị ma ihe siere anyị ike. Otú ahụ nne ma ọ bụ nna hụrụ nwa ya n’anya si elekọta ya ka Jehova si elekọta ndị niile ji obi ha na-efe ya. Ọ na-edu anyị, na-egboro anyị mkpa anyị, na-echebe anyị, na-akasikwa anyị obi. Anyị na-eme ka Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya ma ọ bụrụ na anyị ana-akwado ndị ọzọ, na-agbakwa ha ume n’oge nsogbu bịaara ha. Ọ bụ eziokwu na nsogbu nwere ike ịbịara anyị, obi nwekwara ike ịgbawa anyị, ma ka obi sie anyị ike na Jehova nọnyeere anyị. O kwere nkwa, sị: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.” (Aịza. 41:10) Nkwa a na-eme ka obi sie anyị ezigbo ike na e nweghị mgbe anyị nọ naanị anyị.
ABỤ NKE 100 Na-anabata Ha nke Ọma
a Gụọ isiokwu bụ́ “Mee Mkpebi Ndị Na-ewetara Chineke Otuto,” nke gbara n’Ụlọ Nche Eprel 15, 2011.
b Gụọ paragraf nke 11 ruo na nke 14 n’isiokwu bụ́ “Na-eso Nduzi Jehova.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Febụwarị 2024.
c I nwekwara ike ịhụ akụkọ ndị mere n’oge na-adịbeghị anya na jw.org ma i denye “ịgbata ọsọ enyemaka” n’ebe a na-achọ ihe.
d Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche Febụwarị 2017.
e NKỌWA FOTO: Ebe a na-enye ụmụnna nọ na Malawi ihe e ji gbatara ha ọsọ enyemaka mgbe ọdachi na-emere onwe ya mechara n’obodo ahụ, e jikwa Baịbụl na-agba ha ume.