IHE I NWERE IKE ỊMỤ
Kwadebe Obi Gị
Anyị mụwa Baịbụl, anyị chọrọ ka ihe anyị na-amụta banyere Jehova na-eru anyị n’obi. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka Ezra, onye “kwadebere obi ya ịmụ Iwu Jehova.” (Ezra 7:10) Olee otú anyị nwere ike isi kwadebe obi anyị?
Kpee ekpere. Tupu gị amalite ịmụ ihe, kpee ekpere rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịghọta ihe ị na-amụ nakwa ime ya eme.—Ọma 119:18, 34.
Dịrị umeala n’obi. Chineke na-ezochiri ndị mpako eziokwu dị n’Okwu ya, ya bụ, ndị chere na e kwesịghị inyere ha aka ịghọta Baịbụl. (Luk 10:21) Ihe ọzọ bụ na i kwesịghị ịna-eme nchọnchọ ka i were ya gosi ndị ọzọ ihe ndị ị ma gbasara Baịbụl. Gbanweekwa otú i si eche echiche ma ọ bụrụ na ọ dabaghị n’ihe Chineke chọrọ.
Gee otu abụ Alaeze. Egwú na-eru anyị n’obi, na-akwadebekwa anyị maka ife Chineke. Ige abụ Alaeze ma ị chọọ ịmalite ịmụ ihe nwere ike inyere gị aka ịkwadebe obi gị.