ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 27
ABỤ NKE 79 Na-ezi Ha Ihe Ka Okwukwe Ha Sie Ike
Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ka Ha Kpebie Ife Jehova
“Meenụ ka okwukwe unu sie ike . . . Siekwanụ ezigbo ike.”—1 KỌR. 16:13.
IHE A GA-AMỤ
Otú anyị ga-esi enyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka inwe okwukwe ma kata obi ka ha nwee ike ịgbanwe ihe ndị ha kwesịrị ịgbanwe ma fewe Jehova.
1-2. (a) Gịnị mere ụfọdụ ndị a na-amụrụ Baịbụl ji egbu oge ikpebi ifewe Jehova? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
È NWERE ihe ndị nọ na-eme gị obi abụọ mgbe ị chọrọ ịghọ Onyeàmà Jehova? O nwere ike ịbụ na ụjọ nọ na-atụ gị na ndị ọrụ ibe gị, ndị enyi gị, ma ọ bụ ndị ezinụlọ gị ga-emegidewe gị. O nwekwara ike ịbụ na i chere na ị gaghị emeli ihe Chineke chọrọ ka ị na-eme. E nwee mgbe ọ dị gị otú ahụ, i nwere ike ịghọta otú obi dị onye ị na-amụrụ Baịbụl ọ na-esiri ike ikpebi ịbụ Onyeàmà Jehova.
2 Jizọs ma na ụdị ụjọ ahụ nwere ike ime ka o siere mmadụ ike ife Jehova. (Mat. 13:20-22) Ma, ike agwụghị ya inyere ndị gburu oge isowe ya aka. Kama ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi nyere ụdị ndị ahụ aka (1) ịchọpụta ihe na-egbochi ha ife Jehova, (2) ịhụkwu Jehova n’anya, (3) iwere ife Jehova ka ihe kacha mkpa, na (4) ịma ihe ha ga-eme ma ndị mmadụ megidewe ha. Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ma anyị jiri akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi na-enyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka ikpebi ife Jehova?
NYERE ONYE Ị NA-AMỤRỤ BAỊBỤL AKA ỊCHỌPỤTA IHE NDỊ NA-EGBOCHI YA IKPEBI IFE JEHOVA
3. Gịnị ka o nwere ike ịbụ ya gbochiri Nikọdimọs ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs?
3 Nikọdimọs so ná ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị ndị Juu. Mana, e nwere ihe mere ka o siere ya ike ikpebi ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs. Naanị n’ihe dị ka ọnwa isii Jizọs bidochara ozi ya n’ụwa, Nikọdimọs ghọtara na Jizọs bụ Mezaya Chineke zitere. (Jọn 3:1, 2) Ma, Nikọdimọs kpebiri izoro ezoro gaa hụ Jizọs n’ihi na ọ “na-atụ ndị Juu egwu.” (Jọn 7:13; 12:42) O nwere ike ịbụ na ọ na-eche na e nwere ọtụtụ ihe ga-efunahụ ya ma ọ ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs.a
4. Olee otú Jizọs si nyere Nikọdimọs aka ịghọta ihe Chineke chọrọ ka o mee?
4 Nikọdimọs ma Iwu Mosis nke ọma. Ma, e kwesịrị inyere ya aka ka ọ ghọta ihe Jehova chọrọ ka o mee. Olee otú Jizọs si nyere ya aka? Jizọs dị njikere iwepụtara Nikọdimọs oge, ọ bụrụgodị n’ime abalị. Jizọs gwakwara Nikọdimọs hoo haa ihe o kwesịrị ime ka o nwee ike ịghọ onye na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị ya na o kwesịrị ichegharị ná mmehie ya, mee baptizim n’ime mmiri, nweekwa okwukwe n’Ọkpara Chineke.—Jọn 3:5, 14-21.
5. Olee otú anyị nwere ike isi nyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịchọpụta ihe na-egbochi ya ikpebi ife Jehova?
5 Ọ bụrụgodị na onye a na-amụrụ ihe ma Baịbụl nke ọma, o nwere ike ịdị mkpa ka e nyere ya aka ka ọ chọpụta ihe ndị na-egbochi ya ikpebi ife Jehova. Ọrụ ọ na-arụ ma ọ bụ mmegide ndị ezinụlọ ya na-emegide ya nwere ike ime ka o siere ya ike ikpebi ife Jehova. N’ihi ya, wepụta oge nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka. I nwere ike ịkpọ ya ka ọ bịa rie nri n’ụlọ gị ma ọ bụ ka gị na ya soro kpagharịa. Ihe a nwere ike ime ka ọ dịrị ya mfe ịgwa gị ihe bụ́ nsogbu ya. Gbaa ya ume ka ọ gbanwee ihe ndị o kwesịrị ịgbanwe iji gosi na ọ hụrụ Jehova n’anya, ọ bụghị iji mee gị obi ụtọ.
6. Olee otú i nwere ike isi nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ka obi sie ya ike ime ihe ndị ọ na-amụta? (1 Ndị Kọrịnt 16:13)
6 Ọ bụrụ na obi esie onye anyị na-amụrụ Baịbụl ike na Jehova ga-enyere ya aka ịna-ebi ndụ otú ọ chọrọ, obi ga-esi ya ike ịna-eme ihe ndị ọ na-amụta. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 16:13.) E nwere ike iji onye na-akụziri mmadụ Baịbụl tụnyere onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ. I nwere ike icheta ihe ndị mere n’oge ị bụ nwa akwụkwọ. Olee ụdị onye nkụzi ihe ya kacha amasị gị? O nwere ike ịbụ onye nkụzi nke na-emeda obi enyere gị aka ịmata na ị ga-emeli ihe i kwesịrị ime. Otú ahụ ka ọ dịkwa ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ihe ezigbo onye na-akụzi Okwu Chineke na-eme abụghị naanị ịkụziri mmadụ ihe o kwesịrị ime, kama, ọ na-emekwa ka obi sie onye ahụ ike na Jehova ga-enyere ya aka ịgbanwe ihe ndị o kwesịrị ịgbanwe ná ndụ ya. Olee otú i nwere ike isi eme ya?
NYERE YA AKA ỊHỤKWU JEHOVA N’ANYA
7. Olee otú Jizọs si nyere ndị na-ege ya ntị aka ịhụkwu Jehova n’anya?
7 Jizọs ma na ọ ga-adịrị ndị na-eso ụzọ ya mfe ime ihe ha na-amụta ma ọ bụrụ na ha ahụ Chineke n’anya. Ọtụtụ mgbe, ọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe ga-eme ka ha hụkwuo Nna ha nke eluigwe n’anya. Dị ka ihe atụ, o ji Jehova tụnyere nwoke na-enye ụmụ ya ihe dị mma. (Mat. 7:9-11) O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị na-ege Jizọs ntị enweghị nna hụrụ ha n’anya otú ahụ. Chegodịnụ otú obi dị ha mgbe Jizọs mere ihe atụ otu nwoke nweere nwa ya biri ndụ ọjọọ ọmịiko mgbe ọ lọtara. Ha si n’akụkọ ahụ mụta na Jehova na-enwere ụmụ ya nọ n’ụwa ọmịiko.—Luk 15:20-24.
8. Olee otú i nwere ike isi nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ịhụkwu Jehova n’anya?
8 Gịnwa nwekwara ike inyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ka ọ hụkwuo Jehova n’anya ma ọ bụrụ na ị na-akọrọ ya àgwà ọma ndị Jehova nwere. Mgbe unu na-amụ ihe, nyere ya aka ịchọpụta otú ihe ọ na-amụ si gosi na Jehova hụrụ ya n’anya. Unu mụwa banyere ihe mgbapụta, mee ka ọ ghọta otú o si gbasa ya. (Rom 5:8; 1 Jọn 4:10) Onye ị na-amụrụ ihe ghọta otú Jehova hụruru ya n’anya, o nwere ike ime ka ọ hụkwuo Jehova n’anya.—Gal. 2:20.
9. Gịnị nyeere otu nwoke aha ya bụ Michael aka ịgbanwe ndụ ya?
9 Ka anyị kwuo gbasara otu nwoke aha ya bụ Michael. O bi n’Indoneshia. Ndị ezinụlọ ya kụziiri ya eziokwu mgbe ọ na-eto. Mana, o meghị baptizim. Mgbe ọ dị afọ iri na asatọ, ọ gara mba ọzọ na-anya nnukwu ụgbọala n’ebe ahụ. O mechara lọta Indoneshia lụọ nwaanyị, hapụ ndị ezinụlọ ya gaa rụwakwa ọrụ ná mba ọzọ. N’oge ahụ, nwunye ya na nwa ya nwaanyị bidoro ịmụ Baịbụl, na-emekwa nke ọma. Mgbe mama Michael nwụchara, ọ lọtara ụlọ ka o nwee ike ilekọta papa ya. O kwetara ka a mụwara ya Baịbụl. Mgbe ọ na-amụ “Mụtakwuo Ihe” n’isi nke 27 n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, ihe ọ mụtara ruru ya n’obi. Mgbe Michael na-eche otú obi si gbawaa Jehova mgbe Ọkpara ya na-ata ahụhụ, anya mmiri gbara ya. Ọ bịara jiri ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ezigbo ihe, kpebiekwa ịgbanwe ndụ ya ma mee baptizim.
NYERE YA AKA IWERE IFE JEHOVA KA IHE KACHA MKPA
10. Olee otú Jizọs si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka iwerezi iso ya ka ihe kacha mkpa? (Luk 5:5-11) (Kọwaakwa foto.)
10 Ndị mbụ soro ụzọ Jizọs ghọtara ozugbo na Jizọs bụ Mezaya e kwere ná nkwa. Ma, e kwesịrị inyere ha aka ka ha were ife Jehova ka ihe kacha mkpa. E nwere oge Pita na Andru na-esobu ụzọ Jizọs tupu ya akpọọ ha ka ha bịa sowe ya mgbe niile. (Mat. 4:18, 19) Ha na Jems na Jọn na-akụ azụ̀. Ọrụ ahụ na-enyekwa ha ego. (Mak 1:16-20) Mgbe Pita na Andru “hapụrụ ụgbụ ha” sowe Jizọs mgbe niile, ọ ga-abụ na ha haziri otú ha ga-esi na-elekọta ezinụlọ ha. Gịnị nyeere ha aka iwerezi iso Jizọs ka ihe kacha mkpa? Akwụkwọ Luk gwara anyị na Jizọs rụrụ ọrụ ebube nke mere ka obi sie ha ike na Jehova ga-elekọta ha.—Gụọ Luk 5:5-11.
Gịnị ka anyị na-amụta n’otú Jizọs si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka iwere ife Jehova ka ihe kacha ha mkpa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)b
11. Olee otú anyị nwere ike isi jiri ihe mere ná ndụ anyị nyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka ka okwukwe ya sikwuo ike?
11 Anyị agaghị arụli ọrụ ebube otú ahụ Jizọs rụrụ. Ma, anyị nwere ike ịkọrọ onye anyị na-amụrụ Baịbụl otú Jehova si akwado ndị weere ofufe ya ka ihe kacha mkpa. Dị ka ihe atụ, ì chetara otú Jehova si nyere gị aka mgbe ị malitere ịbịa ọmụmụ ihe? O nwere ike ịbụ na ị gakwuuru onye ị na-arụrụ ọrụ kọwaara ya ihe mere na ị gaghịzi na-arụ ọrụ ma a gbasaa ọrụ ma ọ bụrụ na ọ ga-egbochi gị ịga ọmụmụ ihe. Ka ị na-akọrọ onye ị na-amụrụ Baịbụl ihe ndị a, mee ka ọ ghọta otú okwukwe gị si sikwuo ike mgbe ị hụrụ ka Jehova kwadoro mkpebi i mere iwere ofufe ya ka ihe kacha mkpa ná ndụ gị.
12. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akpọ ụmụnna dị iche iche aga amụrụ mmadụ Baịbụl? (b) Olee otú i nwere ike isi eji vidio akụzi ihe nke ọma? Nye ihe atụ.
12 Ọ ga-abakwara onye ị na-amụrụ Baịbụl uru ma ọ nụ otú Ndị Kraịst ndị ọzọ si gbanwee ihe ụfọdụ ná ndụ ha ka ha nwee ike iwere ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa. N’ihi ya, na-akpọ ụmụnna dị iche iche ka ha soro gị ma ị gawa ịmụrụ onye ahụ ihe. Gwa ha ka ha kọọ otú ha si bata n’ọgbakọ nakwa ihe ndị ha mere iji mee ka ofufe Jehova bụrụ ihe kacha ha mkpa. Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ iwepụta oge gị na onye ahụ ga-eji na-ele vidio ndị dị na “Mụtakwuo Ihe” ma ọ bụkwanụ “Ihe Ị Ga-elebakwu Anya” n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Dị ka ihe atụ, unu mụwa isi nke 37 n’akwụkwọ ahụ, i nwere ike iji vidio bụ́ Jehova Ga-egboro Anyị Mkpa Anyị nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ka ọ ghọta na Jehova ga-enyere ya aka ma o were ife ya ka ihe kacha mkpa ná ndụ ya.
KỤZIERE YA IHE O KWESỊRỊ IME MA E MEGIDEWE YA
13. Olee otú Jizọs si kwadebe ndị na-eso ụzọ ya maka mmegide?
13 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ugboro ugboro na a ga-emegide ha. Ndị ezinụlọ ha nwedịrị ike imegidewe ha. (Mat. 5:11; 10:22, 36) Ka Jizọs na-ejecha ozi ya n’ụwa, ọ dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị na e nwere ike igbu ha maka na ha na-efe Jehova. (Mat. 24:9; Jọn 15:20; 16:2) Ọ gwara ha ka ha dịrị akọ ma ha nọrọ n’ozi ọma. Ọ gwara ha ka ha na ndị na-emegide ha ghara ịga rụwa ụka nakwa ka ha kpachara anya n’ihe ha na-ekwu nakwa n’ihe ha na-eme ka ha nwee ike ikwusara ozi ọma na-aga.
14. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka onye anyị na-amụrụ Baịbụl jikere ejikere maka mmegide? (2 Timoti 3:12)
14 Anyị nwere ike inyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ijikere maka mmegide ma anyị gwa ya ihe ndị ọrụ ibe ya, ndị enyi ya, ma ọ bụ ndị ikwu ya nwere ike ịgwa ya. (Gụọ 2 Timoti 3:12.) Ụfọdụ ndị ọrụ ibe ya nwere ike iji ya eme ihe ọchị maka na ọ na-ebizi ndụ otú Baịbụl kwuru. Ụfọdụ ndị, ma ndị ezinụlọ ya, nwedịrị ike ịna-akatọ ihe o kweere si na Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị ebido n’oge kwadebe ndị anyị na-amụrụ Baịbụl maka mmegide, ọ ga-eme ka ha jikere ejikere ma ọ bịa.
15. Gịnị nwere ike inyere onye a na-amụrụ Baịbụl aka idi mmegide ndị ezinụlọ ya na-emegide ya?
15 Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ onye ị na-amụrụ ihe na-emegide ya, gbaa ya ume ka o chee banyere ihe nwere ike ịna-ewe ndị ezinụlọ ya iwe. Ha nwere ike ịna-eche na e duhiela ya, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha kpọrọ Ndịàmà Jehova asị. Ụfọdụ ndị ezinụlọ Jizọs enweghịdị obi ụtọ maka ihe ọ na-eme. (Mak 3:21; Jọn 7:5) Kụziere onye ị na-amụrụ ihe inwe ndidi nakwa ịna-adị akọ ma ya na ndị ọzọ kwurịtawa okwu, ma ndị ezinụlọ ya.
16. Olee otú anyị nwere ike isi nyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka iji akọ gwa ndị ọzọ ihe o kweere?
16 Ọ bụrụgodị na ndị ezinụlọ onye a na-amụrụ Baịbụl egosiwe mmasị n’ihe ọ na-amụta, ọ ga-adị mma ka ọ ghara ịkọwara ha ihe niile otu mgbe. Ma ọ́ bụghị ya, ike nwere ike ịgwụ ha, ya emee ka ha ghara ịchọ ka ha na ya kwurịta okwu n’oge ọzọ. N’ihi ya, gbaa onye ị na-amụrụ Baịbụl ume ka ọ na-akọrọ ndị ọzọ ihe o kweere otú ga-eme ka ha chọọ ka ha na ya kwurịta okwu n’oge ọzọ. (Kọl. 4:6) O nwere ike ịgwa ha ka ha gaa na jw.org. Ọ ga-enyere ha aka iji aka ha mụtakwuo banyere Ndịàmà Jehova mgbe ọ bụla ha chọrọ.
17. Olee otú i nwere ike isi kụziere onye ị na-amụrụ ihe otú ọ ga-esi aza ajụjụ banyere Ndịàmà Jehova? (Kọwaakwa foto.)
17 I nwere ike iji isiokwu ndị dị n’ebe a kpọrọ “Ajụjụ Ndị A Na-ajụkarị Banyere Ndịàmà Jehova” dị na jw.org nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ka o jikere ịza ajụjụ ndị ikwu ya ma ọ bụ ndị ọrụ ibe ya nwere ike ịjụ ya. (2 Tim. 2:24, 25) Unu mụchaa isi nke ọ bụla n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, lebanụ anya n’ebe a kpọrọ “Ụfọdụ Na-asị.” Gbaa onye ị na-amụrụ ihe ume ka ọ mụgharịa otú ọ ga-esi aza mmadụ ajụjụ ahụ n’okwu nke aka ya. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, tụọrọ ya aro ihe ọ ga-eme ka otú o si aza ajụjụ ka mma. Isi otú ahụ amụ ihe nwere ike inyere ya aka iji obi ike na-agbachitere ihe o kweere.
Gbaa onye ị na-amụrụ Baịbụl ume ka ọ na-agwa ndị ọzọ ihe o kweere. Otú ị ga-esi eme ya bụ gị na ya ịmụgharị ihe ọ ga-agwa mmadụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)c
18. Olee otú i nwere ike isi gbaa onye ị na-amụrụ Baịbụl ume ka ọ ghọọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim? (Matiu 10:27)
18 Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha na-ezi ndị ọzọ ozi ọma. (Gụọ Matiu 10:27.) Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ ihe ebido n’oge na-akọrọ ndị ọzọ ihe ọ na-amụta, ọ ga-eme ka o bido n’oge na-atụkwasị Jehova obi. Olee otú i nwere ike isi nyere ya aka ime ya? Ọ bụrụ na a maa ọkwa na e nwere mkpọsa pụrụ iche a ga-eme n’ọgbakọ unu, gbaa ya ume ka o chee ihe ndị ọ ga-eme ka o nwee ike iru eru ịbụ onye nkwusa. Gwa ya na ọ na-adịkarị mfe ikwusa ozi ọma n’ụdị oge ahụ. O nwekwara ike ịbara ya uru ma ọ malite ime ihe omume ụmụ akwụkwọ n’ọmụmụ ihe etiti izu. Ka ọ na-agbalị iru eru imewe ihe omume a, ọ ga-agbalị ịmụta otú ọ ga-esi na-akọwa ihe o kweere.
GOSI YA NA OBI SIRI GỊ IKE NA Ọ CHỌRỌ IFE JEHOVA
19. Olee otú Jizọs si gosi na obi siri ya ike na ndị na-eso ụzọ ya chọrọ ife Jehova? Olee otú anyị ga-esi eme ka ya?
19 Tupu Jizọs alaa eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na otu ụbọchị, ya na ha ga-anọkọ ọzọ. Ha aghọtaghị na Jizọs na-ekwu na hanwa ga-emecha gaa eluigwe. N’agbanyeghị na e nwere ihe ndị ha na-aghọtaghị, Jizọs ma na ha kpebisiri ike ife Jehova. (Jọn 14:1-5, 8) Ọ ma na ọ ga-ewe oge tupu ha aghọta ihe ụfọdụ, dị ka olileanya ha nwere ịga eluigwe. (Jọn 16:12) Anyịnwa kwesịkwara igosi na obi siri anyị ike na onye anyị na-amụrụ Baịbụl chọrọ ife Jehova.
Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ Baịbụl ebido n’oge na-akọrọ ndị ọzọ ihe ọ na-amụta, ọ ga-eme ka o bido n’oge na-atụkwasị Jehova obi
20. Olee otú otu nwanna nwaanyị na Malawi si gosi na obi siri ya ike na onye ọ na-amụrụ Baịbụl chọrọ ife Jehova?
20 Ka obi sie gị ike na onye ị na-amụrụ Baịbụl chọrọ ime ihe dị mma. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị bi na Malawi aha ya bụ Chifundo malitere ịmụrụ otu nwa agbọghọ bụ́ onye Katọlik akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Aha nwa agbọghọ ahụ bụ Alinafe. Mgbe ha mụchara isi nke 14, nwanna nwaanyị ahụ jụrụ onye ahụ ọ na-amụrụ Baịbụl ihe o chere banyere iji ihe a kpụrụ akpụ efe Chineke. Ihe ahụ were onye ahụ ọ na-amụrụ ihe iwe, ya asị, “Ọ bụ m ga-ekpebi ma m̀ ga-eji ya na-efe Chineke.” Nwanna nwaanyị ahụ chere na onye ahụ ọ na-amụrụ ihe ga-akwụsị ịmụ Baịbụl. Mana, o nwere ndidi ma ka na-amụrụ ya ihe. Obi siri ya ike na ọ ga-emecha ghọta na iji ihe a kpụrụ akpụ efe Chineke adịghị mma. Mgbe ọnwa ole na ole gachara, Nwanna Nwaanyị Chifundo jụrụ ya ajụjụ ahụ dị n’isi nke 34, nke sịrị: “Olee uru ịmụ Baịbụl na ịmụ gbasara ezi Chineke, bụ́ Jehova, baarala gị?” Nwanna nwaanyị ahụ kọrọ ihe nwa agbọghọ ahụ zara ya. Ọ sịrị: “O kwuru ọtụtụ ihe dị mkpa. Otu n’ime ha bụ na Ndịàmà Jehova anaghị eme ihe Baịbụl sịrị na ọ dịghị mma.” N’oge na-adịghị anya, nwa agbọghọ ahụ kwụsịrị iji ihe a kpụrụ akpụ efe Chineke, mechaa mee baptizim.
21. Olee otú anyị ga-esi nyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka ikpebi ife Jehova?
21 Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Jehova “na-eme ka o too,” ma anyị ga-enyeliri ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịna-eme nke ọma. (1 Kọr. 3:7) Ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịkụziri ha ihe Chineke chọrọ ka ha mee. Anyị ga-enyere ha aka ịmụta iji obi ha niile hụ Jehova n’anya. Anyị ga-agbakwa ha ume ka ha were ife Jehova ka ihe kacha mkpa iji gosi na ha hụrụ ya n’anya. Anyị ga-akụzikwara ha ịtụkwasị Jehova obi ma e megidewe ha. Ọ bụrụ na anyị na-egosi onye anyị na-amụrụ Baịbụl na obi siri anyị ike na ọ chọrọ ife Jehova, anyị na-eme ka obi sie ya ike na ọ ga-emeli ihe Jehova chọrọ ma kpebie ife ya.
ABỤ NKE 55 Unu Atụla Ha Egwu
a Mgbe afọ abụọ na ọkara gachara Nikọdimọs matara Jizọs, ọ ka sokwa ná ndị ikpe n’ụlọikpe dị elu nke ndị Juu. (Jọn 7:45-52) Ụfọdụ ndị na-akọ ihe ndị mere n’oge ochie kwuru na mgbe Nikọdimọs ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs bụ mgbe Jizọs nwụchara.—Jọn 19:38-40.
b NKỌWA FOTO: Ebe Pita na ndị ọzọ na-akụ azụ̀ na-ahapụ ọrụ ịkụ azụ̀ ha na-arụ ma bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.
c NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-enyere onye ọ na-amụrụ Baịbụl aka ịmụta otú ọ ga-esi na-ezi ozi ọma.