ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 28
ABỤ NKE 88 Mee Ka M Mara Ụzọ Gị
Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-achọ Ka E Nye Anyị Ndụmọdụ?
“Ndị na-achọ ka a dụọ ha ọdụ ma ihe.”—ILU 13:10.
IHE A GA-AMỤ
Ihe anyị kwesịrị ime ka ndụmọdụ e nyere anyị baara anyị ezigbo uru.
1. Olee otú anyị ga-esi eme ezigbo mkpebi, ihe anyị na-eme agaziekwara anyị? (Ilu 13:10; 15:22)
ANYỊ niile chọrọ ịna-eme ezigbo mkpebi. Anyị niile chọkwara ka ihe anyị na-eme gaziere anyị. Okwu Chineke gwara anyị otú anyị ga-esi eme ihe abụọ a.—Gụọ Ilu 13:10; 15:22.
2. Gịnị ka Jehova kwere nkwa imere anyị?
2 Nke bụ́ eziokwu bụ na onye kachanụ anyị ga-agakwuru ka o nye anyị amamihe nakwa ezigbo ndụmọdụ bụ Nna anyị bụ́ Jehova. O kwere nkwa inyere anyị aka. Ọ sịrị: “M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adịkwa n’ebe ị nọ.” (Ọma 32:8) Ihe a gosiri na ihe Jehova na-eme abụghị naanị inye anyị ndụmọdụ. O nwere mmasị n’ebe anyị nọ, chọọkwa inyere anyị aka ime ihe ahụ ọ dụrụ anyị n’ọdụ.
3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
3 N’isiokwu a, anyị ga-eji Okwu Chineke zaa ajụjụ anọ ndị a: (1) Olee àgwà ndị m kwesịrị inwe iji gosi na m chọrọ ka ezigbo ndụmọdụ baara m uru? (2) Ònye ga-enyeli m ezigbo ndụmọdụ? (3) Olee otú m ga-esi gosi na m chọrọ ka a dụọ m ọdụ? (4) Gịnị mere na ekwesịghị m ịgwa ndị ọzọ ka ha meere m mkpebi?
OLEE ÀGWÀ NDỊ M KWESỊRỊ INWE?
4. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ezigbo ndụmọdụ baara anyị uru, olee àgwà ndị anyị kwesịrị inwe?
4 Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi, marakwa ebe ike anyị ruru ka ezigbo ndụmọdụ baara anyị uru. Anyị kwesịrị ịmata na ọ dị mkpa ka ndị ọzọ nyere anyị aka mgbe anyị chọrọ ime mkpebi dị mma n’ihe anyị na-emetụbeghị. Anyị kwesịkwara ịmata na anyị amaghị ihe niile. Ọ bụrụ na anyị adịghị umeala n’obi, marakwa ebe ike anyị ruru, Jehova agaghị enyere anyị aka. Ọ bụrụzie na anyị agụọ Okwu Chineke gụta ndụmọdụ ga-abara anyị uru, ya adị ka mmiri a gbasara n’elu okwute. (Maị. 6:8; 1 Pita 5:5) Ma ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, marakwa ebe ike anyị ruru, ọ ga-adịrị anyị mfe ịnabata ndụmọdụ si na Baịbụl anyị nụrụ, ya abaakwara anyị uru.
5. Olee ihe ndị dị ịtụnanya Devid mere gaara eme ka ọ dịwa mpako?
5 Ka anyị lee ihe anyị ga-amụta n’aka Eze Devid. O mere ọtụtụ ihe dị ịtụnanya, mana o meghị ka isi buwe ya. Ogologo oge tupu ya aghọọ eze, a ma ya ama ka onye egwú aka siri ike. A kpọdịrị ya ka ọ na-akụrụ eze egwú. (1 Sam. 16:18, 19) Mgbe e techara ya mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-anọchi Sọl, Jehova nyere ya mmụọ nsọ ya nke mere ka ọ dị ike. (1 Sam. 16:11-13) O gburu ọtụtụ ndị iro ha, ma dike ndị Filistia bụ́ Golayat. Ihe a mere ka a mara ya amara. (1 Sam. 17:37, 50; 18:7) Onye dị mpako mere ihe ndị a niile ga-eche na ọ dịghị mkpa ka ndị mmadụ nye ya ndụmọdụ. Mana, Devid emeghị otú ahụ.
6. Olee otú anyị si mara na Devid nabatara ndụmọdụ? (Kọwaakwa foto.)
6 Mgbe Devid ghọchara eze, ọ họọrọ ezigbo ndị enyi na-enye ya ndụmọdụ. (1 Ihe 27:32-34) Ihe a atụghị anyị n’anya n’ihi na a ma Devid ama ka onye na-anabata ezigbo ndụmọdụ. Ndị o gere ntị abụghị naanị ụmụ nwoke. O gekwara otu nwaanyị aha ya bụ Abigel ntị. Di nwaanyị a bụ Nebal, onye dị mpako, onye na-anaghị ekele onye meere ya ihe ọma, onye na-anaghịkwa asọpụrụ ndị ọzọ. Ma, Devid dị umeala n’obi. Ọ nabatara ezigbo ndụmọdụ nwaanyị a nyere ya. Ihe a mere ka ọ ghara ime mmehie dị oké njọ.—1 Sam. 25:2, 3, 21-25, 32-34.
Ebe Eze Devid weturu obi nabata ndụmọdụ Abigel nyere ya, meekwa ihe ọ gwara ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)
7. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka Devid? (Ekliziastis 4:13) (Kọwaakwa foto.)
7 Anyị ga-amụta ụfọdụ ihe n’aka Devid. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike inwe nkà pụrụ iche ma ọ bụkwanụ nwee ikike ụfọdụ. Ma o kwesịghị ime ka anyị chee na anyị amarachaala ihe niile nakwa na e kwesịghị inye anyị ndụmọdụ. Dịkwa ka Devid, anyị kwesịrị ịdị njikere ịnabata ezigbo ndụmọdụ n’agbanyeghị onye nyere anyị ya. (Gụọ Ekliziastis 4:13.) Anyị mee otú ahụ, o nwere ike ime ka anyị ghara ime ihe ga-akpatara ma anyị ma ndị ọzọ nsogbu.
Anyị kwesịrị ịdị njikere ige ntị n’ezigbo ndụmọdụ n’agbanyeghị onye nyere anyị ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)c
ÒNYE GA-ENYELI M EZIGBO NDỤMỌDỤ?
8. Gịnị mere Jonatan ji ruo eruo inye Devid ndụmọdụ?
8 Ka anyị lee otu ihe ọzọ anyị nwere ike ịmụta n’aka Devid. Ọ nabatara ndụmọdụ ndị ha na Jehova dị ná mma na ndị ghọtara ihe ya na ya na-alụ nyere ya. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ chọrọ ịma ma Eze Sọl ọ̀ chọrọ ka ya na ya kpezie, o gere Jonatan bụ́ nwa Sọl ntị. Gịnị mere Jonatan ga-eji enye ya ezigbo ndụmọdụ? Ọ bụ n’ihi na Jonatan na Jehova dị n’ezigbo mma. Ọ makwa Sọl nke ọma. (1 Sam. 20:9-13) Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị?
9. Ònye ka anyị kwesịrị ịkpọtụrụ ma anyị chọọ ka e nye anyị ndụmọdụ? Kọwaa. (Ilu 13:20)
9 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka e nye anyị ndụmọdụ, anyị kwesịrị ịgakwuru onye ya na Jehova dị n’ezigbo mma nakwa onye ma ihe anyị na ya na-alụ ka o nye anyị ndụmọdụ.a (Gụọ Ilu 13:20.) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na otu nwanna bụ́ okorobịa na-achọ ezigbo nwaanyị ọ ga-alụ. Ònye ga-enye ya ndụmọdụ ga-enyere ya aka? Enyi ya na-alụbeghị nwaanyị nwere ike inyere ya aka ma o nye ya ndụmọdụ si na Baịbụl. Mana, o yiri ka ndị ga-aka enye ya ndụmọdụ ga-abara ya uru bụ di na nwunye ji ofufe Jehova kpọrọ ihe, ndị makwa ya nke ọma ma na-enwe obi ụtọ kemgbe ọtụtụ afọ ha lụrụla.
10. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya ugbu a?
10 Anyị elebala anya n’àgwà abụọ dị anyị mkpa nakwa ndị ga-enyeli anyị ezigbo ndụmọdụ. Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe anyị ga-eme iji gosi na anyị chọrọ n’eziokwu ka e nye anyị ndụmọdụ nakwa ma ànyị kwesịrị ịgwa ndị ọzọ ka ha meere anyị mkpebi.
OLEE OTÚ M GA-ESI GOSI NA M CHỌRỌ N’EZIOKWU KA E NYE M NDỤMỌDỤ?
11-12. (a) Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ime? (b) Gịnị ka Eze Rehoboam mere mgbe e nwere ihe dị ezigbo mkpa o kwesịrị ikpebi?
11 Mgbe ụfọdụ, mmadụ nwere ike ịsị na ya chọrọ ka e nye ya ndụmọdụ, mana nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ọ chọrọ bụ onye ga-adụnyere ya úkwù n’ihe o kpebirila ime. Onye na-eme otú a anaghị egosi na ihe ọ chọrọ n’eziokwu bụ ka e nye ya ndụmọdụ. O kwesịrị isi n’ihe mere Eze Rehoboam mụta ihe.
12 Rehoboam nọchiri Eze Solomọn chịwa Izrel. Ihe nọ na-agaziri ndị Izrel. Mana, ha chere na Solomọn mere ka ha rụgbuo onwe ha n’ọrụ. Ha bịakwutere Rehoboam ma rịọ ya ka o mee ka ihe dịtụrụ ha mfe. Rehoboam gwara ha ka ha nyetụ ya oge ka o chebara ihe ọ ga-aza ha echiche. Ihe mbụ o mere bụ na ọ jụrụ ndị okenye ndị nyeere Solomọn aka ihe ọ ga-eme. Ihe ahụ o mere dịkwa mma. (1 Eze 12:2-7) Ma, o kweghị anabata ndụmọdụ ha nyere ya. Maka gịnị? Ọ ga-abụ na Rehoboam ebula ụzọ kpebie ihe ọ ga-eme, cheekwa na ndị okenye ahụ ga-adụnyere ya úkwù. N’ihi ya, mgbe ọ jụrụ ndị enyi ya bụ́ ụmụ okorobịa, ha agwa ya ihe ọ chọrọ ịnụ, o meziri ihe ha kwuru. (1 Eze 12:8-14) Rehoboam zaghachiri ndị Izrel ihe ndị enyi ya gwara ya mee. Ihe a mere ka mba ahụ kee abụọ. Malitekwa mgbe ahụ gawa, Rehoboam nọ na-enwe nsogbu.—1 Eze 12:16-19.
13. Olee otú anyị nwere ike isi mara ma ànyị chọrọ n’eziokwu ka e nye anyị ndụmọdụ?
13 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Rehoboam mere? Ọ bụrụ na anyị agwa mmadụ ka o nye anyị ndụmọdụ, anyị kwesịrị igosi n’eziokwu na anyị chọrọ ka e nye anyị ndụmọdụ. Gịnị ga-enyere anyị aka? Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-agwa mmadụ ka o nye m ndụmọdụ ma jụ ndụmọdụ o nyere m n’ihi na ọ bụghị ihe m chọrọ ịnụ?’ Ka anyị lebagodị anya n’otu ihe atụ.
14. E nye anyị ndụmọdụ, gịnị ka anyị kwesịrị icheta? Nye ihe atụ. (Kọwaakwa foto.)
14 Ka e were ya na a chọrọ inye otu nwanna nwoke ọrụ na-akwụpụta ụgwọ. Tupu ya anara ọrụ ahụ, ya agwa otu okenye ka o nye ya ndụmọdụ. Ọ gwara okenye ahụ na ọrụ ahụ ga na-eme ka ọ hapụ ezinụlọ ya pụọ ruo ogologo oge. Okenye ahụ chetaara ya na Baịbụl kwuru na ọrụ kacha mkpa e nyere ya bụ iji Okwu Chineke na-akụziri ndị ezinụlọ ya ihe ma na-eduzi ha. (Efe. 6:4; 1 Tim. 5:8) Ka e were ya na nwanna ahụ ekweghị anabata ihe okenye ahụ kwuru, ya ajụwakwa ụmụnna ndị ọzọ ihe ọ ga-eme ruo mgbe o nwetara onye gwara ya ihe ọ chọrọ ịnụ. Ànyị ga-asị na nwanna a na-achọ ka e nye ya ndụmọdụ, ka ò bula ụzọ kpebie ihe ọ ga-eme, na-achọzi onye ga-adụnyere ya úkwù? Anyị kwesịrị icheta na obi anyị dị aghụghọ. (Jere. 17:9) Mgbe ụfọdụ, e nwere ike inye anyị ndụmọdụ na-adịghị anyị mma, mana ya abụrụ ya ka e kwesịrị inye anyị n’oge ahụ.
Ànyị na-achọ ezigbo ndụmọdụ n’eziokwu, ka ihe anyị na-eme ọ̀ bụ ịchọ onye ga-adụnyere anyị úkwù? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)
M̀ KWESỊRỊ ỊGWA NDỊ ỌZỌ KA HA MEERE M MKPEBI?
15. Gịnị ka anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ime? N’ihi gịnị?
15 Ọ bụ ọrụ onye ọ bụla n’ime anyị imere onwe ya mkpebi. (Gal. 6:4, 5) Dị ka anyị kwuru, onye ma ihe ga-achọ ndụmọdụ n’Okwu Chineke nakwa n’aka Ndị Kraịst ma nke a na-akọ tupu ya ekpebie ihe ọ ga-eme. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịgwa ndị ọzọ ka ha meere anyị mkpebi. Ụfọdụ ndị nwere ike ịgakwuru onye ha na-akwanyere ùgwù, sị ya, “Ọ bụrụ gị ka ụdị nsogbu a bịaara, gịnị ka ị ga-eme?” E nwekwara ndị na-eme ihe onye ọzọ kpebiri n’ebughị ụzọ chebara ya echiche.
16. Gịnị mere n’ọgbakọ dị na Kọrịnt gbasara iri anụ e ji chụọrọ arụsị àjà? Ònye ka ọ dịịrị ikpebi ma ọ̀ ga-eri ụdị anụ ahụ? (1 Ndị Kọrịnt 8:7; 10:25, 26)
16 Legodị ihe mere n’ọgbakọ dị na Kọrịnt n’oge ndịozi gbasara iri anụ e ji chụọrọ arụsị àjà. Pọl degaara Ndị Kraịst ndị ahụ akwụkwọ ozi, sị: “Anyị ma na o nweghị ihe arụsị bụ, marakwa na e nwere naanị otu Chineke.” (1 Kọr. 8:4) N’ihi ihe a Pọl kwuru, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ kpebiri na ha nwere ike ịga ahịa zụrụ anụ rie, ọ bụrụgodị na e bula ụzọ jiri ya chụọrọ arụsị àjà. E nwekwara ndị kpebiri na ha agaghị eri anụ ahụ maka na ọ ga-enye akọnuche ha nsogbu. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 8:7; 10:25, 26.) Ihe a bụ ihe onye ọ bụla ga-ekpebiri onwe ya. Pọl agwaghị ụmụnna nọ na Kọrịnt ka ha kpebiere ndị ọzọ ihe ha ga-eme ma ọ bụ ka ha mee ihe ndị ọzọ mere. Onye nke ọ bụla “ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.”—Rom 14:10-12.
17. Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị ọzọ mere n’echebaraghị ya echiche? Nye ihe atụ. (Kọwaakwa foto.)
17 Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi eme taa? Chegodị gbasara irighiri ihe si n’ọbara. Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị iji aka ya kpebie ma ọ̀ ga-ekwe ka e jiri ihe ndị a gwọọ ya ọrịa ma ọ bụkwanụ jụ ha?b O nwere ike isiri anyị ike ịghọta ihe a nke ọma. Ma, ọ bụ onye ọ bụla n’ime anyị ga-eji aka ya ekpebi ihe ọ ga-eme n’okwu a. (Rom 14:4) Ọ bụrụ na anyị emee ihe onye ọzọ kpebiri, o nwere ike ime ka akọnuche anyị ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma. Anyị kwesịrị iji akọnuche anyị e ji Baịbụl zụọ na-eme mkpebi ka akọnuche anyị nwee ike ịna-arụ ọrụ nke ọma. (Hib. 5:14) N’ihi ya, olee mgbe anyị kwesịrị ịgwa Onye Kraịst ma nke a na-akọ ka o nye anyị ndụmọdụ? Ọ bụ mgbe anyị mechara nchọnchọ n’onwe anyị, ya abụrụkwa na anyị ka chọrọ ka e nyere anyị aka ịghọta ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ahụ anyị chọrọ ikpebi.
Anyị kwesịrị ịchọ ndụmọdụ naanị mgbe anyị jirila aka anyị mechaa nchọnchọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)
AKWỤSỊLA ỊCHỌ NDỤMỌDỤ
18. Gịnị ka Jehova meere anyị?
18 Jehova egosila na ọ tụkwasịrị anyị obi n’ihi na o kwere ka anyị jiri aka anyị na-ekpebiri onwe anyị ihe. O nyela anyị Okwu ya bụ́ Baịbụl, nyekwa anyị ndị enyi ma ihe, ndị ga-enyere anyị aka ichebara ihe Baịbụl kwuru echiche. O meerela anyị ihe nna kwesịrị imere ụmụ ya. (Ilu 3:21-23) Gịnị ka anyị ga-eme iji gosi ya na obi dị anyị ụtọ maka ihe o meere anyị?
19. Olee otú anyị ga-esi na-eme ka obi Jehova ṅụrịa?
19 Chebaragodị ihe a echiche: Obi na-atọ nne na nna ụtọ ma ha hụ ka ụmụ ha toro ma bụrụ ndị ohu Jehova na-echebara ihe echiche, mara ihe, na-enyekwara ndị ọzọ aka. Otú ahụ ka ọ dịkwa Jehova. Obi na-adị ya ụtọ ma ọ hụ ka anyị na-aghọkwu Ndị Kraịst tozuru etozu, na-achọ ndụmọdụ, na-emekwa mkpebi na-eme ya obi ụtọ.
ABỤ NKE 127 Ụdị Mmadụ M Kwesịrị Ịbụ
a Mgbe ụfọdụ, Ndị Kraịst nwere ike ịkpọtụrụ ndị na-anaghị efe Jehova ma ha chọọ ndụmọdụ gbasara okwu ego, ọrịa, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ.
b Ị chọọ ịmatakwu ebe a kọwara isiokwu a, gụọ akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, isi nke 39, nọmba nke 5 nakwa n’ebe e dere “Ihe Ị Ga-elebakwu Anya.”
c NKỌWA FOTO: Ebe otu okenye na-adụ okenye ibe ya ọdụ n’ihe gbasara otú o si kwuo okwu ná nnọkọ ha gara n’oge na-adịbeghị anya.