ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 30
ABỤ NKE 97 Okwu Chineke Na-enye Ndụ
Ị̀ Ka Nwere Ike Ịmụta Ihe n’Ihe Ndị Bụ́ Isi Ị Mụtarala na Baịbụl?
“M chọrọ ịna-echetara unu ihe ndị a mgbe niile n’agbanyeghị na unu ma ha, bụrụkwa a kwaa a kwụrụ n’eziokwu a na-akụziri anyị.”—2 PITA 1:12.
IHE A GA-AMỤ
Otú ihe ndị bụ́ isi anyị mụtara na Baịbụl ka nwere ike isi baara anyị uru taa ọ bụrụgodị na ọtụtụ afọ agafeela kemgbe anyị mụtara ha.
1. Olee otú ihe ndị Baịbụl na-akụzi si baara gị uru mgbe mbụ ị mụtara eziokwu dị na Baịbụl?
IHE ndị bụ́ isi anyị mụtara na Baịbụl agbanweela ndụ anyị. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị mụtara na aha Chineke bụ Jehova, anyị malitere ịbịaru ya nso. (Aịza. 42:8) Mgbe anyị matara ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ, anyị anaghịzi echegbu onwe anyị na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ na-ata ahụhụ. (Ekli. 9:10) Mgbe anyị mụtakwara gbasara nkwa Chineke kwere anyị ime ka ụwa ghọọ Paradaịs, anyị anaghịzi echegbu onwe anyị maka ọdịnihu. Obi bịara sie anyị ike na anyị ga-adịli ndụ ebighị ebi, ọ bụghị naanị ịdị ndụ afọ iri asaa ma ọ bụ iri asatọ.—Ọma 37:29; 90:10.
2. Olee otú 2 Pita 1:12, 13 si gosi na ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi ka nwere ike ịbara Ndị Kraịst tozuru etozu uru?
2 Anyị ekwesịghị iji ihe ndị bụ́ isi anyị mụtara na Baịbụl egwu egwu. Ndị Pita onyeozi degaara akwụkwọ ozi ya nke abụọ bụ Ndị Kraịst bụ́ “a kwaa a kwụrụ n’eziokwu” a kụziiri ha. (Gụọ 2 Pita 1:12, 13.) Ma n’oge ahụ, e nwere ndị ọjọọ nọ n’ọgbakọ, ndị chọrọ ime ka ụmụnna hapụ eziokwu. (2 Pita 2:1-3) Pita chọrọ ime ka ụmụnna ya sie ike ka ndị a ghara inweta ha. Iji mee ya, o chetaara ha ụfọdụ n’ime ihe ndị ha mụtaburu. Ihe ndị a ga-enyere ha aka ịna-efe Chineke ruo ọgwụgwụ.
3. Mee ihe atụ na-egosi ihe mere o ji dị mkpa ka Ndị Kraịst niile na-atụgharị uche n’ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi.
3 Ka anyị na-aghọkwu Ndị Kraịst tozuru etozu, anyị nwere ike ịmụta ihe ndị ọhụrụ n’ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi. Dị ka ihe atụ, onye bụ́ aka ochie n’isi nri na onye ka na-amụ amụ nwere ike iji otu ngwá nri sie nri. Ma, onye nke ahụ bụ́ aka ochie amụtala otú ọ ga-esi jiri ngwá nri ahụ sie nri bụ́ e rie a mịchaa aka ma ọ bụkwanụ jiri ya sie nri ọhụrụ n’ihi na o siela nri ọtụtụ afọ. Otú ahụkwa ka ọ dị ndị ferela Jehova ruo ọtụtụ afọ. Ha nwere ike ịmụtakwu ihe n’amaokwu Baịbụl ha mabu karịa onye nke ka malitere ọhụrụ. Ọ ga-abụ na ihe agbanweela ná ndụ anyị ma ọ bụkwanụ na ọrụ ndị anyị na-arụ n’ọgbakọ agbanweela kemgbe anyị mere baptizim. Ọ bụrụ na anyị echee gbasara ihe ndị anyị mụtara na Baịbụl n’oge gara aga, anyị ga-ahụ otú ha ga-esi enyere anyị aka ugbu a. Ka anyị lee ihe Ndị Kraịst tozuru etozu nwere ike ịmụta n’ihe atọ bụ́ isi Baịbụl na-akụzi.
Ọ BỤ JEHOVA KERE IHE NIILE
4. Olee otú ịmata na ọ bụ Jehova kere ihe niile si gbanwee ndụ anyị?
4 “Onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.” (Hib. 3:4) Anyị ma na ọ bụ Onye kacha mara ihe na Onye kacha ike kere ụwa anyị na ihe ndị dị ndụ dị na ya. Ebe ọ bụ ya kere anyị, ọ ma anyị nnọọ nke ọma. Ọ na-echekwa gbasara anyị. Ọ ma ihe ga-akachara anyị mma. Eziokwu a dị mfe anyị mụtara, na ọ bụ Jehova kere ihe niile, agbanweela ndụ anyị n’ụzọ dị ịtụnanya, meekwa ka ndụ anyị nwee isi.
5. Olee eziokwu kwesịrị inyere anyị aka ịdị umeala n’obi? (Aịzaya 45:9-12)
5 Ịmata na ọ bụ Jehova kere ihe niile na-akụziri anyị ịdị umeala n’obi. Mgbe Job chewere naanị gbasara onwe ya, Jehova chetaara ya na ọ bụ Onye kacha ike nke kere ihe niile. (Job 38:1-4) Ihe a Jehova chetaara Job mere ka ọ ghọta na otú Jehova si eme ihe karịrị nke mmadụ. Ọ bụ ya mere Aịzaya onye amụma ji mechaa jụọ, sị: “Ụrọ ò kwesịrị ịsị Ọkpụite: ‘Gịnị ka ị na-akpụ?’”—Gụọ Aịzaya 45:9-12.
6. Olee mgbe ọ kacha dị mkpa ka anyị chee gbasara otú Onye kere anyị maruru ihe na otú ọ dịruru ike? (Kọwaakwa foto.)
6 Ọ bụrụ na mmadụ efee Jehova ruo ọtụtụ afọ, o nwere ike ibido na-atụkwasị amamihe ya obi kama ịchọ ka Jehova na Okwu ya na-eduzi ya. (Job 37:23, 24) N’ihi ya, olee otú ọ ga-esi enyere ya aka ma o chee gbasara Jehova bụ́ Onye kere ihe niile nakwa gbasara otú ọ maruru ihe na otú ọ dịruru ike? (Aịza. 40:22; 55:8, 9) Eziokwu a dị mkpa Baịbụl na-akụzi ga-enyere ya aka ịdị umeala n’obi ma mara na echiche Jehova ka echiche ya mkpa.
Olee ihe nwere ike inyere anyị aka icheta na anyị akaghị Jehova mara ihe? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)d
7. Gịnị ka Nwanna Nwaanyị Rahela mere iji nabata otu mgbanwe e mere?
7 E nwere otu nwanna nwaanyị bi na Slovinia aha ya bụ Rahela. Ọ chọpụtara na iche gbasara Onye kere ya enyerela ya aka ịnabata mgbanwe nzukọ Jehova mere. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ọ naghị adịrị m mfe ịnabata mkpebi ụmụnna na-eduzi nzukọ Jehova mere. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na eleela m Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2023 Agba nke 8, akpata oyi wụrụ m mgbe mbụ m hụrụ nwanna nwoke bu afụ ọnụ na-ekwu okwu. N’ihi ya, m kpere ekpere ka Jehova nyere m aka ịnabata mgbanwe ahụ.” Nwanna Nwaanyị Rahela chọpụtara na ebe ọ bụ Jehova kere eluigwe na ụwa, ọ bụ ya ma ụzọ kacha mma ọ ga-esi na-edu ọgbakọ ya. Ọ bụrụ na o siere gị ike ịnabata ntụziaka ọhụrụ e nyere ma ọ bụ ụzọ ọhụrụ e si ghọta ihe Baịbụl kwuru, ọ ga-adị mma ka i wetuo obi chee otú Onye kere gị maruru ihe nakwa otú ọ dịruru ike.—Rom 11:33-36.
IHE MERE JEHOVA JI KWE KA A NA-ATA AHỤHỤ
8. Olee otú ịmata ihe mere Jehova ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ si baara anyị uru?
8 Gịnị mere Chineke ji kwe ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ? Ụfọdụ ndị na-amaghị azịza ajụjụ a na-ewesa Chineke iwe ma ọ bụ na-ekwu na Chineke adịghị. (Ilu 19:3) Mana gịnwa amụtala na ọ bụ mmehie anyị ketara n’aka Adam nakwa ezughị okè kpatara ahụhụ, ọ bụghị Jehova. Ị mụtakwala na otú Jehova si nweere ndị mmadụ ndidi emeela ka ọtụtụ ndị bịa mata ya ma mụta otú ọ ga-esi kwụsị ahụhụ kpamkpam. (2 Pita 3:9, 15) Eziokwu ndị a akasiela gị obi ma mee ka ị bịarukwuo Jehova nso.
9. Olee oge ụfọdụ anyị kwesịrị icheta ihe mere Jehova ji kwe ka anyị na-ata ahụhụ?
9 Anyị amụtala na anyị kwesịrị inwe ndidi ka anyị na-eche ka Jehova kwụsị ahụhụ. N’agbanyeghị ya, ihe ọjọọ mee anyị ma ọ bụ onye anyị hụrụ n’anya, e kpee anyị ikpe na-ezighị ezi, ma ọ bụkwanụ mmadụ nwụnahụ anyị, anyị nwere ike ịna-eche ihe mere Jehova emebeghị ihe ngwa ngwa. (Hab. 1:2, 3) N’oge ndị ahụ, anyị kwesịrị iche gbasara ihe mere Chineke ji kwe ka ihe na-esiri ndị ezi omume ike.a (Ọma 34:19) Anyị kwesịkwara icheta na nzube Chineke bụ iwepụ ahụhụ kpamkpam.
10. Gịnị nyeere Nwanna Nwaanyị Anne aka idi ọnwụ mama ya?
10 Ịmata ihe mere anyị ji na-ata ahụhụ nwere ike inyere anyị aka ịtachi obi. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Anne onye bi n’agwaetiti Mayọt, nke dị n’Oké Osimiri India. Ọ sịrị: “Mgbe mama m nwụrụ afọ ole na ole gara aga, o wutere m nke ukwuu. Ma, m na-echetara onwe m mgbe niile na ọ bụghị Jehova kpatara ahụhụ anyị na-ata. Ọ na-agụsi ya agụụ ike iwepụ ụdị ahụhụ niile nakwa ịkpọlite ndị anyị nwụrụ anwụ. Ịtụgharị uche n’ihe ndị ahụ emeela ka obi na-eru m ala karịadị otú m tụrụ anya ya.”
11. Olee otú ịmara ihe mere Jehova ji kwe ka ahụhụ dịrị si enyere anyị aka ịnọgide na-ekwusa ozi ọma?
11 Ịmata ihe mere Chineke ji kwe ka anyị na-ata ahụhụ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ekwusa ozi ọma. Mgbe Pita onyeozi kọwachara na ndidi Jehova ga-eme ka a zọpụta ndị chegharịrịnụ, o dere, sị: “Chebaranụ ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ echiche. Unu kwesịrị ịna-akpa àgwà dị nsọ, na-efe Chineke.” (2 Pita 3:11) Ozi ọma anyị na-ekwusa so n’otú anyị si “na-efe Chineke.” Anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya otú ahụ Nna anyị hụrụ ha. Anyị chọrọ ka ha biri n’ụwa ọhụrụ Chineke. Jehova na-enwe ndidi ma na-enye ndị bi n’ebe unu na-ezi ozi ọma ohere ife ya. I nwere ohere magburu onwe ya iso Chineke rụkọọ ọrụ, nyere ọtụtụ ndị aka ịmụta gbasara ya tupu ọgwụgwụ abịa.—1 Kọr. 3:9.
ANYỊ BI ‘N’OGE IKPEAZỤ’
12. Olee uru ịmata na anyị bi ‘n’oge ikpeazụ’ baara anyị?
12 Baịbụl kwuru kpọmkwem otú àgwà ndị mmadụ ga-adị ‘n’oge ikpeazụ.’ (2 Tim. 3:1-5) Anyị hụ otú ndị mmadụ si akpa àgwà n’ebe anyị bi, ọ na-edo anyị anya na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ka anyị na-ahụ na àgwà ndị mmadụ na-akakwu njọ, obi na-esikwu anyị ike na e kwesịrị ịtụkwasị Okwu Chineke obi.—2 Tim. 3:13-15.
13. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị n’ihi ihe atụ ahụ Jizọs mere na Luk 12:15-21?
13 Ịmata na anyị bi n’oge ikpeazụ na-enyere anyị aka ịghọta na oge agwụla agwụ. Ka anyị lee ihe anyị ga-amụta n’ihe atụ Jizọs mere na Luk 12:15-21. (Gụọ ya.) Gịnị mere e ji sị na ọgaranya ahụ bụ “onye na-enweghị uche”? Ọ bụghị maka na ọ bara ọgaranya. Kama, ọ bụ n’ihi na ihe kacha ya mkpa abụghị ihe kwesịrị ịkacha ya mkpa. Ọ ‘kpakọtaara onwe ya akụ̀ ma ọ bụghị ọgaranya n’anya Chineke.’ Otú o si jiri oge ya mee ihe na-adịghị mkpa adịghị mma n’ihi na oge fọọrọ ya dịzi obere. Chineke gwara ya, sị: “N’abalị a ka a na-achọ ndụ gị.” Taa, ka ọgwụgwụ ụwa ochie a na-erukwu nso, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ihe ndị m kpebiri ime hà na-egosi na m ghọtara na oge agwụla agwụ? Olee ihe ndị m na-agwa ụmụ m ka ha kpebie ịchụ? M̀ na-eji ike m, oge m, na ihe ndị m nwere akpakọtara onwe m akụ̀ n’ụwa, ka ọ̀ bụ n’eluigwe?’
14. Dị ka akụkọ Nwanna Nwaanyị Miki gosiri, gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị chee gbasara ihe Baịbụl kwuru na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ?
14 Otú anyị si ele ndụ anya nwere ike ịgbanwe kpamkpam ma anyị chee gbasara ihe ndị na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ. Ọ bụ ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Miki. Ọ sịrị: “Mgbe m gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, m chọrọ ịga mahadum gụọ gbasara ụmụ anụmanụ. M chọkwara ịsụ ụzọ oge niile ma kwaga ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Ndị enyi m ma nke a na-akọ gwara m ka m chee echiche nke ọma ma m̀ ga na-aga mahadum, na-emekwa ihe ndị m chọrọ ime n’ozi Jehova. Ha chetaara m na ọ gaghị adị anya ọgwụgwụ abịa. Mana n’ụwa ọhụrụ, m ga-enwe oge buru ibu m ga-eji mụọ gbasara anụmanụ ole m chọrọ. N’ihi ya, m gara ụlọ akwụkwọ ebe m ji obere oge mụọ aka ọrụ ga-enyere m aka. Ihe a nyeere m aka inweta ọrụ m ji na-elekọta onwe m ma na-asụ ụzọ. M mechakwara kwaga ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma n’Ekwedọ.” Nwanna Nwaanyị Miki na di ya na-arụ ọrụ sekit ná mba ahụ ugbu a.
15. Ndị mmadụ hà nwere ike imecha nabata ozi anyị? Mee ihe atụ. (Kọwaakwa foto.)
15 Ike ekwesịghị ịgwụ anyị ma ndị mmadụ jụ ozi anyị. Ha nwere ike ịgbanwe. Weregodị Jems nwanne Jizọs dị ka ihe atụ. Ọ hụrụ ka Jizọs toro, ghọọ Mezaya, na-akụzikwa ihe karịa otú mmadụ ọ bụla kụzitụrụla. N’agbanyeghị ya, ruo ọtụtụ afọ, Jems aghọghị onye na-eso ụzọ Jizọs. Ọ bụ naanị mgbe Jizọs nwụrụ, a kpọlitekwa ya ka ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ ya na-anụ ọkụ n’obi.b (Jọn 7:5; Gal. 2:9) Echekwala na ọ baghị uru ịkpọtụrụ onye ikwu gị na-enweghị mmasị n’eziokwu Baịbụl ma ọ bụkwanụ chee na ndị na-achọghị ige gị ntị agaghị emecha gee ntị. Cheta na anyị bi n’oge ikpeazụ. N’ihi ya, ozi ọma anyị na-ekwusa dị ezigbo mkpa ugbu a. Ihe ị gwara ha taa nwere ike ịbara ha uru echi ma ọ bụdị ma oké mkpagbu malitechaa.c
Gịnị ga-eme ka anyị ghara ịda mbà n’inyere ndị ikwu anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova aka? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)e
KA OBI NA-ATỌ GỊ ỤTỌ MAKA IHE JEHOVA NA-ECHETARA ANYỊ
16. Olee otú ihe ndị Jehova na-echetara anyị sirila baara gị uru? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Jiri Ha Nyere Ndị Ọzọ Aka.”)
16 Ndị a na-ebu n’obi akwadebe ụfọdụ nri si n’Okwu Chineke anyị na-enweta bụ ndị na-anụtụbeghị gbasara eziokwu ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi. Dị ka ihe atụ, ndị e bu n’obi akwadebe okwu ihu ọha a na-ekwu n’ọgbakọ anyị kwa izu na ụfọdụ isiokwu na vidio dị na jw.org nakwa Ụlọ Nche ọhaneze na Teta! bụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova. Ma, ihe ndị e ji ha echetara anyị na-abara anyị uru. Ha na-eme ka anyị hụkwuo Jehova n’anya, na-eme ka anyị tụkwasịkwuo Okwu ya obi, na-enyekwara anyị aka ịna-akụzikwu eziokwu ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi nke ọma.—Ọma 19:7.
17. Olee mgbe i nwere ike iche gbasara eziokwu ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi?
17 Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, obi na-atọ anyị ụtọ ma a kọwakwuoro anyị eziokwu ndị dị na Baịbụl. N’agbanyeghị ya, obi dịkwa anyị ezigbo ụtọ maka ihe ndị mbụ e ji Baịbụl kụziere anyị, ndị mere ka anyị malite ịbịaru Chineke nso. Ọ bụrụ na e nwee mgbe ọ dị anyị ka anyị mee ihe anyị chọrọ kama irube isi ná ntụziaka si ná nzukọ Jehova, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma cheta na ọ bụ Jehova Chineke, Onye kacha ihe niile elu na Onye kacha nwee amamihe, na-eduzi ọgbakọ ya. Ọ bụrụ na anyị ma ọ bụ onye anyị hụrụ n’anya na-ata ahụhụ, ka anyị nwee ndidi ma cheta ihe mere Jehova ji kwe ka anyị na-ata ahụhụ. Anyị kpebiwe ihe anyị ga-eji oge anyị na ihe ndị anyị nwere eme, ka anyị cheta na anyị bi n’oge ikpeazụ bụ́ oge ọgwụgwụ ji ọsọ na-abịa. Ka ihe ndị Jehova na-echetara anyị na-eme ka anyị na-esikwu ike, na-achọkwu ife ya, ma na-enwekwu amamihe.
ABỤ NKE 95 Ìhè Na-enwusikwu Ike
a Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Mere Ahụhụ Nile Ga-eji Kwụsị n’Isi Nso,” nke gbara n’Ụlọ Nche May 15, 2007, peeji nke 21 ruo na nke 25.
c Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ihe Anyị Ma Gbasara Otú Jehova Ga-esi Kpee Ndị Mmadụ Ikpe n’Ọdịnihu?” nke gbara n’Ụlọ Nche Mee 2024, peeji nke 8 ruo na nke 13.
d NKỌWA FOTO: Ebe ndị okenye na-enwe nnọkọ, ma ha anabataghị aro otu okenye tụrụ. Mgbe e mechara, okenye ahụ nọ n’èzí n’abalị, chee gbasara otú Jehova maruru ihe na otú ọ dịruru ike, ma cheta na ihe Jehova chọrọ dị mkpa karịa ihe yanwa chọrọ.
e NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-amụ ihe n’onwe ya. Ọ na-amụ gbasara ihe ndị gosiri na anyị bi n’oge ikpeazụ. Ihe a mere ka ọ kpọọ nwanne ya nwaanyị zie ya ozi ọma.