Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Ọgọst p. 2-7
  • Otú Jehova Si Enyere Anyị Aka Ịtachi Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Jehova Si Enyere Anyị Aka Ịtachi Obi
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • EKPERE
  • OKWU CHINEKE
  • ỤMỤNNA ANYỊ
  • OLILEANYA ANYỊ
  • Na-echeta na Jehova Bụ “Chineke Dị Ndụ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Akwụkwọ Ozi Ga-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi Ruo Ọgwụgwụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Jehova “Na-akasi Ndị Obi Gbawara Obi”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Ọgọst p. 2-7

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 32

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

Otú Jehova Si Enyere Anyị Aka Ịtachi Obi

“Chineke, onye na-eme amara, . . . ga-eme ka unu kwụsie ike. Ọ ga-eme ka unu sie ike, meekwa ka unu kwụrụ chịm.”​—1 PITA 5:10.

IHE A GA-AMỤ

Ihe ndị Jehova nyere anyị iji nyere anyị aka ịtachi obi, nakwa ihe anyị ga-eme ka nke ọ bụla n’ime ha baara anyị uru.

1. Gịnị mere anyị ji kwesị ịtachi obi, oleekwa onye ga-enyere anyị aka? (1 Pita 5:10)

N’OGE ikpeazụ a tara akpụ, ndị Jehova kwesịrị ịna-atachi obi. Ụfọdụ na ọrịa na-alụ kemgbe ogologo oge. E nwere ndị mmadụ nwụnahụrụ, nweekwa ndị ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị ọchịchị na-akpagbu. (Mat. 10:18, 36, 37) Ka obi sie gị ike na n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla na-abịara gị, Jehova ga-enyere gị aka idi ya.​—Gụọ 1 Pita 5:10.

2. Olee ebe anyị bụ́ Ndị Kraịst si enweta ike anyị ji atachi obi?

2 Ịtachi obi pụtara na anyị ga na-erubere Jehova isi ma jiri ọṅụ na-efe ya ọ bụrụgodị na ihe na-esiri anyị ike, na a na-akpagbu anyị ma ọ bụ na-anwa anyị ọnwụnwa ime mmehie. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịtachi obi, anyị kwesịkwara ikweta na ihe ga-emecha dị mma. Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị agaghị atachili obi n’ike anyị. Ọ bụ Jehova ga-enye anyị ike anyị ga-eji atachi obi. Ọ bụ ya ga-enyeli anyị “ike karịrị ike mmadụ.” (2 Kọr. 4:7) N’isiokwu a, anyị ga-ekwu ihe anọ Jehova nyere anyị ga-enyere anyị aka ịtachi obi. Anyị ga-ahụkwa ihe anyị ga-eme ka nke ọ bụla n’ime ha baara anyị uru.

EKPERE

3. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ekpere bụ ọrụ ebube?

3 Jehova meere anyị ihe dị ịtụnanya ga-enyere anyị aka ịtachi obi. O mere ka o kwe anyị omume ịna-agwa ya okwu n’agbanyeghị na anyị bụ ndị mmehie. (Hib. 4:16) Chegodị gbasara ihe a: Anyị nwere ike ikpe ekpere n’oge ọ bụla anyị chọrọ nakwa maka ihe ọ bụla anyị chọrọ. Ọ ga-anụ ekpere anyị n’asụsụ ọ bụla anyị ji kpee ya nakwa n’ebe ọ bụla anyị nọ, ọ bụrụgodị na anyị nọ n’ebe dịpụrụ adịpụ ma ọ bụ n’ụlọ mkpọrọ. (Jona 2:1, 2; Ọrụ 16:25, 26) Ọ bụrụ na otú anyị si echegbu onwe anyị emee ka anyị ghara ịma ihe anyị ga-ekpe n’ekpere, Jehova ka ga-aghọta ihe anyị chọrọ ikwu. (Rom 8:26, 27) N’eziokwu, ekpere bụ ọrụ ebube.

4. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ikpe ekpere ka Chineke nyere anyị aka ịtachi obi dabara n’uche ya?

4 Na Baịbụl, Jehova mere ka obi sie anyị ike na “ihe ọ bụla anyị rịọrọ ya nke dabara n’uche ya, ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) Ànyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịtachi obi? Ee. Ọ dabara n’uche ya. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụrụ na anyị atachie obi ma ọnwụnwa bịara anyị, anyị na-eme ka Jehova nweta ihe ọ ga-aza Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye na-akwa ya emo. (Ilu 27:11) Ihe ọzọ bụ na Baịbụl kwuru na Jehova dị njikere ‘igosi ike ya maka ndị ji obi ha niile na-efe ya.’ (2 Ihe 16:9) N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova nwere ike ọ ga-eji enyere anyị aka ịtachi obi. Ọ chọkwara ime ya.​—Aịza. 30:18; 41:10; Luk 11:13.

5. Olee otú ekpere nwere ike isi mee ka obi ruo anyị ala? (Aịzaya 26:3)

5 Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na anyị agwa Jehova ihe na-echegbu anyị, ‘udo Chineke na-enye, nke karịrị nghọta mmadụ, ga-esi n’aka Kraịst Jizọs chee obi anyị na echiche anyị nche.’ (Fil. 4:7) Chegodị ihe ọ pụtara. Nsogbu na-abịakwara ndị na-anaghị efe Jehova. Ha na-agbalịkwa isi n’ụzọ dị iche iche eme ka obi ruo ha ala. Ụfọdụ n’ime ụzọ ndị ahụ nwere ike ịkpatara ha nsogbu. O nwedịrị ike ime ka ndị mmụọ ọjọọ nyewe ha nsogbu. (I nwere ike ịtụle Matiu 12:43-45.) Ọ bụrụgodị na ihe ndị ahụ ha na-eme na-eme ka obi ruo ha ala, ha enweghị udo Chineke na-enye, bụ́ udo ka ya mma okpukpu okpukpu. Ọ bụrụ na anyị agwa Jehova okwu n’ekpere, ọ na-egosi na anyị tụkwasịrị ya obi anyị niile. Ọ ga na-enyekwa anyị “udo mgbe niile.” (Gụọ Aịzaya 26:3.) Otu ụzọ Jehova si eme ihe a bụ ime ka anyị cheta eziokwu ndị anyị mụtara n’Okwu ya, ndị na-eme ka obi sie anyị ike. Eziokwu ndị ahụ na-eme ka obi ruo anyị ala n’ihi na anyị ma na Jehova na-eche gbasara anyị. Ọ chọkwara ka ihe gaziere anyị.​—Ọma 62:1, 2.

6. Olee ihe ndị i nwere ike ikpe n’ekpere? (Kọwaakwa foto.)

6 Ihe i nwere ike ime. Ka ị na-edi ọnwụnwa, “bunye Jehova ibu na-anyịgbu gị” ma kpee ekpere ka o nye gị udo ya. (Ọma 55:22) Kpeekwa ekpere ka Jehova nye gị amamihe ka i nwee ike ịma ihe ị ga-eme maka nsogbu bịaara gị. (Ilu 2:10, 11) Ka ị na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ịtachi obi, echefukwala ikele ya n’ekpere gị. (Fil. 4:6) Na-achọpụta ụzọ ndị Jehova si na-enyere gị aka n’ọnwụnwa gị, na-ekelekwa ya maka otú o si na-akwado gị. Ekwekwala ka ọnwụnwa bịaara gị mee ka ị ghara ịhụ otú Jehova si na-agọzi gị.​—Ọma 16:5, 6.

Ebe otu nwanna mere agadi nọ n’ụlọ ya na-ekpe ekpere n’oge oyi. Baịbụl e mepere emepe dị n’ụkwụ ya, ihe e ji etinye ọgwụ dịkwa n’elu tebụl dị n’akụkụ ya.

I kpewe ekpere, ị na-agwa Jehova okwu. Ị gụwa Baịbụl, Jehova na-agwa gị okwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)b


OKWU CHINEKE

7. Olee otú ịmụ Baịbụl si enyere anyị aka ịtachi obi?

7 Jehova enyela anyị Okwu ya ka o nyere anyị aka ịtachi obi. E nwere ọtụtụ amaokwu Baịbụl ndị na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-akwado anyị. Ka anyị lee otu n’ime ha. Matiu 6:8 sịrị: “Nna unu ma ihe na-akpa unu tupu unu arịọ ya.” Ọ bụ Jizọs kwuru ihe a. Ọ makwa Jehova nke ọma karịa onye ọ bụla ọzọ. N’ihi ya, anyị tawa ahụhụ, ọ naghị eme anyị obi abụọ na ihe gbasara anyị na-emetụ Jehova n’obi. Baịbụl kwukwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ yiri ya ga-eme ka anyị kpebisikwuo ike ịtachi obi.​—Ọma 94:19.

8. (a) Olee otu n’ime ndụmọdụ ndị Baịbụl nyere anyị ga-enyere anyị aka ịtachi obi? (b) Gịnị nwere ike inyere anyị aka icheta ndụmọdụ dị na Baịbụl mgbe ọ dị anyị mkpa?

8 Baịbụl na-enye anyị ndụmọdụ ndị na-enyere anyị aka ịmụta ịtachi obi. Ndụmọdụ ndị ahụ ga-eme ka anyị na-eme ezigbo mkpebi. (Ilu 2:6, 7) Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara ichegbu onwe anyị maka echi, kama ka anyị tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere anyị aka n’ụbọchị nke ọ bụla. (Mat. 6:34) Ọ bụrụ na ọ marala anyị ahụ́ ịna-agụ Baịbụl na ịna-atụgharị uche na ya kwa ụbọchị, o nwere ike ime ka anyị cheta ihe ndị ga-enyere anyị aka n’oge ọ dị anyị mkpa.

9. Olee otú akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl si eme ka obi sikwuo anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka?

9 Baịbụl kọkwara gbasara ndị dị ka anyị, ndị tụkwasịrị Jehova obi, ya akwadokwa ha. (Hib. 11:32-34; Jems 5:17) Ọ bụrụ na anyị ana-echebara ụdị akụkọ ndị ahụ echiche, ọ na-eme ka obi sikwuo anyị ike na Jehova bụ “ebe mgbaba anyị na ike anyị,” nakwa na “ọ dị njikere inyere anyị aka n’oge nsogbu.” (Ọma 46:1) Ọ bụrụ na anyị achọpụta otú ndị fere Jehova n’oge gara aga si tachie obi, ọ na-eme ka anyị ṅomie okwukwe ha na ntachi obi ha.​—Jems 5:10, 11.

10. Gịnị ka ị ga-eme ka Okwu Chineke baara gị ezigbo uru?

10 Ihe i nwere ike ime. Na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Na-edepụtakwa amaokwu Baịbụl ndị na-enyere gị aka. Ọtụtụ ndị achọpụtakwala na ịgụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ụtụtụ na-aba uru. Ọ na-eme ka ha nwee ihe na-agba ume ha ga na-eche ụbọchị ahụ niile. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Marie.a Ọ matara na ihe a bụ eziokwu mgbe a chọpụtara na mama ya na papa ya na-arịa kansa. Gịnị nyeere ya aka ịtachi obi ka ọ na-elekọta nne na nna ya tupu ha anwụọ? Ọ sịrị: “N’ụtụtụ ọ bụla, m na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị ma chebara ya echiche. Ime ihe a mere ka obi m na-adị n’ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ. O nyekwaara m aka ilekwasị anya n’ihe dị mkpa karịa onwe m nakwa nsogbu m nọ na ya.”​—Ọma 61:2.

ỤMỤNNA ANYỊ

11. Olee otú obi na-adị anyị ma anyị cheta otú ụmụnna anyị si na-atachi obi ná nsogbu ndị bịaara ha?

11 Jehova nyere anyị ụmụnna anyị ka ha na-enyere anyị aka ịtachi obi. Naanị ịmara na ‘ụmụnna anyị niile ndị nọ n’ụwa na-ata ụdị ahụhụ a anyị na-ata’ na-eme ka obi sie anyị ike na anyị anọghị naanị anyị. (1 Pita 5:9) N’eziokwu, obi kwesịrị isi anyị ike na n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara anyị, e nweela ndị ụdị nsogbu ahụ bịaara, ha atachie obi. Ihe ọ pụtara bụ na anyịnwa ga-atachilikwa obi.​—Ọrụ 14:22.

12. Olee otú ụmụnna anyị nwere ike isi enyere anyị aka? Oleekwa ihe anyị nwere ike imere ha? (2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4)

12 Ka anyị na-atachi obi, ụmụnna anyị nwekwara ike ịgba anyị ume. Pọl onyeozi chọpụtara na ihe a bụ eziokwu. O kwuru ọtụtụ ugboro otú obi si dị ya ụtọ maka ndị nyeere ya aka n’oge a tụrụ ya mkpọrọ n’ụlọ ya. Ọ kpọrọ ha aha. Ha kasiri ya obi, gbaa ya ume, nyekwara ya aka. (Fil. 2:25, 29, 30; Kọl. 4:10, 11) Taa, ụmụnna anyị nwekwara ike imere anyị ụdị ihe ahụ. E nwere ike inwe mgbe e kwesịrị inyere anyị aka ka anyị nwee ike ịtachi obi. Ụmụnna anyị na-enyekwara anyị aka. Ọ bụrụkwa na ha chọrọ enyemaka, anyịnwa na-enyere ha aka.​—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.

13. Gịnị nyeere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Maya aka ịtachi obi?

13 Ụmụnna gbara otu nwanna nwaanyị bi na Rọshịa aha ya bụ Maya ezigbo ume. Ndị uwe ojii kwaghasịrị ụlọ ya chọọ ihe n’afọ 2020. E mechara kpọpụ ya ụlọikpe n’ihi na ọ na-akọrọ ndị ọzọ ihe o kweere. Ọ sịrị: “N’oge ezigbo ike gwụrụ m, ụmụnna m kpọrọ m n’ekwentị, detara m akwụkwọ ozi, mee ka obi sie m ike na ha hụrụ m n’anya. Ọ dịla anya m ma na enwere m ezinụlọ buru ibu hụrụ m n’anya. Mana kemgbe afọ 2020, obi esikwuola m ike na ya.”

14. Gịnị ka anyị ga-eme ka enyemaka ụmụnna anyị baara anyị uru? (Kọwaakwa foto.)

14 Ihe i nwere ike ime. Ka ị na-atachi obi, na-akpa ụmụnna gị nso. Egbula oge ịgwa ndị okenye ka ha nyere gị aka. Ndị okenye nwere ike ịbụ “ebe mmadụ na-agbaba ka o zere ifufe nakwa ebe mmadụ na-agbaba ka o zere nnukwu mmiri ozuzo.” (Aịza. 32:2) Cheta na ụmụnna gị nwekwara nsogbu ndị nke ha. Imere onye nọ ná nsogbu ihe ọma nwere ike inyere gị aka ịna-enwe obi ụtọ ka ị na-edi nsogbu nke gị.​—Ọrụ 20:35.

Ebe nwanna ahụ e gosiri na foto bu ụzọ nọ n’ụlọ ya n’ihe dị ka n’ọnwa Eprel, ya na otu di na nwunye na ụmụ ha ndị nwaanyị abụọ ejiri obi ụtọ na-akparịta. E nwere mkpara na mkpọ ọgwụ ụfọdụ dị n’akụkụ ya. Otu n’ime ụmụ nwanna ahụ na-egosi nwanna ahụ mere agadi foto Paradaịs.

Na-akpa ụmụnna gị nso (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)c


OLILEANYA ANYỊ

15. Olee otú inwe olileanya si nyere Jizọs aka? Oleekwa otú o si enyere anyịnwa aka? (Ndị Hibru 12:2)

15 Jehova mere ka anyị nwee olileanya siri ike na-enyere anyị aka ịtachi obi. (Rom 15:13) Cheta otú olileanya si nyere Jizọs aka idi ụbọchị kacha taara ya akpụ n’ụwa. (Gụọ Ndị Hibru 12:2.) Jizọs ma na ọ bụrụ na o rubere Jehova isi n’agbanyeghị ahụhụ ọ ga-ata, ọ ga-eso eme ka a mata na Jehova bụ onye eziokwu. Jizọs na-atụkwa anya oge ọ ga-alakwuru Nna ya na oge ọ ga-abụ Eze, ya na ụmụnna ya e tere mmanụ esoro na-achị. Otú ahụ ka olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ si enyere anyị aka ịtachi obi n’agbanyeghị ahụhụ ọ bụla ụwa Setan mere ka anyị taa.

16. Olee otú olileanya si nyere otu nwanna nwaanyị aka ịtachi obi? Gịnị ka ị mụtara n’ihe o kwuru?

16 E nwere otu nwanna nwaanyị bi na Rọshịa aha ya bụ Alla. Ka anyị hụ otú olileanya ibi n’Alaeze Chineke si nyere ya aka. A nwụchiri di ya, tụọ ya mkpọrọ, ya anọrọ ebe ahụ na-eche mgbe a ga-ekpe ya ikpe. Mgbe ihe a mere, Nwanna Nwaanyị Alla sịrị: “Ikpe ekpere gbasara olileanya anyị na ịtụgharị uche na ya mere ka ike ụwa ghara ịgwụ m. Ama m na oge ahụ gachaa, ihe ga-adị mma. Jehova ga-emeri ndị iro ya, kwụọkwa anyị ụgwọ.”

17. Olee otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka olileanya Baịbụl mere ka anyị nwee? (Kọwaakwa foto.)

17 Ihe i nwere ike ime. Wepụta oge chee banyere ihe ndị magburu onwe ha Jehova ga-emere anyị n’ọdịnihu. Na-ahụ onwe gị n’ụwa ọhụrụ nakwa ihe ọma ndị anyị ga-enweta n’oge ahụ. Anyị mee otú ahụ, nsogbu ndị na-abịara anyị ugbu a ga-adị ka ihe na-agaghị ‘adịte aka, idi ha ga-adịkwa mfe’ ma e jiri ha tụnyere ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs. (2 Kọr. 4:17) Meekwa ihe niile i nwere ike ime ịkọrọ ndị ọzọ gbasara ihe i kweere ga-eme n’ọdịnihu. Chegodịnụ otú o si na-esiri ndị mmadụ ike ịna-ata ahụhụ n’ụwa Ekwensu a n’amaghị na e nwere nkwa Chineke kwere maka ọdịnihu. Obere ụka gị na ha kparịtara nwere ike ime ka ha nwee mmasị n’olileanya anyị nwere maka Alaeze Chineke.

Ebe nwanna ahụ mere agadi nọ n’ụlọ ya n’ihe dị ka n’ọnwa Ọktoba na-eche gbasara foto Paradaịs dị na tablet ya. E nwere ihe e ji aga ije na mkpọ ọgwụ ụfọdụ dị n’akụkụ ya.

Wepụta oge chee gbasara ihe ndị magburu onwe ha Jehova ga-emere anyị n’ọdịnihu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)d


18. Gịnị mere anyị kwesịrị iji tụkwasị nkwa Jehova obi?

18 Mgbe Job dichara ọtụtụ ahụhụ bịaara ya, ọ gwara Jehova, sị: “Ugbu a, amatala m na i nwere ike ime ihe niile. E nweghị ihe ọ bụla i bu n’obi ime nke ị na-agaghị emeli.” (Job 42:2) Job matara na o nweghị ihe ọ bụla ga-eme ka Jehova ghara imezu nzube ya. Eziokwu a na-eme ka obi sie anyị ike ịtachi obi. Iji maa atụ, weregodị ya na ike ụwa gwụrụ otu nwaanyị na-arịa ọrịa n’ihi na ọtụtụ ndị dọkịta agwọlighị ya. Mana mgbe otu dọkịta bụ́ aka ochie n’ịgwọ ọrịa chọpụtara ihe bụ́ nsogbu ya, kọwaakwara ya otú ọ ga-esi agwọ ya, obi bịara ruo ya ala n’agbanyeghị na ọ ga-ewetụ oge tupu ya agbakee. Ọ ga-atachili obi ugbu a n’ihi na ọ ma na o nwere olileanya na ọ ga-emecha gbakee. Otú ahụ ka ọ ga-adị anyị ma anyị mee ka obi sie anyị ike na Paradaịs ga-abịa n’eziokwu. Ọ ga-enyere anyị aka ịna-atachi obi.

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike ịna-atachi obi?

19 Dị ka anyị chọpụtarala, Jehova na-eji ekpere, Okwu ya bụ́ Baịbụl, ụmụnna anyị, na olileanya anyị nwere enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị. Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ndị a niile na-eme ihe ga-abara anyị uru, Jehova ga-enyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla bịaara anyị ruo ụbọchị nsogbu ụwa Setan ga-ala ka naị.​—Fil. 4:13.

OLEE OTÚ JEHOVA SI EJI IHE NDỊ A EME KA ANYỊ TACHIE OBI?

  • Ekpere na Okwu ya bụ́ Baịbụl

  • Ụmụnna anyị

  • Olileanya anyị

ABỤ NKE 33 Tụkwasị Jehova Ibu Gị

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

b NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna merela agadi na-atachi obi n’oge niile n’afọ.

c NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna merela agadi na-atachi obi n’oge niile n’afọ.

d NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna merela agadi na-atachi obi n’oge niile n’afọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya