Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Ọgọst p. 8-13
  • Ka Obi Sie Gị Ike na Jehova Hụrụ Gị n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ka Obi Sie Gị Ike na Jehova Hụrụ Gị n’Anya
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE ANYỊ JI KWESỊ IKWETA NA JEHOVA HỤRỤ ANYỊ N’ANYA
  • GỊNỊ GA-ENYERE ANYỊ AKA IKWETA NA JEHOVA HỤRỤ ANYỊ N’ANYA?
  • OTÚ JIZỌS SI ENYERE ANYỊ AKA IKWETA NA JEHOVA HỤRỤ ANYỊ N’ANYA
  • NA-EME KA OBI SIKWUO GỊ IKE NA JEHOVA HỤRỤ GỊ N’ANYA
  • Ihe Banyere Gị Na-emetụ Jehova n’Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Gịnị Ka Ihe Mgbapụta Na-akụziri Anyị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ka Ịhụnanya Mee Ka Ị Na-ekwusa Ozi Ọma
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Ọgọst p. 8-13

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 33

ABỤ NKE 4 “Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”

Ka Obi Sie Gị Ike na Jehova Hụrụ Gị n’Anya

“Ọ bụ otú a m si hụ gị n’anya mere m ji dọta gị ebe m nọ.”​—JERE. 31:3.

IHE A GA-AMỤ

Ihe mere anyị ji kwesị ikweta na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa otú anyị ga-esi eme ka obi sikwuo anyị ike na ọ hụrụ anyị n’anya.

1. Gịnị mere i ji nyefee Jehova onwe gị? (Kọwaakwa foto.)

Ì CHETARA oge i nyefere Jehova onwe gị? Ihe mere i ji kpebie ime ya bụ na ị matala Jehova ma hụ ya n’anya. I kwere ya nkwa na ị ga-ewere ofufe ya ka ihe kacha mkpa ná ndụ gị nakwa na ị gaghị akwụsị iji obi gị niile na mkpụrụ obi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ ya n’anya. (Mak 12:30) Kemgbe ahụ, ị na-ahụkwu ya n’anya. Ma, olee ihe ị ga-aza ma mmadụ jụọ gị, sị: “Ì ji n’aka na ị hụrụ Jehova n’anya?” Ị gaghị egbu oge ịza ya, sị, “Ahụrụ m ya n’anya karịa onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla.”

Foto ndị na-egosi: Ebe otu nwanna nwaanyị na-eche gbasara nnyefe o nyefere Jehova onwe ya na baptizim o mere. 1. Ebe ọ nọ ọdụ n’èzí na-ekpe ekpere. 2. Ebe a na-eme ya baptizim n’ime mmiri.

Ì chetara otú i si hụ Jehova n’anya mgbe i nyefere ya onwe gị ma mee batpizim? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1)


2-3. Gịnị ka Jehova chọrọ ka obi sie anyị ike na ya? Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a? (Jeremaya 31:3)

2 Ma, gịnịkwanụ ka ị ga-aza ma mmadụ jụọ gị, sị, “Obi ò siri gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya?” Ị̀ ga-egbu oge ịza ya? I nwere ike ịna-eche na i rughị eru ka Jehova hụ gị n’anya. Otu nwanna nwaanyị a na-ahụghị n’anya mgbe ọ na-etolite sịrị: “Ama m na m hụrụ Jehova n’anya. Ọ naghị eme m obi abụọ. Ọtụtụ mgbe, ihe na-eme m obi abụọ bụ ma Jehova ọ̀ hụrụ m n’anya.” N’ihi ya, gịnị ga-enyere gị aka ịmata otú Jehova si were gị?

3 Jehova chọrọ ka obi sie gị ike na ọ hụrụ gị n’anya. (Gụọ Jeremaya 31:3 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova dọtara gị n’ebe ọ nọ. Mgbe i nyefere ya onwe gị ma mee baptizim, i nwetara ihe bara ezigbo uru, ya bụ, ịhụnanya ya pụrụ iche. Ihe a pụtara na ọ hụrụ gị n’anya nke ukwuu. Ọ gaghịkwa ahapụ gị. Ebe ọ bụ na Jehova hụrụ ndị ohu ya n’anya otú pụrụ iche, ọ na-ewere ha ka “ndị pụrụ iche,” ma gịnwa. (Mal. 3:17) Jehova chọrọ ka obi sie gị ike na ọ hụrụ gị n’anya otú ahụ o siri Pọl. Pọl ji obi ike dee, sị: “Ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị ga-abịa abịa ma ọ bụ ike ma ọ bụ ihe ndị dị n’elu ma ọ bụ ihe ndị dị n’okpuru ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ime ka Chineke kwụsị ịhụ anyị n’anya.” (Rom 8:38, 39) N’isiokwu a, anyị ga-amụ ihe mere anyị ga-eji mee ka obi sikwuo anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa ihe ga-enyere anyị aka ime otú ahụ.

IHE MERE ANYỊ JI KWESỊ IKWETA NA JEHOVA HỤRỤ ANYỊ N’ANYA

4. Olee otu ụgha Ekwensu chọrọ ka anyị kweta, oleekwa otú anyị nwere ike isi ajụ ya?

4 Ọ bụrụ na anyị ekweta na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ ga-enyere anyị aka ịlụso otu n’ime “aghụghọ” Ekwensu ọgụ. (Efe. 6:11) Ekwensu ga-eme ihe niile o nwere ike ime ka anyị kwụsị ife Jehova. Otu n’ime ụzọ aghụghọ ndị o ji agbalị ime ya bụ ime ka anyị kweta ụgha bụ́ na Jehova ahụghị anyị n’anya. Echefula na Ekwensu na-achọ ohere ọ ga-eji rie anyị. Ọ na-alụsokarị anyị ọgụ mgbe anyị na-adịghị ike. O nwere ike ịbụ mgbe anyị chegbuwere onwe anyị gbasara ihe ndị mere anyị n’oge gara aga, nsogbu ndị anyị na ha na-alụ ugbu a, ma ọ bụkwanụ ihe ndị nwere ike ime n’ọdịnihu. (Ilu 24:10) Ekwensu dị ka ọdụm na-achọ ohere ọ ga-eji eri anụ na-agaghị echebeli onwe ya. N’ihi ya, ọ na-agbalị inweta anyị n’oge anyị dara mbà ka o mee ka anyị kwụsị ife Jehova. Mana ọ bụrụ na anyị ana-eme ka obi sikwuo anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ ga-eme ka anyị jikere ‘ịlụso’ Ekwensu na aghụghọ ya dị iche iche ọgụ.​—1 Pita 5:8, 9; Jems 4:7.

5. Gịnị mere anyị ji kwesị ịghọta na Jehova hụrụ anyị n’anya ma jiri anyị kpọrọ ihe?

5 Ọ bụrụ na anyị ekweta na Jehova hụrụ anyị n’anya, anyị ga-abịarukwu ya nso. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo otú ahụ? Jehova kere anyị otú anyị ga na-ahụ ndị ọzọ n’anya nakwa otú anyị ga-achọ ka ndị ọzọ hụ anyị n’anya. Ọ bụrụ na mmadụ ahụ anyị n’anya, anyị na-ahụkwa ya n’anya. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị aghọta na Jehova hụrụ anyị n’anya ma jiri anyị kpọrọ ihe, ọ ga-emekwa ka anyị na-ahụkwu ya n’anya. (1 Jọn 4:19) Ka anyị na-ahụkwu ya n’anya, ọ ga na-ahụkwu anyị n’anya. Baịbụl gwara anyị, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Ma, olee otú anyị ga-esi eme ka obi sie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya?

GỊNỊ GA-ENYERE ANYỊ AKA IKWETA NA JEHOVA HỤRỤ ANYỊ N’ANYA?

6. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ikweta na Jehova hụrụ anyị n’anya, gịnị ka anyị kwesịrị ikpe n’ekpere?

6 Na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ịghọta na ọ hụrụ gị n’anya. (Luk 18:1; Rom 12:12) O nwere ike ịdị mkpa ka i kpee ekpere ọtụtụ ugboro n’ụbọchị ka Jehova nyere gị aka ịna-ele onwe gị anya otú o si ele gị. Mgbe ụfọdụ, obi nwere ike ịna-ama gị ikpe, ya esiere gị ike ikweta na Jehova hụrụ gị n’anya. Ma, cheta na Jehova karịrị obi gị. (1 Jọn 3:19, 20) Ọ ma gị nke ọma karịa ka ị ma onwe gị. Ọ na-ahụ àgwà ọma gị o nwere ike ịbụ na ị naghị ahụ. (1 Sam. 16:7; 2 Ihe 6:30) N’ihi ya, egbula oge ‘ịgwa ya ihe niile dị gị n’obi.’ Rịọ ya ka o nyere gị aka ikweta na ọ hụrụ gị n’anya. (Ọma 62:8) I kpechaa ekpere, i kwesịrị ime ihe ndị anyị ga-ekwu gbasara ha ugbu a.

7-8. Olee otú Abụ Ọma si eme ka obi sie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya?

7 Tụkwasị ihe Jehova kwuru obi. Jehova mere ka ndị dere Baịbụl kọwaa ụdị onye ọ bụ. Legodị otú magburu onwe ya Devid si kọwaa Jehova. Ọ sịrị: “Jehova nọ ndị obi gbawara nso. Ọ na-azọpụta ndị ike ụwa gwụrụ.” (Ọma 34:18) Ọ bụrụ na obi adaa gị mbà, o nwere ike ịdị gị ka e nweghị onye ga-enyere gị aka. Mana, Jehova kwere nkwa na n’ụdị oge ahụ, ọ nọ gị nso n’ihi na ọ ma na o kwesịrị inyere gị aka. N’abụ ọma ọzọ, Devid dere, sị: “Biko, gbanye anya mmiri m n’ime karama akpụkpọ gị.” (Ọma 56:8) Jehova na-ahụ anyị mgbe obi na-ajọ anyị njọ ma ọ bụ mgbe anyị nọ n’ihe mgbu. Nsogbu ndị na-abịara anyị nakwa ihe ndị na-ewute anyị na-emetụ ya n’obi. E nwere ike ịsị na ọ na-agbanye anya mmiri anyị na karama akpụkpọ ya, jirikwa ya kpọrọ ihe otú ahụ onye na-aga n’ọzara na-eji mmiri ọ gbanyere na karama ya akpọrọ ezigbo ihe. N’Abụ Ọma 139:3, Devid gwara Jehova, sị: “Ị makwa ihe niile m na-eme.” Jehova na-ahụ ihe niile ị na-eme. Mana uche ya dị n’ihe ọma ndị ị na-eme. (Hib. 6:10) Maka gịnị? Ọ bụ maka na o ji mbọ ọ bụla ị na-agba ime ya obi ụtọ kpọrọ ihe.a

8 E nwere ike ikwu na Jehova ji amaokwu ndị a na-akasi obi na-agwa gị, sị: “Achọrọ m ka ị mata na m hụrụ gị n’anya nakwa na ihe gbasara gị na-emetụ m n’obi.” Mana dị ka anyị kwuburu, Setan na-ekwu na Jehova ahụghị gị n’anya. N’ihi ya, ọ bụrụ na o mewe gị obi abụọ mgbe ụfọdụ ma Jehova ọ̀ hụrụ gị n’anya, kwụsịtụ jụọ onwe gị, sị: ‘Ònye ka m ga-ekwere ihe o kwuru? Ọ̀ bụ “nna ụgha,” ka ọ̀ bụ “Chineke, onye eziokwu”?’​—Jọn 8:44; Ọma 31:5.

9. Olee nkwa Jehova kwere ndị hụrụ ya n’anya? (Ọpụpụ 20:5, 6)

9 Na-eche gbasara otú obi na-adị Jehova n’ebe ndị hụrụ ya n’anya nọ. Ka anyị leba anya n’ihe Jehova gwara Mosis na ndị Izrel. (Gụọ Ọpụpụ 20:5, 6.) Jehova kwere nkwa na ọ gaghị akwụsị igosi ndị hụrụ ya n’anya ịhụnanya pụrụ iche. Ihe a Jehova kwuru na-eme ka obi sie anyị ike na Chineke anyị kwesịrị ntụkwasị obi agaghị ahapụ ịhụ ndị hụrụ ya n’anya n’anya. (Nehe. 1:5) N’ihi ya, e nwee mgbe ị chọrọ ka obi sie gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya, kwụsịtụ ma jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ hụrụ Jehova n’anya?’ Gị echezie gbasara ihe a: Ọ bụrụ na ị hụrụ ya n’anya ma na-agbalịsi ike ime ihe dị ya mma, obi kwesịrị isi gị ike na ọ hụrụ gị n’anya nke ukwuu. (Dan. 9:4; 1 Kọr. 8:3) Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na obi siri gị ike na ị hụrụ Jehova n’anya, obi kwesịkwara isi gị ike na yanwa hụrụ gị n’anya. Ka obi sie gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya mgbe niile nakwa na ọ gaghị ahapụ gị.

10-11. Olee otú Jehova chọrọ ka anyị si were ihe mgbapụta? (Ndị Galeshia 2:20)

10 Na-eche gbasara ihe mgbapụta. Ọnwụ Jizọs nwụrụ iji gbapụta anyị ná mmehie bụ onyinye kachanụ Jehova nyere ụmụ mmadụ. (Jọn 3:16) Ma, ọ̀ bụ onyinye Chineke nyere gịnwa? Ee. Ka anyị kwuo gbasara Pọl onyeozi. Cheta na o mere ụfọdụ mmehie dị oké njọ tupu ya aghọọ Onye Kraịst. O kwesịkwara ịna-alụso ebe ndị ọ na-adịghị ike ọgụ. (Rom 7:24, 25; 1 Tim. 1:12-14) N’agbanyeghị ya, o weere ihe mgbapụta ka onyinye Jehova nyere yanwa. (Gụọ Ndị Galeshia 2:20.) Cheta na ọ bụ Jehova mere ka Pọl dee ihe ndị a. Ihe ọ bụla dịkwa na Baịbụl bụ ihe e ji akụziri anyị ihe. (Rom 15:4) Ihe Pọl kwuru na-egosi otú Jehova chọrọ ka gịnwa si were ihe mgbapụta, ya bụ, ka onyinye Jehova nyere gị. Ọ bụrụ na i were ihe mgbapụta otú a, obi ga-esikwu gị ike na Jehova hụrụ gịnwa n’anya.

11 Anyị na-ekele Jehova maka izite Jizọs n’ụwa ka ọ bịa nwụọ maka anyị. Mana ihe ọzọ mere Jizọs ji bịa n’ụwa bụ ka ọ gwa ndị mmadụ eziokwu gbasara Chineke. (Jọn 18:37) Ihe so n’eziokwu ahụ bụ otú Jehova si were ụmụ ya.

OTÚ JIZỌS SI ENYERE ANYỊ AKA IKWETA NA JEHOVA HỤRỤ ANYỊ N’ANYA

12. Gịnị mere anyị ji kwesị ikweta otú Jizọs si kọwaa Jehova?

12 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o ji obi ya niile kọwaa ụdị onye Jehova bụ. (Luk 10:22) Anyị kwesịrị ikweta ihe Jizọs kwuru gbasara Jehova. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jizọs na Nna ya anọọla n’eluigwe ọtụtụ ijeri afọ tupu ya abịa n’ụwa. (Kọl. 1:15) Jizọs ma na Nna ya hụrụ ya n’anya. Ọ hụkwala otú o si gosi na ọ hụrụ ndị mmụọ ozi na ndị na-efe ya n’ụwa n’anya. Olee otú Jizọs si nyere ndị ọzọ aka ịghọta na Jehova hụrụ ha n’anya?

13. Olee otú Jizọs chọrọ ka anyị si were Jehova?

13 Jizọs chọrọ ka anyị were Jehova otú yanwa si were ya. N’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn, Jizọs kwuru na Jehova bụ “Nna” ihe karịrị ugboro otu narị na iri isii (160). Ọ gwawa ndị na-eso ụzọ ya okwu, ọ na-ekwukarị “Nna unu” ma ọ bụ “Nna unu nọ n’eluigwe.” (Mat. 5:16; 6:26) Tupu Jizọs abịa n’ụwa, ụfọdụ ndị fere Jehova turu ya aha ndị dị ka “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,” “Onye Kacha Elu,” na ‘Onye Ukwu kere anyị.’ Mana, Jizọs na-akpọkarị Jehova “Nna anyị.” Ihe a na-egosi na Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya were ya ka Nna ha otú nwatakịrị si ewere nna hụrụ ya n’anya. O doro anya na Jizọs chọrọ ka anyị were Jehova otú yanwa si were ya, ya bụ, ka Nna anyị hụrụ anyị n’anya, onye jikwa ụmụ ya kpọrọ ihe. Ka anyị kwuo gbasara oge abụọ Jizọs kpọrọ Jehova “Nna.”

14. Olee otú Jizọs si gosi na onye ọ bụla n’ime anyị bara uru n’anya Nna anyị nke eluigwe? (Matiu 10:29-31) (Kọwaakwa foto.)

14 Nke mbụ, chegodị gbasara ihe Jizọs kwuru na Matiu 10:29-31. (Gụọ ya.) Nza bụ nnụnụ dị ezigbo obere na-agaghị ahụli Jehova n’anya ma ọ bụ fee ya. N’agbanyeghị ya, Nna anyị ji otu nza kpọrọ ezigbo ihe nke na ọ ma mgbe nke ọ bụla dara n’ala. Ihe a na-egosi na ọ hụrụ ndị na-efe ya n’anya ma jiri ha kpọrọ ihe n’ihi na ha hụrụ ya n’anya. Ihe e ji kọwaa okwu bụ́ “ọ madị ole ntutu niile dị n’isi unu dị” n’amaokwu nke 30 sịrị: “Ebe ọ bụ na Jehova ma gbasara ihe a yiri ihe dị obere, ọ na-eme ka obi sie anyị ike na o ji onye ọ bụla na-eso ụzọ Jizọs kpọrọ ezigbo ihe.” N’eziokwu, Jizọs chọrọ ka anyị kweta na onye ọ bụla n’ime anyị bara uru n’anya Nna anyị nke eluigwe.

Ebe Jizọs na-atụ nza na-ebere n’okooko osisi aka. Ndị na-eso ụzọ ya nọ na-ege ntị nke ọma.

Ebe ọ bụ na Jehova hụrụ nza nke ọ bụla n’anya nke na ọ ma mgbe ọ dara n’ala, ka obi sie gị ike na ọ hụrụ gị n’anya nke ukwuu n’ihi na ị na-efe ya ma hụ ya n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)


15. Gịnị ka ihe Jizọs kwuru na Jọn 6:44 na-akụziri gị gbasara Nna gị nke eluigwe?

15 Ka anyị tụlee oge nke abụọ Jizọs kpọrọ Jehova “Nna.” (Gụọ Jọn 6:44.) Nna gị nke eluigwe ji aka ya mee ka ị mata ya ma hụ ya n’anya. Gịnị mere o ji mee ya? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ na i nwere ezigbo obi. (Ọrụ 13:48) Ihe e ji kọwaa Jọn 6:44 sịrị na o nwere ike ịbụ na Jizọs na-ekwu gbasara ihe Jeremaya kwuru n’amaokwu Baịbụl e si nweta isiokwu a. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụ otú a m si hụ gị n’anya mere m ji dọta gị ebe m nọ.” (Jere. 31:3; i nwere ike ịtụle Hosia 11:4.) Chegodị gbasara ihe ihe a pụtara. Nna anyị nke eluigwe na-ahụ àgwà ọma ndị i nwere o nwere ike ịbụ na ị naghị ahụ.

16. (a) Gịnị ka Jizọs kụziiri anyị, gịnịkwa mere anyị kwesịrị iji kweta ihe o kwuru? (b) Gịnị ka ị ga-eme ka obi sikwuo gị ike na Jehova bụ Nna dị gị mkpa? (Kwuokwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “Nna nke Dị Anyị Nile Mkpa.”)

16 Mgbe Jizọs kwuru na Jehova bụ Nna anyị, ihe ọ na-agwa anyị bụ: “Jehova abụghị naanị Nna m. Ọ bụkwa Nna gị. Achọrọ m ka obi sie gị ike na ọ hụrụ gị n’anya nakwa na ihe gbasara gị na-emetụ ya n’obi.” N’ihi ya, mgbe ọ bụla o mewere gị obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụkwara gị n’anya, jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ikweta ihe Ọkpara Chineke ma Nna ya nke ọma kwuru ebe ọ bụkwanụ na ọ na-ekwu eziokwu mgbe niile?’​—1 Pita 2:22.

“Nna nke Dị Anyị Nile Mkpa”

E kwuru ihe a n’okwu mmalite akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Mgbe ọ na-ekwu ihe e bu n’obi dee akwụkwọ ahụ, ọ sịrị: “Anyị ga-ahụ na ọ bụ Jehova bụ . . . Nna nke dị anyị nile mkpa. N’ịbụ onye dị ike, nke na-ekpe ikpe ziri ezi, nke nwere amamihe, na onye na-ahụ n’anya, ọ dịghị mgbe ọ na-ahapụ ụmụ ya na-ekwesị ntụkwasị obi.”

Otu onye gụrụ akwụkwọ a nna ya na-emesi ike mgbe ọ na-eto eto kọwara otú akwụkwọ a si nyere ya aka. Ọ sịrị: “Akwụkwọ a kụziiri m na okwu bụ́ ‘nna’ abụghị okwu mmadụ ga-anụ, ya agbawa ọsọ. Aghọtala m ugbu a na Chineke bụ ezigbo Nna. Ama m na Chineke weere m ka nwa ya, mụnwa wekwaara ya ka Nna m.” Onye ọzọ gụkwara akwụkwọ a sịrị: “N’eziokwu, Jehova bụ Nna kacha mma m nwere ike ichetụ n’echiche.”

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka obi sikwuo gị ike na Jehova bụ Nna dị gị mkpa, gbalịa gụọ akwụkwọ a ma ọ bụ gụọ ya ọzọ ma ọ bụrụ na ị gụbuola ya.

NA-EME KA OBI SIKWUO GỊ IKE NA JEHOVA HỤRỤ GỊ N’ANYA

17. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya?

17 Anyị niile kwesịrị ịna-eme ka obi na-esikwu anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya. Dị ka anyị mụtarala, Setan bụ́ onye iro anyị agaghị akwụsị ịgbalị ime ka anyị kwụsị ife Jehova. Otu n’ime ihe ndị ọ ga-eji achọ ime ka anyị kwụsị ife Jehova bụ ime ka anyị kweta na Jehova ahụghị anyị n’anya. Ka anyị ghara ikwe ka Setan merie.​—Job 27:5.

18. Olee otú ị ga-esi eme ka obi sikwuo gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya?

18 Na-ekpe ekpere ka Jehova nyere gị aka ịna-ele onwe gị anya otú o si ele gị. Ihe a ga-eme ka obi sikwuo gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya. Chee gbasara amaokwu Baịbụl ndị kọwara otú Jehova si jiri ndị hụrụ ya n’anya kpọrọ ezigbo ihe. Cheta na mmadụ agaghị ahụ Jehova n’anya, ya ahapụ ịhụkwa onye ahụ n’anya. Tụgharịakwa uche n’ihe mere ị ga-eji were ihe mgbapụta ka onyinye Jehova nyere gịnwa. Cheta na Jizọs kwuru na Jehova bụ Nna gị nke eluigwe. Ọ bụrụzie na onye ọ bụla ajụọ gị, sị: “Obi ò siri gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya?” ị ga-eji obi gị niile zaa ya, sị: “Ee, obi siri m ike. M na-agbalịkwa ike m niile ụbọchị ọ bụla igosi ya na m hụrụ ya n’anya.”

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị mere anyị ji kwesị ikweta na Jehova hụrụ anyị n’anya?

  • Gịnị ga-enyere anyị aka ikweta na Jehova hụrụ anyị n’anya?

  • Olee otú Jizọs si nyere anyị aka ikweta na Jehova hụrụ anyị n’anya?

ABỤ NKE 154 Ịhụnanya Adịghị Ada Ada

a Ị chọọ ịhụ amaokwu Baịbụl ndị ọzọ na-akasi obi na-eme ka anyị ghọta na Jehova hụrụ anyị n’anya, gaa n’isiokwu bụ “Inwe Obi Abụọ” n’akwụkwọ bụ́ Amaokwu Baịbụl Ndị Na-enyere Anyị Aka Ife Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya