IHE BAỊBỤL KWURU
Jizọs “Si n’Ahụhụ Ọ Tara Mụta Irube Isi”
Jizọs na-erubere Jehova isi kemgbe. (Jọn 8:29) Gịnịzi mere Baịbụl ji kwuo na “o si n’ahụhụ ọ tara mụta irube isi”?—Hib. 5:8.
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, otú ihe si dịrị ya dị iche n’otú ọ dịịrị ya n’eluigwe. Dị ka ihe atụ, papa ya na mama ya hụrụ Jehova n’anya. Ma ha ezughị okè. (Luk 2:51) O diri ahụhụ ndị isi okpukpe na-arụrụ aka na ndị ọchịchị na-anaghị akwụwa aka ọtọ tara ya. (Mat. 26:59; Mak 15:15) Ihe ọzọ bụ na ọ nwụrụ ọnwụ ahụhụ. Baịbụl sịrị na “o weturu onwe ya ala ma rube isi ruo ọnwụ.”—Fil. 2:8.
Ihe a niile mere ka Jizọs mụta irube isi otú ọ na-amụtaghị mgbe ọ nọ n’eluigwe. O si otú ahụ ghọọ Eze na Nnukwu Onye Nchụàjà zuru okè, onye ga-emetaliri anyị ebere. (Hib. 4:15; 5:9) Jizọs bakwuuru Jehova uru mgbe o si n’ahụhụ ọ tara mụta irube isi. Jehova ga-ejikwa anyị kpọrọkwuo ihe, anyị abakwuoro ya uru ịrụ ọrụ ọ bụla o nwere ike inye anyị ma ọ bụrụ na anyị ana-erubere ya isi mgbe ihe siiri anyị ezigbo ike.—Jems 1:4.