Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Septemba p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ifego Elu na Nkù Dị Ka Ugo
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Anya Ugo
    Teta!—2003
  • Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Abụ Solomọn
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Septemba p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Onye dere Ilu 30:18, 19 kwuru na “ije nwoke na nwaanyị” ‘gbara ya gharịị.’ Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

Ọtụtụ ndị na-eche ihe amaokwu Baịbụl a pụtara, ma ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl. Ihe ebe ahụ kwuru ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bụ: “E nwere ihe atọ gbara m gharịị, ihe anọ m na-aghọtabeghị: Otú ugo si efegharị n’eluigwe, otú agwọ si arịgharị n’elu nkume, otú ụgbọ mmiri si aga n’oké osimiri, nakwa ije nwoke na nwaanyị.”​—Ilu 30:18, 19.

Na mbụ, anyị ghọtara na “ije nwoke na nwaanyị” e kwuru ebe a na-akọwa ihe na-adịghị mma. Maka gịnị? Amaokwu ndị ọzọ dị n’Ilu isi 30 na-ekwu ihe ọjọọ ndị na-emekataghị sị na “o zuola.” (Ilu 30:15, 16) Amaokwu nke 20 kwukwara gbasara “nwaanyị na-akwa iko,” onye na-ekwu na e nweghị ihe ọjọọ o mere. N’ihi ya, anyị cheburu na amaokwu a na-ekwu banyere ihe ndị na-eme ihe ndị ọzọ na-agaghị amata otú o si mee. Anyị chere na otú ahụ ugo si efegharị n’eluigwe, otú agwọ si arịgharị n’elu nkume, na otú ụgbọ mmiri si aga n’oké osimiri, nwoke nwere ike ime ihe ụfọdụ n’enweghị onye ma ihe o mere. N’ihi ya, anyị chere na “ije nwoke na nwaanyị” na-ekwu gbasara ihe ọjọọ, ya bụ, otú nwa okorobịa si aghọgbu nwa agbọghọ ka ya na ya kwaa iko.

Ma, e nwere ezigbo ihe na-egosi na ebe a na-ekwu banyere ihe dị mma. Onye dere amaokwu Baịbụl a na-ekwu gbasara ihe ndị juru ya anya ma tụọ ya n’anya.

Otú e si kwuo ya n’asụsụ Hibru e ji dee Baịbụl na-egosi na amaokwu Baịbụl a na-ekwu gbasara ihe dị mma. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru kwuru na okwu Hibru a sụgharịrị “gbara m gharịị” n’Ilu 30:18 na-egosi ihe merenụ nke mmadụ weere ka ihe pụrụ iche na ihe na-agaghị ekwe omume ma ọ bụdị ihe tụrụ ya n’anya.

Otu ọkachamara aha ya bụ Crawford H. Toy nke na-akụzi n’otu mahadum dị n’Amerịka kwukwara na amaokwu a anaghị ekwu gbasara ihe na-adịghị mma. Ọ sịrị: “Onye dere amaokwu Baịbụl a na-agbalị ịkọwa otú ihe ndị ahụ si tụọ ya n’anya.”

N’ihi ya, e nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji kweta na ihe ahụ e dere n’Ilu 30:18, 19 na-ekwu banyere ihe ndị na-atụ anyị n’anya ma na-agba anyị gharịị. Ọ na-atụ anyị n’anya ma anyị hụ otú ugo si efegharị n’eluigwe, otú agwọ si arịgharị n’elu nkume, otú ụgbọ mmiri si aga n’oké osimiri, nakwa otú nwa okorobịa na nwa agbọghọbịa nwere ike isi hụwa ibe ha n’anya, mechaa biri nwewe obi ụtọ. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ tụrụ onye dere amaokwu a n’anya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya