Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb14 p. 26-35
  • Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
  • Ihe Ndị E Mere n’Afọ Gara Aga
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2013
  • Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
  • Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2014
yb14 p. 26-35

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova

Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst, sị: “Na-echetanụ ndị nọ n’agbụ ụlọ mkpọrọ dị ka à ga-asị na e kere unu na ha agbụ.” (Hib. 13:3) Anyị na-echeta ụmụnna anyị ndị nọ mkpọrọ n’ebe dị iche iche. Anyị na-arịọkwa Jehova “maka ndị eze na ndị niile nọ n’ọkwá dị elu; ka anyị wee na-ebi ndụ dị nwayọọ na nke dị jụụ ná nsọpụrụ Chineke zuru ezu na iji ihe kpọrọ ihe.”—1 Tim. 2:1, 2; Efe. 6:18.

N’afọ gara aga, e nwere okwu gbasara Ndịàmà Jehova n’ebe dị iche iche. Lee ụfọdụ n’ime ha:

Na Rọshịa, ndị Chọọchị Ọtọdọks na ndị ọchịchị na-agbalị ime ka ụmụnna anyị kwụsị izi ndị mmadụ ozi ọma n’obodo ahụ. Ma, ha ka ‘na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, na-ezisakwa ozi ọma.’ (Ọrụ Ndịozi 5:42) E nwere iwu ndị ọchịchị Rọshịa tiri ha ji ejide onye ọ bụla na-agba gọọmenti mgba okpuru. Ma, ha na-eji iwu a emesi ụmụnna anyị ike. Ha machikwara ụfọdụ akwụkwọ anyị maka na ha na-asị na ihe dị na ha na-agba ọchịchị ha mgba okpuru. Akwụkwọ anyị ha machiri dị iri asaa, ha tinyere aha akwụkwọ ndị ahụ n’aha akwụkwọ ndị ọzọ ha machiri n’obodo ahụ. N’ihi ya, ndị uwe ojii na-aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa n’ụlọ ụmụnna anyị na-achịkọrọ akwụkwọ ndị ahụ. Ha na-akpọchi ọtụtụ ụmụnna, seekwa ha foto maka na ha na-aga ozi ọma. Ha na-amanyekwa ha ime ihe ha na-ekwesịghị ime.

N’ọnwa Mee 2013, a kpụpụrụ ụmụnna iri na isii ụlọikpe n’obodo a na-akpọ Taganrọg maka na ha gara ọmụmụ ihe na ozi ọma. Nke a bụ nke mbụ a na-akpụpụ ụmụnna anyị ụlọikpe maka okpukpe anyị kemgbe ọchịchị ndị Sọviet Yuniọn dara. N’ebe ọzọ n’obodo ahụ, ndị ọchịchị na-arịọ ụlọikpe ka ha maa ụmụnna anyị ikpe ma kwuo na ihe dị n’akwụkwọ anyị ụfọdụ na-egosi na ụmụnna anyị na-agba ọchịchị mgba okpuru.

Ndị ọchịchị Eritria ka na-echikwa ụmụnna anyị ọnụ n’ala. Dị ka ihe atụ, n’ọnwa Julaị 2013, bụ́ mgbe anyị nwetara akụkọ a, iri ụmụnna ise na abụọ nọ mkpọrọ. N’ime ndị a, e nwere ụmụnna nwoke asatọ dị ma o pekarịa mpe iri afọ asaa nakwa ụmụnna nwaanyị isii. E nwekwara ụmụnna atọ ndị ọ bụ kemgbe Septemba 24, 1994, ka a tụrụ ha mkpọrọ maka na ha jụrụ ịga agha. Aha ha bụ Paulos Eyassu, Isaac Mogos, na Negede Teklemariam.

Ihe karịrị ọkara n’ime ha bụ n’ụlọ mkpọrọ Meiter dị n’Asmara ka ha nọ. Ọ na-abụ ndị ọchịchị chọọ ịta ụfọdụ n’ime ụmụnna ndị a ahụhụ, ha etinye ha n’ime tank e gwunyere n’ala. Malite n’Ọktoba 2011 ruo n’Ọgọst 2012, ha tinyere ụmụnna iri abụọ na ise n’ime tank ahụ. N’oge okpomọkụ, ndị wọda na-ahapụ ha ka ha pụtatụ nara ikuku maka na ebe ahụ na-ekpo ajọ ọkụ. Ma, ha anaghị enye ụmụnna ndị ahụ nri na mmiri nke ọma, n’ihi ya, ahụ́ esighị ha ike. N’Ọgọst 2012, otu nwanna nwoke dị afọ iri isii na asatọ nwụrụ n’ihi arụrụala a na-arụsa ha. Aha ya bụ Yohannes Haile. I chetaranụ na Nwanna Misghina Gebretinsae nwụkwara otu ebe ahụ n’afọ 2011.

Ndị Jụrụ Ịrụ Ọrụ Gbasara Agha

N’ihi ihe dị n’Aịzaya 2:4 na Jọn 18:36.

AMINIA

Ndị ọchịchị kpụpụrụ ụmụnna iri na asaa ụlọikpe maka na ha jụrụ ịrụ ọrụ ndị agha nyere ha. Ma, n’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Nọvemba afọ 2012, Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kpebiri ikpe dị n’etiti Khachatryan na ụmụnna ndị ọzọ na gọọmenti Aminia. Ụlọikpe ahụ kwukwara na e kwesịghị ịkpụpụ ha ụlọikpe n’ihi na aka ha dị ọcha. Gọọmenti Aminia akwụọkwala ụmụnna ndị ahụ ego ha mefuru maka ikpe ahụ.

N’agbanyeghị ihe a ụlọikpe kwuru n’okwu a, nke ha kwuru n’okwu gbasara Bayatyan nakwa ihe ahụ Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kwuru, gọọmenti Aminia akwụsịbeghị ichi ụmụnna anyị ndị jụrụ ọrụ ọ bụla gbasara agha ọnụ n’ala. Ma, n’abalị asatọ n’ọnwa Jun afọ 2013, gọọmenti kwuru na e nwere ọrụ ọzọ ndị na-achọghị ịrụ ọrụ ọ bụla gbasara agha ga na-arụzi. N’ihi ya, n’abalị iri na abụọ n’ọnwa Nọvemba afọ 2013, a hapụrụ Ndịàmà Jehova niile a tụrụ mkpọrọ maka na ha ekweghị arụ ọrụ gbasara agha. A na-enyekwa ụmụ okorobịa anyị ọrụ ahụ.

SAỤT KORIA

Ka ihe si kwụrụ n’abalị iri atọ na otu n’ọnwa Ọktoba afọ 2013, ụmụnna nọ mkpọrọ dị narị isii na abụọ. Kemgbe afọ 1950, ụmụnna gọọmenti Saụt Koria tụrụla mkpọrọ dị puku iri na asaa na narị isii na ise. A gụkọọ afọ ole a tụrụ ha mkpọrọ, ọ dị puku afọ iri atọ na anọ na otu narị na iri asatọ na anọ. Ihe mere e ji tụọ ha mkpọrọ bụ na ha jụrụ ịrụ ọrụ gbasara agha.

Kemgbe ụwa, a na-akpọchi ọtụtụ ụmụnna anyị na ndị omekome n’otu ebe. Ma n’oge na-adịbeghị anya, ụfọdụ ụmụnna gakwuuru onyeisi ụlọ mkpọrọ niile dị na Saụt Koria rịọ ya ka a kwụsị ịna-akpọchi ụmụnna anyị ebe a kpọchiri ndị nga ndị ọzọ. Ha malitere ozugbo wepụwa ndị nga ndị ọzọ n’ebe ụmụnna anyị nọ. Ka ọ na-eru n’ọnwa Eprel 2013, ọtụtụ ụmụnna anyị na-anọzi anọ anọ ma ọ bụ ise ise n’otu ebe naanị ha. Olee uru ihe a baara ụmụnna anyị?

Otu nwanna nwoke kwuru, sị: “E nweghịzi onye na-eme omume rụrụ arụ ma ọ bụ na-ekwu okwu ọjọọ n’ebe a anyị nọ.” Nwanna ọzọ kwuru, sị, “Ugbu a, anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-enwekwa ọmụmụ ihe ise ahụ a na-enwe n’izu.”

Ọ na-abụ onye kwụsị ọrụ amị, ndị ọchịchị ka ga na-akpọ ya ka a zụọ ya ka ọ ga-abụ a chọọ ịlụ agha, ha akpọọ ya. E nwere ndị amị iri ise na isii kwụsịrịla ọrụ amị ma ghọọ Ndịàmà Jehova. Ndị ọchịchị na-akpụpụ ha ụlọikpe, na-eri ha nhá, na-akpọchikwa ha maka na ha anaghị ekwe ka a zụọ ha ọzọ n’ọrụ amị. Ebe ọ bụ na e nwere ike ịkpọru mmadụ ugboro asatọ n’afọ, ọ dịghịrị ụmụnna ndị a mfe.

SỊNGAPỌ

N’agbanyeghị na ụmụnna anyị nọ na-agwa ndị ọchịchị ka ha na-enye ha ọrụ na-agbasaghị agha, a ka kpọchiri ụmụnna iri na abụọ n’ụlọ nga ndị amị. Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọ ebe ahụ afọ atọ na ọnwa atọ. E nwere nwanna ọzọ a tụrụ mkpọrọ otu afọ maka na o kweghị arụ ọrụ agha.

TỌKMENESTAN

N’obodo a, a tụrụ ụmụnna itoolu mkpọrọ maka na ha jụrụ ịrụ ọrụ gbasara agha. Ụfọdụ n’ime ha ga-anọ otu afọ na ọkara, ebe ndị ọzọ ga-anọ afọ abụọ. Ndị wọda na ndị soja na-etikwa ha eti eti. Ọ na-abụ ha gachaa mkpọrọ ahụ lọta, e jide ha ọzọ kpụpụ ha ụlọikpe, tụọkwa ha mkpọrọ ọzọ ebe a ga-echizi ha ọnụ n’ala. Ndị ọkàiwu ndị na-ekpechitere ụmụnna iri ndị jụrụ ịga agha ọnụ ha ewepụla okwu ha n’ihu Òtù Mba Ụwa Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ.

Ndị Jụrụ Iso Mee Ememme E Ji Eto Mba

N’ihi ihe dị na Daniel 3:16-18.

Tanzania: Mgbe e kpebiri ikpe ụmụnna ndị a, ha malitekwara ịga akwụkwọ

TANZANIA

Ụlọ ọrụ na-ahụ maka ụlọ akwụkwọ chụrụ ụmụnna ise n’ụlọ akwụkwọ, kwụsị otu narị ụmụnna na iri abụọ na abụọ akwụkwọ maka na ha jụrụ ikwe ukwe e ji eto mba. Ma, ụlọikpe kacha elu na Tanzania kwuru na ọchụchụ ahụ a chụrụ ha ekwesịghị ekwesị. Na Julaị 12, 2013, ụlọikpe ahụ kwuru ka a hapụ ụmụ akwụkwọ bụ́ Ndịàmà Jehova ka ha na-ekpe okpukpe ha nakwa na iwu ala ha kwadoro ka onye ọ bụla na-eme ihe akọnuche ya gwara ya. Otú a ụmụnna ndị a si kwụsie ike n’okwukwe ha mere ka e too aha Jehova, meekwa ka ụmụnna anyị ndị nọ na Tanzania nwere onwe ha ịna-efe Jehova otú ha chọrọ.

Gbasara Ikwusa Ozi Ọma

N’ihi ihe dị n’Ọrụ Ndịozi 4:19, 20.

KAZAKSTAN

Ụlọ ọrụ na-ahụ maka okpukpe n’obodo a sịrị na nchọpụta ha mere gosiri na ihe dị n’ụfọdụ akwụkwọ anyị na-agba ọchịchị mgba okpuru, na-emekwa ka ndị mmadụ ghara ịdị n’otu. N’abalị isii n’ọnwa Eprel afọ 2013, ndị uwe ojii gara ebe ụmụnna anyị na-amụ ihe n’ụlọ otu nwanna kpokọrọ akwụkwọ ha niile n’agbanyeghị na e nyeghị ha ikike ime otú ahụ. N’abalị atọ n’ọnwa Julaị afọ 2013, otu ụlọikpe n’Astana machiri iri n’ime akwụkwọ anyị. Ihe a mere na a naghịzi ekwe ka e bubata ụfọdụ akwụkwọ anyị n’obodo ahụ. N’ọnwa Disemba afọ 2012, ha malitere ịna-akpọchi ụmụnna anyị, na-amakwa ha ikpe maka na ha sịrị na ha ekwesịghị ịna-ezi ozi ọma. N’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa Mach afọ 2013, ụlọ ọrụ na-ahụ maka okpukpe gwara alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Kazakstan ka ha gwa ụmụnna ndị nọ n’ebe ahụ na ebe ha ga na-ekwusa ozi ọma bụ naanị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ka ọ dị n’ọnwa Julaị 2013, ha akpụpụla ụmụnna iri abụọ na otu ụlọikpe.

Gbasara Ikpe Okpukpe

N’ihi ihe dị ná Ndị Hibru 10:24, 25.

AZEBAIJAN

N’ọnwa Jenụwarị 2010, ụlọ ọrụ na-ahụ maka okpukpe n’obodo a jụrụ ideba okpukpe Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ maka ihe ha sị na e detaghị. N’agbanyeghị mbọ niile ụmụnna anyị gbara ka ha na ha kwuo banyere ihe ahụ ha si na e detaghị, ha ekweghị edeba aha ha n’akwụkwọ. N’abalị iri atọ na otu n’ọnwa Julaị afọ 2012, ụmụnna anyị ji okwu ahụ gaa n’ihu Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop. Ha gwara ha na ndị ọchịchị ekweghị edeba aha ha n’akwụkwọ nakwa na ha ekweghị ka ha na-ekpe okpukpe ha otú ha chọrọ. Ọ bụrụ na e debaghị aha ha n’akwụkwọ, a gaghị ekwe ha na-eme ihe ọ bụla n’obodo ahụ.

Gbasara Ichebe Ihe Mmadụ Nwere

N’ihi ihe dị ná Ndị Filipaị 1:7.

YUKREN

N’agbanyeghị na a na-ekwe ụmụnna fee Jehova otú ha chọrọ n’obodo a, a ka na-eti ụfọdụ n’ime ha ihe, na-agba Ụlọ Nzukọ Alaeze ọkụ, na-emebisịkwa ihe n’ụfọdụ. O nweghị ihe ndị uwe ojii na-eme ma ụdị ihe a mee. N’ihi ya, ndị omekome a na-akpa ike na-akwụsịghị akwụsị. Kemgbe afọ 2012 na afọ 2013, ihe e merela ụmụnna anyị abụghị ihe e ji ọnụ akọ. Ụlọ Nzukọ Alaeze a gbarala ọkụ ma ọ bụ mebisie ihe na ha na-ehiwanye nne kemgbe afọ 2010. N’afọ 2010, ha dị ise, n’afọ 2011 ha dị iri na ise, n’afọ 2012 ha dị iri ise. Malite n’ọnwa Jenụwarị afọ 2013 ruo n’ọnwa Mee afọ ahụ, a gbaakwala iri abụọ na atọ ọkụ ma ọ bụ mebisie ihe na ha. Alaka ụlọ ọrụ anyị na-ewega okwu ndị a n’ihu Òtù Mba Ụwa Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ.

Yukren: A gbara Ụlọ Nzukọ Alaeze a ọkụ. Ụmụnna anyị na-akwadokwa ịrụgharị ya

Gbasara Mmadụ Ịkwụsi Ike n’Ihe O Kpebiri

N’ihi ihe dị n’Ọrụ Ndịozi 5:29 nakwa n’Ọrụ Ndịozi 15:28, 29.

AJENTINA

N’afọ 2012, ndị o ji égbè ezu gbatara otu nwanna nwoke na-agara onwe ya égbè. Aha nwanna ahụ bụ Pablo Albarracini. Mgbe e bugara ya ụlọ ọgwụ, ọ maghịzi onwe ya. O jikwa kaadị DPA ya nke o ji kwuo na ya agaghị achọ ka a mịnye ya ọbara. Ndị ụlọ ọgwụ kwetara na ha agaghị amịnye ya ọbara. Ma, nwanne ya na-abụghị Onyeàmà Jehova gara ụlọikpe ka e nye ndị ụlọ ọgwụ ahụ ikike ka ha mịnye ya ọbara maka na o chere na ọ bụ ya ga-eme ka nwanna ahụ ghara ịnwụ. Ma, ụlọikpe kacha elu n’obodo ahụ, kwuru na e kwesịghị ịmịnye ya ọbara ebe ọ bụ ya ji aka ya kwuo na ya achọghị ọbara, ọ sọkwa ya ya bụrụ na ọ maghịzi onwe ya. A mịnyeghị ya ọbara, ọ gbakekwara ngwa ngwa. Obi dịkwa ya ụtọ na Jehova nyeere ya aka ịkwụsi ike na ihe o kpebiri.

Gbasara Ndị A Na-akpagbu

N’ihi ihe dị na Luk 21:12-17.

KEGỊSTAN

Na Toktogul, a kụturu Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ugboro abụọ. E wepụkwara okwu ahụ ụlọikpe. Ma, n’abalị iri na isii n’ọnwa Eprel afọ 2013, ụlọikpe kpere ikpe ahụ otú mere ụmụnna obi ụtọ. Ha mara ndị kụturu Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ ikpe, gwakwa ha ka ha kwụọ ụgwọ a ga-eji rụgharịa ya. E jikwa ndị nke kụturu Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ na mbụ eji. Okwu ha nọkwa n’ụlọikpe. E nwere olileanya na nsogbu ndị ebe ahụ na-enye ụmụnna anyị ga-ebi n’oge na-adịghị anya. Ka ọ dịgodị, ụmụnna anyị ga-arụgharị Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ.

Kegịstan: Ndị obodo kụturu Ụlọ Nzukọ Alaeze a ugboro abụọ

Ikpe Ndị Anyị Meriri

  1. Ihe bụ́ okwu: Ọ̀ bụ iwu na okpukpe ọ bụla ga-anata ndị ọchịchị ike tupu ha ezukọọ mụọ ihe ma ọ bụ nwee mgbakọ?

    Ihe e kpebiri: N’abalị ise n’ọnwa Disemba afọ 2012, Ụlọikpe Na-eleba Anya n’Ihe Gbasara Iwu Obodo na Rọshịa kwuru na iwu Rọshịa nyere okpukpe ọ bụla ike ime ihe ọ bụla ha chọrọ. O kwuziri na ụmụnna anyị ekwesịghị ịnata ike ọ bụla tupu ha agaa ọmụmụ ihe ma ọ bụ nwee mgbakọ.

  2. Ihe bụ́ okwu: Ọ̀ bụ onye ọ bụla ka ndị ụlọ ọgwụ ga na-enye akwụkwọ e ji edekọ ihe gbasara ahụ́ ike mmadụ? Ihe butere okwu a: N’afọ 2007, otu ọkàiwu gọọmenti Rọshịa gwara ụlọ ọgwụ niile dị n’obodo a na-akpọ Sent Pitasbọg na e nwehaala Onyeàmà Jehova jụrụ ka a mịnye ya ọbara, ha chịtara ya akwụkwọ onye ahụ ma ha emekwala ka onye ahụ mara. Ụmụnna anyị wepụrụ okwu a ụlọikpe dị na Rọshịa ma ụlọikpe a kwadoro ihe ọkàiwu ahụ kwuru. N’ihi ya, ụmụnna anyị wegaziri okwu a n’ihu Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop.

    Ihe e kpebiri: N’abalị isii n’ọnwa Jun afọ 2013, Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kwuru na iwu ha akwadoghị ihe ahụ ọkàiwu ahụ kwuru nakwa na ndị ụlọ ọgwụ ekwesịghị inye onye ọ bụla akwụkwọ e ji ede ihe gbasara ahụ́ ike mmadụ. Mgbe e kpebiri ikpe a n’abalị asaa n’ọnwụ Ọktoba, òtù ikpe kacha elu n’ụlọikpe ahụ ekweghị ka gọọmenti Rọshịa were okwu a gaa ụlọikpe ọzọ.

Ikpe Ndị Anyị Kwuru Banyere Ha n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2013

Gọọmenti Frans ekwetala ime ihe ahụ Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kpebiri gbasara nnukwu ụtụ isi ha sị alaka ụlọ ọrụ anyị kwụọ. Ọ bụ n’abalị ise n’ọnwa Julaị afọ 2012 ka ụlọikpe ahụ kpebiri ikpe ahụ. Ha enyeghachila anyị ego ahụ ha naara anyị, kwụọkwa ọmụrụ nwa dị na ya. Ha akwụọkwala anyị ego anyị mefuru n’ikpe ahụ. E nweghịzi ngwongwo anyị ọ bụla ha ji eji.—Gụọ peeji nke 34 n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2013.

A ka na-emegide ụmụnna anyị n’ebe dị iche iche n’India. Ma, a naghịzi akpọchi ha ma ọ bụ kpụpụ ha ụlọikpe otú a na-emebu. Ikpe ụmụnna anyị dị n’ụlọikpe ugbu a dị ihe dị ka iri abụọ.—Gụọ peeji nke 35 n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2013.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya