Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb16 p. 16-p. 17 para. 4
  • Otú A Ga-esi Na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze Ngwa Ngwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú A Ga-esi Na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze Ngwa Ngwa
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
  • Ịrụ Ụlọ Ndị E Ji Na-eto Jehova
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Ì Nwere Ike Inye Jehova Oge Gị na Ike Gị?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Mmụba Dị Ịrịba Ama Emee Ka Iwusawanye Ihe Ngwa Ngwa Dị Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
yb16 p. 16-p. 17 para. 4
Ebe Ndịàmà Jehova na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Otú A Ga-esi Na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze Ngwa Ngwa

OBI dị anyị ụtọ maka otú Jehova si na-eme ka ọtụtụ ndị na-abata ná nzukọ ya n’ike n’ike n’ụwa niile. (Aịza. 60:22) Ọ bụ ya mere e ji na-achọkwu ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ụwa niile, Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a ka ga-arụ arụ na ndị a ga-arụzigharị arụzigharị karịrị puku iri na atọ.

Ka e nwee ike ịna-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a ngwa ngwa otú na-agaghị efu oké ego, Òtù Na-achị Isi na-agbanwe ọtụtụ ihe na ngalaba dị iche iche na-ahụ maka ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otu ngalaba e hiwere ọhụrụ n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin, dị na Niu Yọk na-arụsi ọrụ ike na-ahazi otú a ga-esi na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ụwa niile, na-ekpebikwa ndị a ga-ebu ụzọ rụọ ma ọ bụ rụzigharịa nakwa otú a ga-esi rụọ ha ngwa ngwa. Ihe a na-akpọ ngalaba a bụ Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile. Ma, Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ná Mpaghara Dị Iche Iche n’Ụwa, bụ́ ndị e nwere n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Sentral Yurop, Saụt Afrịka, nakwa n’Amerịka na Ọstreleshia, na-ahụ maka Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a na-arụ ná mba ndị ha na-elekọta. Ihe ha na-elekwasị anya bụ ịhụ na a rụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ngwa ngwa nakwa otú ọ na-agaghị efu nnukwu ego. Ha na-akụziri ụmụnna ndị nọ ná mba ebe ha na-elekọta otú ha ga-esi na-arụzi ụlọ ndị nzukọ Jehova nwe n’ógbè ha. N’alaka ụlọ ọrụ ọ bụla, e nwere Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụ ha na-ahụ maka ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ, na-ahụkwa maka ịrụzi ihe ndị mebiri na ha.

N’ọnwa Jenụwarị afọ 2015, ndị okenye niile nọ́ n’Amerịka ji vidio ha ji na-ahụ onye ọ bụla chọrọ ikwu okwu nwee nnọkọ. Ná nnọkọ ahụ, a kọwaara ha ụzọ ọhụrụ a ga-esizi na-ahazi maka ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, otú a ga-esi na-arụ ya, na-elekọta ya, ma na-arụzi ihe ndị mebiri na ya. Lee ihe ndị a kọwaara ha:

  • Ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze: Otú a ga-esi arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ga-abụ otú e si arụ ụlọ n’obodo a chọrọ ịrụ ya. Ọ ga-abụkwa ihe ndị obodo ahụ na-eji arụ ụlọ ka a ga-eji rụọ ya. A rụwa ya, a ga-eji ntụziaka Kọmitii Mbipụta nke Òtù Na-achị Isi nyere, rụọ ya. A ga-arụ ya otú ọ na-agaghị efu oké ego ilekọta. A ga-arụkwa ya ka o sie ike, maa mma, gharakwa ifu oké ego.

  • Ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ịrụzi Ya: A bịa n’ọgbakọ ọ bụla, a ga-akụziri ụmụnna anyị ndị wepụtara onwe ha inye aka otú ha ga-esi na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ka ọ ghara imebi ngwa ngwa.

N’eziokwu, Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ ndị a ga-arụ arụ na ndị a ga-arụzigharị arụzigharị dị ọtụtụ. Ọrụ dị na ha abụghịkwa obere ihe. Ma ọ bụrụ na ụmụnna agbakọọ aka n’ịrụ ọrụ a, ọ ga-eme ka a rụọ ha ngwa ngwa, ya agharakwa ifu oké ego.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya