Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb17 p. 134-135
  • Ezigbo Ịhụnanya Anaghị Ada Ada

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezigbo Ịhụnanya Anaghị Ada Ada
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Arịọrọ M Jehova Ka O Nyere M Aka Ime Mkpebi Dị Mma
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017
  • Olee Ebe Unu Nọ Kemgbe?
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017
  • Chineke Adịghị Echezọ “Ịhụnanya Ahụ Unu Gosiri N’ebe Aha Ya Dị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Afọ Ojuju Chineke Na-enye Akwagidewo M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017
yb17 p. 134-135

JỌJIA

Ezigbo Ịhụnanya Anaghị Ada Ada

Igor: Anyị abụọ nọ n’ìgwè na-amụ ihe n’obodo Tikacheli, dị n’Abkazịa. Ọgbakọ ìgwè anyị nọ na ya dị n’obodo Jivari. Ọ dị ihe dị ka kilomita iri asatọ na ise ma e si Tikacheli gawa ya. N’ihi ya, m na-aga Jivari kwa ọnwa ka m bute akwụkwọ anyị ga-eji amụ ihe. N’afọ 1992, obere oge ọchịchị Sọviet Yuniọn dachara, obodo Abkazịa chọwara ịbụ mba nke ha. Ha achọghịzi ka ndị Jọjia na-achị ha. Ha na ndị agha Jọjia malitere ịlụ agha, ya emee ka ihe sie ezigbo ike.

Nwanna Gizo Narmania na Nwanna Igor Ochigava

Gizo Narmania na Igor Ochigava

Ụmụnna abụọ a rụkọrọ ọrụ ọnụ nyere ụmụnna ibe ha aka n’oge a na-alụ agha n’Abkazịa.

Gizo: E mere m baptizim mgbe m dị afọ iri abụọ na otu, otu afọ tupu agha ahụ ebido. Mgbe agha ahụ bidoro, ụjọ jidere ụmụnna anyị, ha amaghịkwa otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma. Ma, Nwanna Igor, bụ́ okenye hụrụ ụmụnna ya n’anya, gbara anyị ume. Ọ gwara anyị, sị: “Ugbu a bụ oge ndị mmadụ chọrọ ka a kasie ha obi. Ihe ga-eme ka anyị na Jehova na-adị ná mma bụ ịnọgide na-ekwusa ozi ọma.” N’ihi ya, anyị ji Okwu Chineke na-ezi ndị mmadụ ozi ọma kwa ụbọchị ma na-akasi ha obi. Ma anyị na-eji akọ na-ezi ha ya.

Igor: N’ihi agha ahụ a na-alụ, anyị anaghị esizi ụzọ anyị na-esi aga eburu akwụkwọ na Jivari. Ebe ọ bụ na anọ m n’ụlọ too, achọtara m ụzọ ọzọ anyị ga na-esi aga Jivari ka a ghara ijide anyị. Anyị na-esizi n’ụzọ ndị dị n’ugwu na ebe a kụrụ ahịhịa tii aga Jivari eburu akwụkwọ. Ma, ụjọ ka na-atụ anyị n’ihi na anyị nwere ike izute ndị agha n’ụzọ ma ọ bụkwanụ zọnye ụkwụ ebe e liri bọmbụ. Ma, achọghị m ka ụmụnna ndị mụ na ha na-eso aga baa ná nsogbu, n’ihi ya, naanị m na-agazi ebute akwụkwọ kwa ọnwa. N’agbanyeghị nsogbu ndị a, Jehova nyeere m aka mụ anọgide na-aga ebute akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Ha mere ka okwukwe anyị sikwuo ike.

Ọ bụ eziokwu na enweghị agha a na-alụ n’obodo anyị bụ́ Tikacheli, ndị agha Jọjia ekweghị ka mmadụ pụọ ma ọ bụ bata na ya. Ma, mgbe oge oyi ruwere, nri bịara dị ụkọ n’obodo anyị, anyị echewe ihe anyị ga-eme. Ma obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ mgbe anyị nụrụ na ụmụnna anyị nọ na Jivari atụkọtala nri ha chọrọ inye anyị.

Gizo: Otu ụbọchị, Nwanna Igor jụrụ m ma è nwere ebe anyị ga-enye ha n’ụlọ anyị a ga-edosa nri, sizie ebe ahụ na-ekesara ya ụmụnna. Ọ chọrọ ịga Jivari bute nri ụmụnna nọ ebe ahụ tụkọtaara anyị. Ma ụjọ tụwara anyị ebe anyị ma na ọ ga-agaferịrị ọtụtụ ebe ndị agha na-eche nche, o nwekwara ike izute ndị ohi n’ụzọ.​—⁠Jọn 15:⁠13.

Ma Jehova nyeere ya aka, ya agaa lọtakwa n’udo. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ mgbe anyị hụrụ ya ka ọ nya ụgbọala e bujuru nri ga-ezuru anyị ruo ọtụtụ ọnwa lọta. N’oge ndị ahụ ihe siri ike, ihe ọma ụmụnna anyị meere anyị mere ka o doo anyị anya na ezigbo ịhụnanya anaghị ada ada.​—⁠1 Kọr. 13:⁠8.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya