Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb17 p. 6-10
  • Ihe Ndị E Mere n’Afọ Gara Aga

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndị E Mere n’Afọ Gara Aga
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ibufe Isi Ụlọ Ọrụ Anyị na Alaka Ụlọ Ọrụ Dị n’Amerịka Ebe Ọzọ
  • Olee Otú Ọrụ Si Na-aga na Wọwik?
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
  • Ọgbakọ Jehova Na-aga n’Ihu
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2014
  • Ọrụ Na-aga n’Ihu n’Ihu na Wọwik
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
  • Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Niu Yọk
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017
yb17 p. 6-10
Ihe a bụ ihu isi ụlọ ọrụ anyị dị na Wọwik nke dị na Niu Yọk

Wọwik, Niu Yọk: Isi Ụlọ Ọrụ Anyị

Ihe Ndị E Mere n’Afọ Gara Aga

KA IHE na-akakwu njọ n’ụwa Setan a, ndị na-efe Jehova ‘na-enwe ọtụtụ ihe ha na-arụ n’ọrụ Onyenwe anyị.’ (1 Kọr. 15:58) Ihe ndị anyị na-aga ịkọ ugbu a na-egosi otú Ndịàmà Jehova n’ụwa niile si na-agba mbọ ‘atụkwasị Jehova obi . . . , na-eme ihe ọma . . . , ma na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi.’​—⁠Ọma 37:⁠3.

Ibufe Isi Ụlọ Ọrụ Anyị na Alaka Ụlọ Ọrụ Dị n’Amerịka Ebe Ọzọ

A rụchara ụlọ ndị anyị na-arụnyekwu n’ụlọ ọrụ anyị dị na Wọlkil nke dị na Niu Yọk, n’abalị mbụ n’ọnwa Febụwarị, afọ 2016. N’ihi ya, Kọmitii Alaka nke alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka, Ngalaba Ije Ozi na ngalaba ndị ọzọ dị na ya kwafere ebe ahụ. Ebe ọ bụkwa na a rụchawala isi ụlọ ọrụ ọhụrụ anyị a na-arụ na Wọwik, ndị ezinụlọ Betel dị na Bruklin si na Niu Yọk Siti na-akwafe Wọwik.

Map a na-egosi alaka ụlọ ọrụ anyị nke Amerịka na ụlọ anyị ndị ọzọ, ụlọ ọrụ anyị dị na Wọlkil, nakwa isi ụlọ ọrụ ọhụrụ anyị dị na Wọwik

Na Mọnde, abalị atọ n’ọnwa Eprel afọ 2017, a ga-amalite ịnabata ndị mmadụ ịbịa legharịa anya n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Wọwik. E nwere ebe atọ mmadụ ga-eji aka ya gaa legharịa anya, nweekwa ebe mmadụ ga-akpọgharị ndị bịara ilegharị anya. Ihe a kpọrọ ebe ndị ahụ ndị mmadụ ga-eji aka ha gaa legharịa anya bụ:

  1. “Baịbụl na Aha Chineke” N’ebe a, ị ga-ahụ Baịbụl ndị merela ochie ọtụtụ ndị na-enweghị, hụkwa na aha Chineke dị na ha.

  2. “Ndị Jehova Kpọkwasịrị Aha Ya” N’ebe a, ị ga-ahụ foto dị iche iche, hụkwa ụfọdụ ihe ochie Ndịàmà Jehova jirila zie ozi ọma. Ihe ndị a na-akọwa otú Jehova sirila na-eduzi ndị ya, na-akụziri ha ihe ma hazie ha ka ha na-eme uche ya.

  3. “Ọrụ Òtù Na-achị Isi Na-arụ” N’ebe a, ị ga-ahụ ebe ndị a kọwachara ihe ngalaba dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi na-eme iji nyere ndị Jehova aka ịna-ezukọta ọnụ maka ife Chineke, ịna-ekwusa ozi ọma, ịna-enweta ihe ndị e ji amụ Baịbụl, nakwa ịna-ahụ ibe ha n’anya.

Ndị mmadụ nwere ike ịga n’ebe ndị a legharịa anya n’onwe ha malite n’elekere asatọ nke ụtụtụ ruo n’elekere anọ nke ehihie si na Mọnde ruo Fraịdee. A ga-enwekwa nke mmadụ ga-akpọgharị ndị bịara ilegharị anya, ma gosi ha Ọfis ụfọdụ, nakwa gburugburu Betel. Nke a ga-ewe nkeji iri abụọ. Na nke a, a ga na-akpọgharịkwa ndị mmadụ malite na Mọnde ruo Fraịdee. A ga na-amalite n’elekere asatọ nke ụtụtụ ma kwụsị n’elekere iri na otu nke ụtụtụ, malite ọzọ n’elekere mbụ nke ehihie ma kwụsị n’elekere anọ nke ehihie.

Tupu gị akwadowa ịbịa legharịa anya ebe a, biko gaa na jw.org pịa ebe e dere ABOUT US pịzie OFFICES & TOURS ma họrọ United States.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya