IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA
Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova ‘Na-agba Anyị Ume’
KEMGBE afọ 2014 a malitere Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova a na-esi n’Ịntanet ele, ọ gbaala ọtụtụ ndị n’ụwa niile ume, meekwa ka okwukwe ha sikwuo ike. A na-eme ihe omume tiivi a n’ihe karịrị asụsụ iri itoolu. Dị ka ihe atụ, a na-asụgharịzi ihe a na-eme na ya n’asụsụ Ewe, Ga, na Chwi (dị ka e gosiri ebe a). Ihe karịrị otu narị puku na puku ụmụnna iri atọ e nwere na Bene, Kot Devụa, Gana, nakwa na Togo na-ele ihe omume a n’asụsụ ndị a. Ọ na-atọ ha ezigbo ụtọ.a
Na Gana, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Agatha, bụ́ nwunye onye nlekọta sekit kwuru, sị: “Ọ na-abụ m na-ege ihe ụmụnna ndị so n’Òtù Na-achị Isi nakwa ụmụnna ndị na-enyere ha aka na-ekwu, ya ana-adị m ka Jehova ọ̀ na-agwa m okwu n’ime ụlọ m. E wezụga ihe omume tiivi a, olee otú ọ ga-esi kwe omume onye dị ka m nọ n’obere obodo ige ihe ụmụnna ndị ahụ na-ekwu? O meela ka anyị bịarukwuo ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile nso.”
Akụkọ anyị si na Zambia nweta kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na ụmụnna nọ n’ọtụtụ ọgbakọ enwechaghị ego, ha na-agbasi mbọ ike na-ele Ihe Omume Tiivi anyị. Dị ka ihe atụ, isi n’ebe ọgbakọ Misako dị ruo ebe mepetụrụ emepe dị ihe dị ka kilomita iri atọ. Ọgbakọ a dịkwa n’ebe a na-akọ ugbo. Ị ga-agafekwa mmiri na-asọsi ike n’oge udu mmiri iji rute ebe ahụ.” E nwere otu ohu na-eje ozi aha ya bụ Simon. Ọ bịara na-eje ozi n’ọgbakọ Misako n’ihi na a chọkwuru ndị ga-ekwusa ozi ọma na ya. O kwuru, sị: “N’ọnwa ọ bụla, otu nwanna na-eji ụkwụ gaa ihe dị ka awa abụọ iji rute ebe ọ ga-enweta ụgbọala ga-ebuga ya ebe ọ ga-adanlodu ihe omume tiivi anyị. Otu nwoke dị iri afọ asaa na ụmụ ya abụọ agabeghị ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova mbụ. Ma, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ mgbe ọ nụrụ na a ga-egosi vidio anyị n’ọmụmụ ihe n’agbanyeghị na ebe ahụ bụ ime ime obodo. Nwoke ahụ kwuru, sị: ‘Ọ bụ otú a ka e kwesịrị isi na-amụ banyere Chineke.’”
Otu akwụkwọ ozi ekele anyị si na Rọshịa nweta kwuru, sị: “Kemgbe otu afọ ugbu a, anyị na-ele Ihe Omume Tiivi anyị, obi dịkwa anyị ụtọ maka ya. Mgbe anyị lechara nke mbụ ya, o mere ka anyị ghọta na anyị na ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile dị n’otu. Ọ tọrọ anyị ezigbo ụtọ. O mekwara ka anyị mata na anyị bụ otu nnukwu ezinụlọ. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ ịhụ ụmụnna anyị ndị so n’Òtù Na-achị Isi. Ha ji obi ha niile na-enye anyị nri n’oge kwesịrị ekwesị. Anyị na-enwetakwa ya mgbe ọ bụla. Anyị na-atụ anya ihe omume nke ọnwa ọ bụla. Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Ezigbo ụmụnna anyị, unu emeela. Anyị na-ekele Jehova na Kraịst maka ihe ọma ndị a ha na-emere anyị. Ha na-agba anyị ume.”
Na Jamanị, otu di na nwunye aha ha bụ Horst na Helga kwuru otú obi dị ha banyere ihe omume tiivi anyị. Di na nwunye a emeela agadi, ahụ́ adịghịkwa ha. Ha kwuru, sị: “Ihe Omume Tiivi anyị pụrụ iche. Ọ na-agba anyị ume. Ihe kacha agba anyị ume bụ akụkọ ụmụnna anyị ndị nwere nkwarụ kọrọ. Akụkọ ha na-eme ka anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime n’ozi Jehova n’agbanyeghị ọrịa ndị anyị na ha na-alụ. Mgbe anyị hụrụ na otu nwanna dara ngwọrọ bụ okenye, anyị mụtara na onye ọ bụla ga-enyeli Jehova ihe kacha mma o nwere. Mgbe anyị hụrụ otú ụmụnna ndị a si na-anwa ike ha, anyị na-ekele Jehova, na-arịọkwa ya ka ọ gọzie ha.”
Otu nwatakịrị si Ịngland aha ya bụ Kodi kwuru, sị: “Unu emeela maka mbọ niile unu na-agba n’iwepụtara anyị jw.org, Ihe Omume Tiivi anyị, nakwa katuun Kelechi na Sọpụrụchi. Unu emeekwala maka otú unu si na-eme ka ọ dịrị anyị mfe ịghọta Baịbụl nke ọma. E mere m baptizim mgbe m dị afọ asatọ. M too, m ga-achọ iwepụta onwe m soro na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. M ga-achọkwa ije ozi na Betel. Adị m afọ itoolu ugbu a, obere oge, m ga-etoru ije ozi ndị a.”
Otu nwatakịrị dị afọ asatọ sikwa Ịngland aha ya bụ Arabella kwuru, sị: “Unu emeela maka vidio na ihe ndị e ji akụziri ụmụaka ihe dị na jw.org. Ọ na-enyere m ezigbo aka ịmatakwu Jehova. Ihe ndị ahụ e ji akụziri ụmụaka ihe nke na-adị na jw.org na-enyere m aka ịmụta banyere Jehova. Unu na-eme nke ọma n’iwepụtara anyị abụ onye ọ bụla nwere ike icheta. Katuun Kelechi na Sọpụrụchi na-enyekwara m aka. Unu emeela maka mbọ niile unu na-agba.”
a Ị chọọ ile Ihe Omume Tiivi a, gaa na tv.jw.org/ig.