Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 177
  • Olee Otú Jizọs Kwuru Ka Anyị Si Na-emeso Ndị Ọzọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Jizọs Kwuru Ka Anyị Si Na-emeso Ndị Ọzọ?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara?
  • Gịnị mere ihe a Jizọs kwuru ji baa uru?
  • Jizọs ò ji ihe ahụ o kwuru na-agwa anyị ihe anyị ga-erite n’aka ndị ọzọ?
  • Olee otú ị ga-esi eme ihe a Jizọs kwuru?
  • Ụkpụrụ Ọma Ahụ—Ọ Dị Irè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ụkpụrụ Ọma Ahụ—Ozizi Zuru Ụwa Ọnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Na-akpa Àgwà Ọma n’Ozi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Nwa Ehi Ọlaedo
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 177
Ebe mmadụ na-agụ amaokwu Baịbụl ebe Jizọs kwuru otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ.

Olee Otú Jizọs Kwuru Ka Anyị Si Na-emeso Ndị Ọzọ?

Ihe Baịbụl kwuru

Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, o kwuru, sị: “Unu kwesịrị ịna-emere ndị mmadụ ihe niile unu chọrọ ka ha na-emere unu.” (Matiu 7:12; Luk 6:31) Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Philosophy kwuru na otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ihe a Jizọs kwuru bụ: “Na-emesonụ ndị mmadụ otú unu chọrọ ka ha si na-emeso unu.”

  • Gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara?

  • Gịnị mere ihe a Jizọs kwuru ji baa uru?

  • Jizọs ò ji ihe ahụ o kwuru na-agwa anyị ihe anyị ga-erite n’aka ndị ọzọ?

  • Olee otú ị ga-esi eme ihe a Jizọs kwuru?

Gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara?

Jizọs ji ihe a o kwuru na-agba anyị ume ka anyị na-emeso ndị ọzọ otú anyị chọrọ ka ha si na-emeso anyị. Dị ka ihe atụ, ọ na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ ma ndị ọzọ kwanyere ha ùgwù, jiri obiọma meso ha ihe, gosikwa ha na ha hụrụ ha n’anya. N’ihi ya, ọ dabara adaba na anyị ga ‘na-emeso ndị mmadụ otú anyị chọrọ ka ha na-emeso anyị.’—Luk 6:31.

Gịnị mere ihe a Jizọs kwuru ji baa uru?

Ihe ahụ Jizọs kwuru nwere ike ịbara anyị uru n’ihe niile. Dị ka ihe atụ, o nwere ike . . .

  • Ime ka di na nwunye na-ebi n’udo.—Ndị Efesọs 5:28, 33.

  • Inyere ndị nne na nna aka ịzụ ụmụ ha nke ọma.—Ndị Efesọs 6:4.

  • Ime ka mmadụ na ndị enyi ya, ndị agbata obi ya, na ndị ọrụ ibe ya dịrị ná mma.—Ilu 3:27, 28; Ndị Kọlọsi 3:13.

Ihe ahụ Jizọs kwuru dabara n’ihe e kwuru n’ọtụtụ ebe n’ebe a na-akpọkarị Agba Ochie na Baịbụl. Ihe a Jizọs kụziri “ka Iwu Mosis [ya bụ, akwụkwọ ise mbụ dị na Baịbụl], na Akwụkwọ Ndị Amụma [ya bụ, akwụkwọ ndị e dere amụma dị iche iche na ha] na-akụzi.” (Matiu 7:12) E nwere ike ikwu na otú ahụ Jizọs kwuru ka anyị si na-emeso ndị ọzọ mere ka isi ihe dị n’Agba Ochie doo anya, ya bụ, mmadụ ịhụ onye agbata obi ya n’anya.—Ndị Rom 13:8-10.

Jizọs ò ji ihe ahụ o kwuru na-agwa anyị ihe anyị ga-erite n’aka ndị ọzọ?

Mba. Ihe Jizọs lekwasịrị anya n’ihe ahụ o kwuru bụ imere ndị ọzọ ihe. Mgbe Jizọs kwuru otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ, ihe ọ nọ na-ekwu abụghị naanị otú anyị ga-esi na-emeso ndị mmadụ, kama otú anyị ga-esikwa na-emeso ndị iro anyị. (Luk 6:27-31, 35) N’ihi ya, ihe ahụ Jizọs kwuru na-akụziri anyị ịna-emere mmadụ niile ihe ọma.

Olee otú ị ga-esi eme ihe a Jizọs kwuru?

  1. 1. Na-eleru anya ala. Gbaa mbọ na-achọpụta otú ihe si dịrị ndị nọ gị gburugburu. Dị ka ihe atụ, i nwere ike hụ onye bu ọtụtụ ihe ọ zụrụ n’ahịa, ma ọ bụ nụ na e nwere onye agbata obi gị nọ n’ụlọ ọgwụ, ma ọ bụkwanụ chọpụta na e nwere onye ọrụ ibe gị obi na-adịchaghị mma. Ọ bụrụ na ‘ị na-achọ ihe ga-adị ndị ọzọ mma,’ ị ga-achọta ohere ị ga-eji kwuo ma ọ bụ mee ihe ga-enyere ha aka.—Ndị Filipaị 2:4.

  2. 2. Na-emetere ndị ọzọ ebere. Weregodị ya na ọ bụ gị ka ihe mere ndị ọzọ mere. Olee otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ gị ka o mere? (Ndị Rom 12:15) Ị gbalịa chọpụta otú obi dị ndị ọzọ, o nwere ike ime ka i nyere ha aka.

  3. 3. Dịrị njikere ịgbanwe ihe ị chọrọ ime. Buru n’obi na mmadụ niile abụghị otu. Ihe ndị ọzọ ga-achọ ka e meere ha nwere ike ọ bụghị ihe gịnwa ga-achọ ka e meere gị. N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ihe i nwere ike imere ndị ọzọ, gbaa mbọ ka ọ bụrụ ihe ha chọrọ ka ị ga-emere ha.—1 Ndị Kọrịnt 10:24.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya