Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 100
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ma M Daa Iwu Nne na Nna M Tiri?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka M Ga-eme Ma M Daa Iwu Nne na Nna M Tiri?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe ị na-ekwesịghị ime
  • Ihe ka mma ị ga-eme
  • Gịnị Mere Papa M na Mama M Anaghị Ekwe M Kporie Ndụ?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Gịnị Mere E Ji Enye M Ọtụtụ Iwu?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Gịnị Mere na Ndị Mụrụ M Atụkwasịghị M Obi?
    Teta!—2008
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka A Hapụ M Ịna-ekpebi Ihe M Ga-eme?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 100

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme Ma M Daa Iwu Nne na Nna M Tiri?

Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na nne na nna ọ bụla na-eti iwu ga na-achị ụmụ ha. Ụfọdụ n’ime iwu ndị ahụ bụ gbasara oge ha chọrọ ka ọ bụrụ na ụmụ ha alọtala n’ụlọ, oge ụmụ ha ga na-eji apị ekwentị ha, na otú ụmụ ha kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ.

Gịnị ka ị ga-eme ma ị daa otu n’ime iwu nne na nna gị tiri? O nweghị ihe ị ga-emeli gbasara iwu ahụ ị dara, ma ị ga-emeli ka ihe ghara ịka njọ. Isiokwu a ga-egosi gị otú ị ga-esi eme ya.

  • Ihe ị na-ekwesịghị ime

  • Ihe ka mma ị ga-eme

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Ihe ị na-ekwesịghị ime

  • Ọ bụrụ na nne na nna gị amaghị na ị daala iwu ha tiri, i nwere ike ịchọ ka i zochiere ha ihe i mere.

  • Ha matakwanụ na ị daala iwu ha tiri, i nwere ike ịchọ ka ị gọrọ isi gị ma ọ bụ chọwa onye ị ga-ebo ya.

Ma, o nweghị nke i kwesịrị ime n’ime ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na i zochie ihe merenụ ma ọ bụ gọrọwa isi gị, ị na-egosi na ị ka na-akpa àgwà ụmụaka. Nne na nna gị ga-ewere ya na o nwebeghị ihe ị ma.

“Ịgha ụgha agaghị enyere gị aka. Eziokwu ga-emecha pụta ìhè. Ya pụta ìhè, ahụhụ ha ga-ata gị ga-akarị nke ha gaara ata gị ma a sị na ị dị mbụ gwa ha eziokwu.”​—Diana.

Ihe ka mma ị ga-eme

  • Kweta ihe i mejọrọ. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe agaghị agaziri onye na-ezochi mmehie ya.” (Ilu 28:13) Nne na nna gị ma na i zughị okè. N’agbanyeghị ya, ha na-atụ anya ka ị na-agwa ha eziokwu.

    “Nne na nna gị ga-aka emere gị ebere ma ị gwa ha eziokwu. Ha ga-atụkwasịkwu gị obi ma ha chọpụta na ị na-ekwu eziokwu.”​—Olivia.

  • Rịọ mgbaghara. Baịbụl kwuru, sị: “Dịrịnụ umeala n’obi.” (1 Pita 5:5) Ọ bụ onye dị umeala n’obi ga-asịli “Biko, gbaghara m,” ọ bụkwa ịdị umeala ga-eme ka mmadụ ghara ịchọwa otú ọ ga-esi gọrọ isi ya.

    “Ndị na-agbalị mgbe niile ka ha gọrọ isi ha ma ha mejọọ ihe na-eme ka akọnuche ha kwụsị ịrụ ọrụ nke ọma. N’ikpeazụ, obi ha agaghịzi na-ama ha ikpe ma ha mee ihe ọjọọ.”​—Heather.

  • Nabata ihe ọ bụla e mere gị maka ihe i mejọrọ. Baịbụl kwuru, sị: “Nabatanụ aka ná ntị a na-adọ unu.” (Ilu 8:33) Atamula ntamu, kama nabata ahụhụ ọ bụla nne na nna gị tara gị ma ọ bụ ihe ọ bụla ha gbochiri gị ime n’ihi ihe i mejọrọ.

    “Ọ bụrụ na ị na-emekwu mkpesa maka ahụhụ a tara gị, ihe ga na-akakwuru gị njọ. E gbochie gị ime ihe ụfọdụ, gbalịa nabata ya, elekwasịkwala anya n’ihe e gbochiri gị ime.”​—Jason.

  • Gbaa mbọ ka a malitekwa ịtụkwasị gị obi. Baịbụl kwuru, sị: ‘Yipụnụ àgwà ochie unu.’ (Ndị Efesọs 4:22) Malitekwa kpawa àgwà otú ga-eme ka nne na nna gị tụkwasị gị obi.

    “Ọ bụrụ na ị na-eme mkpebi ndị dị mma ma gosi nne na nna gị na ị gaghị emekwa ihe na-adịghị mma ahụ i meburu, ha ga-amalitekwa ịtụkwasị gị obi.”​—Karen.

IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA: Na-eme ihe karịrị ihe a tụrụ anya ka i mee, ọ ga-egosi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Dị ka ihe atụ, oge ọzọ ị pụrụ apụ, kpọọ ndị mụrụ gị n’ekwentị mgbe ị nọ n’ụzọ na-alọta ma gwa ha na ị lọtawala, ọ bụrụgodị na ị nọfebeghị oge ha gwara gị jiri lọta. Ọ ga-eme ka ha ghọta na ị chọrọ ka ha tụkwasịwakwa gị obi.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

“Ọ bụrụ na i zochiere nne na nna gị ihe na-adịghị mma i mere, ị na-agha ụgha. Ha ga-emecha mata nke bụ́ eziokwu. Ha mata, ahụhụ a ga-ata gị ga-aka nke a gaara ata gị ma a sị na ị dị mbụ gwa ha eziokwu.”​—Darius.

“Ọ bụrụ na anyị atawa onye ọzọ ụta maka ihe anyị mejọrọ, o yiri ka à ga-asị na anyị na-ekwu na anyị etorubeghị ikweta ihe na-adịghị mma anyị mere. Nne na nna anyị agaghịzi atụkwasị anyị obi ma ọ bụrụ na anyị etorubeghị ịrịọ mgbaghara maka ihe anyị na-emeteghị.”​—Sierra.

Isi ihe anyị kwurula: Gịnị ka m ga-eme ma m daa iwu nne na nna m tiri?

  • Kweta ihe i mejọrọ. Nne na nna gị ma na i zughị okè. N’agbanyeghị ya, ha na-atụ anya ka ị na-agwa ha eziokwu.

  • Rịọ mgbaghara. Jiri obi gị niile sị “Biko, gbaghara m,” gbalịakwa ka ị ghara ịgọrọwa isi gị.

  • Nabata ihe ọ bụla e mere gị maka ihe i mejọrọ. Ndị nne na nna gị gbochie gị ime ihe ụfọdụ, gbalịa nabata ya.

  • Gbaa mbọ ka a malitekwa ịtụkwasị gị obi. Malitekwa kpawa àgwà otú ga-eme ka nne na nna gị tụkwasị gị obi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya