Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 105
  • Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Ịna-eme Ihere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Ịna-eme Ihere?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chọpụta ihe bụ́ ụjọ gị
  • Ihe ị ga-eme
  • Gịnị Mere Apụghị M Inwe Omume Enyi Karị?
    Teta!—1999
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Nwee Omume Enyi Karị?
    Teta!—1999
  • Olee Otú M Ga-esi Mụtakwuo Otú E Si Akparịta Ụka nke Ọma?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Gịnị Ka M Ga-eme Mgbe Owu Na-ama M?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 105
Ebe otu nwa agbọghọ nọ naanị ya mgbe ọ gara otu nnọkọ, ọ gaghị ka ya na ndị ọzọ nọrịa.

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Ịna-eme Ihere?

Ihe na-adịghị mma banyere ime ihere: Ihere nwere ike ime ka ị ghara imete ezigbo ndị enyi, gbochiekwa gị ime ọtụtụ ihe ga-atọ gị ụtọ.

Ihe dị mma banyere ime ihere: Ọ bụghị mgbe niile ka ọ dị njọ ime ihere. O nwere ike inyere gị aka ịna-eche echiche tupu gị ekwuo okwu, mee ka ị na-elerukwu anya iji mara otú ihe si aga, meekwa ka ị na-ege ndị ọzọ ntị nke ọma.

Ihe ọzọ dị mma banyere ime ihere: Na mmadụ na-eme ihere ugbu a apụtaghị na ọ ga-emerezi ya na-aga. N’ihi ya, i nwere ike ịkwụsịlata ịna-eme ihere. Isiokwu a ga-agwa gị otú ị ga-esi eme ya.

  • Chọpụta ihe bụ́ ụjọ gị

  • Ihe ị ga-eme

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Chọpụta ihe bụ́ ụjọ gị

Ihere nwere ike ime ka gị na ndị mmadụ ịkparịta ụka ihu na ihu na-atụ gị ụjọ. O nwere ike ime ka ọ dị gị ka ị bụ onye a jụrụ ajụ, ka à ga-asị na naanị gị nọ n’ụlọ gbara ọchịchịrị. Ụdị ihe a nwere ike ime ka ụjọ tụwa mmadụ. Ma ị mata ihe bụ́ ụjọ gị kpọmkwem, i nwere ike ịchọpụta na e nweghị ihe ihe ahụ bụ. Chegodị gbasara ihe atụ ndị a.

  • Ihe mbụ nwere ike ịbụ ụjọ gị: “Amaghị m ihe m ga-ekwu.”

    Nke bụ́ eziokwu: Ihe ndị mmadụ na-echetakarị bụ otú i si kpaso ha àgwà ọma, ọ bụghị ihe ndị i kwuru. Ị mụta ịna-ege ndị ọzọ ntị na igosi ha na i jighị ihe ha na-ekwu egwu egwu, ị ga-ahụ na ị ga-akwụsị ịtụ ụjọ.

    Ihe ị ga-echebara echiche: Olee ụdị onye ị ga-achọ ka ọ bụrụ enyi gị? Ọ̀ bụ onye ekwurekwu ka ọ̀ bụ onye na-ege ndị mmadụ ntị nke ọma?

  • Ihe nke abụọ nwere ike ịbụ ụjọ gị: “Ndị mmadụ ga-eche na ike m ga-agwụ ha ma mụ na ha nọrọ.”

    Nke bụ́ eziokwu: Ndị mmadụ ga na-ekwu ihe ụfọdụ gbasara gị, ma ị̀ bụ onye ihere ma ọ bụ na ị bụghị. Ị na-akpa àgwà otú i si akpa, ha ga-amata na ọ bụ otú ahụ ka i si akpa àgwà n’eziokwu, ya emezie ka ha na-eche ihe dị mma gbasara gị, gị esikwa otú ahụ mee ka ụjọ kwụsị ịtụ gị.

    Ihe ị ga-echebara echiche: Ọ bụrụ na ị na-eche na mmadụ niile na-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara gị, o nwere ike ịpụta na ọ bụ gịnwa na-eche ihe na-adịghị mma gbasara ha n’ihi na ị na-eche na ha kpọrọ gị asị.

  • Ihe nke atọ nwere ike ịbụ ụjọ gị: “Ihere ga-emegbu m ma m kwuo ihe na-adịghị mma.”

    Nke bụ́ eziokwu: Ụdị ihe a na-eme onye ọ bụla mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na i were ihe ndị i mejọrọ ka otú ị ga-esi egosi ndị ọzọ na ị bụghị onye zuru okè, ụjọ gị ga-akwụsị.

    Ihe ị ga-echebara echiche: Ọ̀ bụ na ọ naghị amasị gị iso ndị na-ekweta na ha ezughị okè anọrị?

Ị̀ ma ihe a? Ọtụtụ ndị chere na ha anaghị eme ihere n’ihi na ha na-ezigara ọtụtụ ndi ozi n’ekwentị. Ma, imete ezigbo ndị enyi na-akacha mfe ma ọ bụrụ na mmadụ na ndị ọzọ na-ekwurịta okwu ihu na ihu. Sherry Turkle, bụ́ ọkachamara n’ihe gbasara akparamàgwà na nkà na ụzụ, dere, sị: “Anyị na-amatakwu ibe anyị nke ọma ma anyị na-ahụ ibe anyị ihu na ihu ma na-anụ ka ibe anyị na-ekwu okwu.”a

Ebe nwa agbọghọ ahụ na otu di na nwunye na-ekwurịta okwu na nnọkọ ahụ.

Ị kwụsịhaala ịtụ ụjọ, i nwere ike ịchọpụta na iso ndị ọzọ akparịta ụka ihu na ihu abụghị oké ihe otú i cheburu

Ihe ị ga-eme

  • Ejila onwe gị atụnyere ndị ọzọ. Ihe a na-ekwu abụghị na ị ga-agbanwezi, bụrụ onye ekwurekwu. Kama, mkpa gị kwesịrị ịbụ ka ị kwụsịlata ime ihere nakwa ka ihere ghara igbochi gị imete ezigbo ndị enyi na ime ihe ndị ọzọ ga-atọ gị ụtọ.

    “Ọ bụghị iwu na mkparịta ụka gị na mmadụ ga-etorịrị ogologo, ọ bụghịkwa iwu na ọ bụ gị ga na-echeta ihe gị na ndị ọzọ ga na-ekwurịta mgbe niile. Naanị ihe i nwere ike ime bụ ịkọwara onye na-amabughị gị onwe gị ma ọ bụkwanụ ịjụ ya ajụjụ ole ole.”​—Alicia.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Ka onye ọ bụla na-eleru ihe ọ na-eme anya, ka o wee na-enwe ọṅụ maka ihe ọ na-eme ma ghara ịna-eji onwe ya atụnyere onye ọzọ.”​—Ndị Galeshia 6:4.

  • Na-eleru anya ala. Na-eleru ndị ọ na-amasị ha na ndị ọzọ ikwurịta okwu anya ka ị chọpụta otú ha si akparịta ụka. Gịnị ka ha na-eme? Gịnị ka ha na-anaghị eme? Olee ihe ha na-eme i nwere ike ịgba mbọ mụta ime?

    “Na-eleru ndị imete ndị enyi na-anaghị esiri ike anya, mụtakwa ihe n’aka ha. Chọpụta ihe ha na-eme na ihe ha na-ekwu mgbe mbụ ha hụrụ mmadụ.”​—Aaron.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Otú ahụ a na-eji ígwè amụcha ígwè ka mmadụ na-amụcha enyi ya.”​—Ilu 27:17.

  • Na-ajụ ajụjụ. Ọ na-amasịkarị ndị mmadụ ikwu uche ha gbasara ihe dị iche iche, n’ihi ya, ịjụ mmadụ ajụjụ bụ otú magburu onwe ya gị na ya nwere ike isi kparịtawa ụka. Ọ na-emekwa ka uche ndị gị na ha na-ekwurịta okwu ghara ịdịcha n’ebe ị nọ.

    “Ibu ụzọ kwadebe ihe ị ga-ekwu nwere ike ime ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị. I nwedịrị ike ile ma ị̀ ga-echeta ihe ole na ole unu ga-ekwu gbasara ha ma ọ bụ ajụjụ ndị i nwere ike ịjụ ndị ọzọ tupu gị agawa nnọkọ ọ bụla. Ihe a ga-eme ka obi ruo gị ala ma ị hụ ndị ị na-amabughị.”​—Alana.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma, kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.”​—Ndị Filipaị 2:4.

a Ihe a si n’akwụkwọ bụ́ Reclaiming Conversation.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Kelsey.

“Malite ime ụmụ obere ihe ma ị hụ mmadụ, dị ka ịmụmụrụ ya ọnụ ọchị na ịsị ya ‘ndeewo.’ Otú ndị mmadụ ga-esi azaghachi gị na otú ọ ga-esi eme ka obi sikwuo gị ike ịgwa ndị ọzọ ị ga-ahụ okwu ga-atụ gị n’anya.”​—Kelsey.

Robin.

“Onye ọ bụla nwere ọmarịcha ihe e ji mara ya nakwa ihe bara uru ndị ọzọ ga-amụta n’aka ya. Ndị ọzọ agaghị erite uru n’ọmarịcha àgwà ndị i nwere ma ọ bụrụ na gị na ha anaghị ekwurịta okwu mgbe ụfọdụ.”​—Robin.

Veronica.

“Ọ bụrụ na i mee ka ahụ́ ruo ndị mmadụ ala, ha ga-ahụ gị n’anya, ọ bụrụgodị na ị na-emetụ ihere. Ịna-amụmụrụ ndị ọzọ ọnụ ọchị na-abakwa uru. Ị ga-ejikwa obi gị niile mụmụọrọ ha ọnụ ọchị ma ilekwasị anya n’àgwà ọma ha nwere.”​—Veronica.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya