Ihe Anyị Ga-eme ma Ọrịa Bịa Anyị na Mberede
Ahụ́ ọ̀ malitere inye gị nsogbu mgbe ị na-atụghị anya ya? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ghọtala otú ọrịa si aghasa mmadụ uche, na-eme ka obi jọọ mmadụ njọ, ma na-eri mmadụ ego. Gịnị ga-enyere gị aka idi ya? Ọ bụrụ na ọrịa abịa onye ezinụlọ gị ma ọ bụ enyi gị, olee otú i nwere ike isi nyere ya aka idi ya? Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ na-ekwu otú e si agwọ ọrịa, ma ihe ndị o kwuru nwere ike inyere gị aka ime ihe ndị kacha mma i kwesịrị ime ma ị rịawa ọrịa.
Aro ndị ga-enyere gị aka idi ọrịa na-arịa gị
Gaa ka a gwọọ gị
Ihe Baịbụl kwuru: “Ndị ahụ́ dị anaghị achọ onye ga-agwọ ha, kama ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị na-achọ ya.”—Matiu 9:12.
Otú ị ga-esi eme ihe o kwuru: Gaa ka ndị ọkachamara n’ihe gbasara ahụ́ ike nyere gị aka mgbe i kwesịrị ime otú ahụ.
Megodị ihe a: Gakwuru ndị ga-akacha agwọ gị nke ọma. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mma ka ị gaa jụta dọkịta ọzọ ihe o chere. (Ilu 14:15) Ị gwawa ndị na-ahụ maka ahụ́ ike nsogbu gị, kwuo okwu otú ga-edo ha anya. Jide n’aka na ị ghọtara ihe ha kwuru nke ọma nakwa na ị kọwaara ha otú ihe na-eme gị si eme gị. (Ilu 15:22) Gbalịa gụọ gbasara ụdị ọrịa na-arịa gị nakwa ụzọ dị iche iche e si agwọ ya. Ọ bụrụ na ị ghọta ihe ndị i kwesịrị ịtụ anya ha, ị ga-aka akwadebe obi gị idi ha nakwa ime mkpebi gbasara otú a ga-esi elebara gị anya.
Na-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbasie gị ike
Ihe Baịbụl kwuru: ‘Mmadụ imega ahụ́ bara uru.’—1 Timoti 4:8, ihe e dere n’ala ala peeji.
Otú ị ga-esi eme ihe o kwuru: Ị ga-erite uru ma ị na-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbasie gị ike, dị ka ịna-emega ahụ́ mgbe niile.
Megodị ihe a: Gbalịa na-emega ahụ́ mgbe niile, na-eri nri ndị na-edozi ahụ́, na-ehikwa ụra nke ọma n’abalị ọ bụla. Ọ bụ eziokwu na ị na-agbanwe ihe ụfọdụ ugbu a n’ihi ọrịa ị na-arịa, ndị ọkachamara kwekọrịtara na itinye oge na ume gị n’ime ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbasie gị ike ga-abara gị uru. Gbalịakwa ka ihe ọ bụla i kpebiri ime ghara ịbụ ihe ga-eme ka ọrịa gị ka njọ ma ọ bụkwanụ mee ka ọgwụ ị na-aṅụ ghara ịrụ ọrụ nke ọma.
Gwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka
Ihe Baịbụl kwuru: “Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.”—Ilu 17:17.
Otú ị ga-esi eme ihe o kwuru: Ndị enyi gị nwere ike inyere gị aka idi nsogbu ndị na-abịara gị.
Megodị ihe a: Kọọrọ otu enyi gị ị tụkwasịrị obi otú obi dị gị n’ezoghị ọnụ. Ime otú ahụ ga-eme ka uche nghasasị ọrịa gị na-akpatara gị beleta, meekwa ka ị na-enwetụ obi ụtọ. O doro anya na ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị ga-achọ inyere gị aka n’ụzọ ndị ọzọ, ma e nwere ike ha agaghị ama ihe ha ga-eme eme. N’ihi ya, gwa ha hoo haa ihe ha nwere ike ime iji nyere gị aka. Atụkwala anya na ha ga-emere gị ihe niile, na-ekelekwa ha maka ihe ọ bụla ha meere gị. Ma, ekwela ka ọbịbịa a ha na-abịa maka na ha buuru gị ihe ọma n’obi mebiere gị ihe. N’ihi ya, i kwesịrị ịkpara ihe ụfọdụ ókè, dị ka ugboro ole ha ga na-abịa ma ọ bụ mgbe ha ga-anọru ma ha bịa.
Na-enwe obi ike
Ihe Baịbụl kwuru: “Obi ụtọ bụ ezigbo ọgwụ nke na-agwọ mmadụ ọrịa, ma obi ọjọọ na-eme ka ike na-agwụ mmadụ.”—Ilu 17:22.
Otú ị ga-esi eme ihe o kwuru: Ọ bụrụ na obi ana-esi gị ike, gị ana-enwekwa olileanya na ihe ga-aka mma, obi ga-eru gị ala, gị enwee ike idi nsogbu ọrịa gị na-akpatara gị.
Megodị ihe a: Ka ị na-agbalị ka otú ihe si kwụrụ mara gị ahụ́, lekwasị anya n’ihe ndị ị ga-emeli, ọ bụghị n’ihe ndị ị na-agaghị emeli. Ejila onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ ma ọ bụ were otú ahụ́ gị dịbu na-atụnyere otú ọ dị ugbu a. (Ndị Galeshia 6:4) Kpebie ihe ndị ị ga-emeli, mana ka ha bụrụkwa ihe ndị ị ga-emeli n’eziokwu. Ime otú ahụ ga-eme ka i nwee ihe ndị na-eme obi ụtọ ị ga na-atụ anya ha. (Ilu 24:10) Na-emere ndị ọzọ ihe otú ọnọdụ gị kwere. Obi ụtọ a na-enweta n’inye ihe nwere ike ime ka obi ghara ịna-ajọ gị njọ mgbe niile.—Ọrụ Ndịozi 20:35.
Chineke ọ̀ ga-enyere gị aka idi nsogbu ọrịa ị na-arịa na-akpatara gị?
Baịbụl gosiri na Jehova Chinekea nwere ike inyere mmadụ aka idi nsogbu ọrịa ọ na-arịa na-akpatara ya. Ọ bụ eziokwu na anyị anaghị atụ anya ka ọ rụọ ọrụ ebube gwọọ anyị, ma Chineke nwere ike isi n’ụzọ ndị a nyere ndị na-efe ya aka:
Udo. Jehova nwere ike ime ka ha nwee “udo Chineke na-enye, nke karịrị nghọta mmadụ.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Udo a, ma ọ bụ ụdị obi iru ala a, nwere ike inyere mmadụ aka ka ọ ghara ịna-echegbu onwe ya gafee ókè. Ọ bụrụ na mmadụ ekpee ekpere kọọrọ Chineke ihe na-echegbu ya, Chineke ga-eme ka o nwee udo a.—1 Pita 5:7.
Amamihe. Jehova nwere ike inye ha amamihe ha ga-eji na-eme mkpebi dị mma. (Jems 1:5) Mmadụ na-enweta amamihe a ma ọ na-amụ Baịbụl ma na-eme ihe ndị ọ na-amụta na ya, bụ́ ndị na-aba uru mgbe niile.
Olileanya na-eme obi ụtọ nke ga-emezu n’ọdịnihu. Jehova kwere nkwa na n’ọdịnihu, “o nweghị onye bi n’ala a ga-asị: “Ahụ́ adịghị m.” (Aịzaya 33:24) Olileanya a na-enyere ọtụtụ ndị aka ịna-enwe obi ike n’agbanyeghị na ha na-arịa ọrịa na-akpa ha aka ọjọọ.—Jeremaya 29:11, 12.
a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.—Abụ Ọma 83:18.