fcafotodigital/E+ via Getty Images
Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Mmadụ Izere Ihe Ọ Bụla Si n’Anụmanụ ma Na-eri Naanị Mkpụrụ Osisi?
N’ụwa niile, ọtụtụ ndị na-agbazi mbọ izere ihe ọ bụla si n’anụmanụ, na-erizi naanị mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri.
Òtù a na-akpọ The Vegan Society kwuru, sị: ‘Ụfọdụ na-agbasi mbọ ike ka ha ghara imerụ ụmụ anụmanụ ahụ́. Ndị na-ebi ụdị ndụ a anaghị eri anụmanụ, ha anaghịkwa eji ihe si na ha eme uwe, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ.’
Ihe mere ụfọdụ ji ebi ụdị ndụ a abụghị naanị na ha chọrọ ichebe ụmụ anụmanụ, kama, ha chọrọ ime ka ahụ́ sikwuo ha ike ma ọ bụ ka ha chebe gburugburu ha ma ọ bụkwanụ n’ihi okpukpe ha.
Akwụkwọ Britannica Academic kwuru, sị: ‘Ibi ụdị ndụ a na mmadụ ịsọ ihe ụfọdụ abụghị otu n’ihi na ndị mmadụ na-ele ibi ụdị ndụ a anya ka ihe mmadụ kweere, ihe ndị o kpebiri ịna-eme, nakwa otú mmadụ ga-esi gbanwee ụwa ka ọ ka mma.’
Ma, mmadụ izere ihe ọ bụla si n’anụmanụ ma na-eri naanị mkpụrụ osisi ọ̀ bụ ya ga-eme ka nsogbu ụwa bie? Gịnị ka Baịbụl kwuru?
Otú Onye kere anyị si ele ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ anya
Baịbụl gosiri na Jehova Chineke,a Onye kere ihe niile, weere ya na ụmụ mmadụ ka ụmụ anụmanụ, gosikwa na o nyere ụmụ mmadụ ikike ịna-elekọta ụmụ anụmanụ. (Jenesis 1:27, 28) Chineke mechara kwe ka ụmụ mmadụ na-eri ụmụ anụmanụ. (Jenesis 9:3) Ma, ọ chọghị ka a na-ata ụmụ anụmanụ ahụhụ na nkịtị.—Ilu 12:10.
Baịbụl kwuru na ọ bụ onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga na-eri anụ ma ọ bụ na ọ gaghị eri.b Ihe ọ bụla anyị kpebiri n’okwu a agaghị eme ka anyị ka ndị ọzọ bụrụ ezigbo mmadụ n’anya Chineke. (1 Ndị Kọrịnt 8:8) E nweghị onye kwesịrị ịkatọ ihe onye ọzọ kpebiri iri.—Ndị Rom 14:3.
Ihe ga-eme ka ihe dị mma n’ọdịnihu
Baịbụl gosiri na otú anyị kpebiri isi bie ndụ agaghị eme ka nsogbu ụwa kwụsị. Ihe na-akpata ọtụtụ nsogbu n’ụwa a bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọkwá ndị mmadụ nọ na ya, na azụmahịa. Mmadụ ọ bụla agaghịkwanụ akwụsịli nosgbu ndị a. Baịbụl kwuru, sị:
“A gaghị edozili ihe gbagọrọ agbagọ.”—Ekliziastis 1:15.
Onye kere anyị ga-eme ka nsogbu niile na-abịara anyị taa kwụsị. Baịbụl ji okwu ụfọdụ nwere ihe ha pụtara kọwaa ihe Chineke ga-eme.
“Ahụkwara m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, n’ihi na eluigwe mbụ na ụwa mbụ alaala n’iyi, oké osimiri adịghịkwa.”—Mkpughe 21:1.
Chineke ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ, ya bụ, “eluigwe mbụ,” ma were “eluigwe ọhụrụ,” ya bụ, Alaeze ya nke ga-esi n’eluigwe na-achị, dochie ya. Alaeze ya ga-ewepụ “ụwa mbụ,” ya bụ, ndị ajọ omume ma chịwa “ụwa ọhụrụ,” ya bụ, ndị ji obi ha niile kweta ịna-erubere Chineke isi.
Ọ bụ naanị n’Alaeze Chineke ka ụmụ mmadụ ga-amụta otú ha na ụmụ anụmanụ ga-esi na-ebi n’udo, na-elekotakwa ụwa nke ọma.—Aịzaya 11:6-9.
a Jehova bụ aha Chineke.—Abụ Ọma 83:18.
b E nyere anyị iwu na Baịbụl ka anyị “ghara iri ọbara.” (Ọrụ Ndịozi 15:28, 29) Ọ pụtara na anyị ekwesịghị ịṅụ ọbara ma ọ bụ rie anụ a na-egbupụghị ọbara. Anyị ekwesịghịkwa iri nri e tinyere ọbara.