Mary_Ukraine/stock.adobe.com
NA-ECHENỤ NCHE!
Ndị Mmadụ Anaghịzi Atụkwasị Ndị Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Obi—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
N’Afọ 2024, ntụliaka a ga-eme n’ụwa niile ga-akarị ole e metụrụla n’afọ ọ bụla ọzọ. Ma, ọtụtụ ndị anaghịzi atụkwasị ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị obi.
N’abalị iri na itoolu n’ọnwa Septemba afọ 2023, ụlọ ọrụ a na-akpọ Pew Research Center kwuru na ọtụtụ ndị a gbara ajụjụ ọnụ n’Amerịka kwuru na “ihe bụ́ mkpa ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ ihe ha ga-erite n’ọchịchị,” ọ bụghị ihe ha ga-emere ndị ha na-achị.a
Ọtụtụ ndị na-eto eto atụkwasịghịkwa ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị obi.
N’abalị iri abụọ na itoolu n’ọnwa Jenụwarị afọ 2024, akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times dere, sị: “Ihe bụ́ mkpa ndị nọ n’afọ iri na ụma ugbu a bụ otú a ga-esi akwụsị ezigbo nsogbu dị iche iche ndị mmadụ na-enwe, ma a gbaa ha ajụjụ ọnụ, ha na-ekwu na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị anaghị eme ihe ọ bụla iji kwụsị nsogbu ndị ahụ.”
N’abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 2024, akwụkwọ akụkọ bụ́ The Korea Times dere, sị: “A chọpụtala na ndị na-eto eto anaghịzi atụkwasị ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị obi, ndị ha na-atụkwasịzi obi karịa ha bụ ndị ọrụ ha bụ itinye vidio dị iche iche n’Ịntanet iji nweta ọtụtụ ndị ga na-eso ha.”
Ànyị ga-atụkwasịli ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị obi na ha ga-eme ka ihe ka mma n’ọdịnihu? Ònye ka anyị kwesịrị ịtụkwasị obi?
Leruo anya tupu gị atụkwasị mmadụ obi
Onye ọ bụla kwesịrị ileru anya iji mara onye ọ ga-atụkwasị obi. Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-amaghị ihe na-ekweta ihe niile e kwuru, ma onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.”—Ilu 14:15.
Ị chọọ ịhụ aro ndị ga-enyere gị aka ịmata akụkọ ndị bụ́ eziokwu na ndị na-abụghị, gụọ isiokwu bụ́ “Ekwela Ka E Jiri Akụkọ Ụgha Duhie Gị.”
Ihe ọzọ bụ na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị nke kacha ibe ha ekwu eziokwu, ndị chọkwara ime ihe dị mma anaghị emeli ihe niile ha chọrọ ime. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị:
“Unu atụkwasịla ndị isi obi, unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye na-enweghị ike ịzọpụta mmadụ.”—Abụ Ọma 146:3.
E nwere onye ndú ị ga-atụkwasịli obi
Baịbụl kwuru na Chineke ahọpụtala onye ruru eru e nwere ike ịtụkwasị obi ka ọ bụrụ onye ndú anyị, ya bụ, Jizọs Kraịst. (Luk 1:32, 33) Jizọs bụ Eze nke Alaeze Chineke, bụ́ ọchịchị si n’eluigwe na-achị.—Matiu 6:10.
Chọpụta ihe mere i ji kwesị ịtụkwasị Jizọs obi nakwa ihe ọ ga-eme ka nsogbu ndị anyị na ha na-alụ kwụsị. Gụọ isiokwu ndị a: “Ònye Bụ Eze nke Alaeze Chineke?” nakwa “Olee Ihe Ndị Alaeze Chineke Ga-eme?”
a Ụlọ ọrụ Pew Research Center kwuru ihe a na Septemba 2023, n’isiokwu bụ́ “Americans’ Dismal Views of the Nation’s Politics.”