Foto si n’aka NASA
NA-ECHENỤ NCHE!
È Nwere Ọchịchị Ga-akwụsi Ike Ga-achị Ụwa Anyị A?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
Ọchịchị dị iche iche n’ụwa na-enwe ọtụtụ nsogbu. Akụkọ ọjọọ a na-agbasa gbasara ndị ọchịchị, ọgba aghara ntụliaka na-akpata, ndị kwe na ndị ekweghị dị n’ọchịchị, na ngagharị iwe ndị mmadụ na-eme na-akpa ọchịchị mba dị iche iche aka ọjọọ, ma mba ndị ọchịchị ha yiri ka hà bụ a kwaa a kwụrụ.
Baịbụl kwuru na e nwere otu ọchịchị siri ezigbo ike. Ọ ga-abụ na ị nụtụla gbasara ọchịchị ahụ. Ọ bụ ya ka Jizọs Kraịst kwuru okwu ya n’ekpere ahụ o ji kụziere anyị otú e si ekpe ekpere.
“Kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka Alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’”—Matiu 6:9, 10.
Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara Alaeze ahụ?
Alaeze ahụ bụ ọchịchị ga-akwụsi ike
Alaeze ahụ si n’eluigwe na-achị.
Jizọs kpọrọ ọchịchị ahụ “Alaeze eluigwe.” (Matiu 4:17; 5:3, 10, 19, 20) Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.”—Jọn 18:36.
Alaeze ahụ ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ.
Baịbụl kwuru, sị: “Alaeze ahụ ga-egwepịa alaeze [ma ọ bụ ọchịchị ụmụ mmadụ] ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma naanị ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.
A gaghị ebibi Alaeze a Jizọs Kraịst ga-abụ eze ya ebibi.
Baịbụl kwuru, sị: “Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị akwụsị akwụsị. A gaghịkwa ebibi alaeze ya ebibi.”—Daniel 7:13, 14.
Alaeze a ga-eme ka udo dịrị n’ụwa, meekwa ka obi ruo mmadụ niile ala.
Baịbụl kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-ebikwa n’udo, n’etiti ubi vine na n’okpuru osisi fig ya. Ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji ọzọ.”—Maịka 4:4, Bible Nsọ Ọhụụ.
Mụtakwuo gbasara Alaeze ahụ
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o ji oge ya ‘kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke.’ (Matiu 9:35) O bukwara amụma, sị:
‘A ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà, mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.’—Matiu 24:14.
Taa, a na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ihe karịrị mba narị abụọ na iri anọ (240). Anyị na-agba gị ume ka ị mụkwuo gbasara ọchịchị a nakwa uru ọ ga-abara gị.
Biko, lee vidio bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke?