NA-ECHENỤ NCHE!
Otú Ị Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ n’Oge Nsogbu—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
N’Oge a nsogbu juru ebe niile, e nweghị ihe anyị ga-emeli gbasara ọtụtụ ihe na-eme ná ndụ anyị. Ma, ihe na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ abụghị otú ihe si dịrị anyị, kama ọ bụ otú anyị si ele ihe anya. Baịbụl kwuru na “onye obi na-adị mma na-enwe obi ụtọ mgbe niile” n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara ya. (Ilu 15:15) Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị na-enwekwu obi ụtọ? Chọpụta otú ihe ndị Baịbụl kwuru nwere ike isi nyere gị aka.
Gbaa mbọ ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị
Baịbụl kwuru, sị: “Nchegbu na-eme ka ike gwụ mmadụ, ma okwu ọma na-eme ka obi dị ya ụtọ.”—Ilu 12:25.
Baịbụl nwere ike inyere gị aka ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị. Ị chọọ ịmata otú ọ ga-esi nyere gị aka, gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Nchegbu.”
Gbaa mbọ ka owu ghara ịna-ama gị
Baịbụl kwuru, sị: “Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.”—Ilu 17:17.
Baịbụl kwuru otú ị ga-esi mete ezigbo ndị enyi, ma si otú ahụ mee ka owu ghara ịna-ama gị. Gụọ isiokwu bụ́ “Na-emete Ndị Ọzọ Enyị Ka Owu Kwụsị Ịna-ama Gị—Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere Gị Aka.”
Gbaa mbọ ka ị mụta ịna-ahụkwu Chineke na ndị ọzọ n’anya
Baịbụl kwuru, sị: “Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi gị niile na uche gị niile hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya. . . . Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.”a—Matiu 22:37-39.
Ekpere ga-enyeliri anyị aka ka anyị hụkwuo Chineke n’anya. Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya, gụọ isiokwu bụ́ “Chineke Ọ̀ Na-Anụ Ekpere Anyị?”
Otú anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya bụ ịna-emeso ha otú Jizọs kwuru ka anyị si na-emeso ha. Matakwuo gbasara ihe a n’isiokwu bụ́ “Olee Otú Jizọs Kwuru Ka Anyị Si Na-emeso Ndị Ọzọ?”
Ị̀ ga-achọ ịmatakwu otú Baịbụl nwere ike isi nyere gị aka ịna-enwe obi ụtọ n’oge a nsogbu na-ezo ka mmiri? Ọ bụrụ na ị ga-achọ, gwa anyị ka anyị na gị mụwa Baịbụl n’anaghị gị ego.
a Jehova bụ aha Chineke.—Abụ Ọma 83:18.